< Joshua 19 >

1 Ndị nke abụọ sitere nʼife nza nweta oke ha bụ ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha ketara dị nʼime ala e kenyere ndị Juda.
Drugi ždrijeb izađe za Šimuna, za pleme sinova Šimunovih po porodicama njihovim: njihova je baština bila usred sinova Judinih.
2 Ihe nketa ụmụ Simiọn bụ ndị a: Bịasheba (maọbụ Sheba), Molada,
Dodijeljena im je kao baština: Beer Šeba, Šeba, Molada;
3 Haza Shual, Bala, Ezem,
Hasar Šual, Bala, Esem;
4 Eltolad, Betul, Homa,
Eltolad, Betul, Horma,
5 Ziklag, Bet-Makabot, Haza Susa,
Siklag, Bet-Hamarkabot, Hasar Susa,
6 Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu.
Bet-Lebaot i Šaruhen: trinaest gradova i njihova sela.
7 Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha,
Ajin, Rimon, Eter i Ašan: četiri grada s njihovim selima.
8 tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). Nke a bụ ihe nketa ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị.
I sva naselja što su oko tih gradova, do Baalat Beera, Ramat Negeba. To je baština plemena sinova Šimunovih po porodicama njihovim.
9 E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.
Baština je sinova Šimunovih bila od dijela sinova Judinih, jer dio dodijeljen sinovima Judinim bijaše za njih prevelik. Zato su sinovi Šimunovi dobili svoju baštinu usred njihova područja.
10 Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid.
Treći ždrijeb izađe za sinove Zebulunove po porodicama njihovim: njihovo je područje sezalo do Sarida,
11 Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam.
odakle im se međa na zapadu penjala do Marale, doticala Dabešet i dopirala do potoka koji je nasuprot Jokneamu.
12 O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia.
Od Sarida je međa okretala prema istoku, sve do međe Kislot Tabora, odakle je izlazila do Dabrata i uspinjala se do Jafije.
13 Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea.
A odatle je išla opet prema istoku, na Git Hefer i na Ita Kasin, izlazila na Rimon i vraćala se do Nee.
14 Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.
Onda je okretala sa sjevera oko Hanatona i završavala se u dolini Jiftah-Elu.
15 Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem. Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
Pa Katat, Nahalal, Šimron, Jidalu i Betlehem: dvanaest gradova s njihovim selima.
16 Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.
To je bila baština sinova Zebulunovih po porodicama njihovim: ti gradovi s njihovim selima.
17 Ebo nke anọ sitere nʼife nza nweta ihe nketa ha bụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị.
Četvrti je ždrijeb izašao za Jisakara, za sinove Jisakarove po njihovim porodicama.
18 Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Jezril, Kesulọt, Shunem,
A posjed im je bio: Jizreel, Hakesulot, Šunem;
19 Hafaraim, na Shịọn, Anaharat,
Hafarajim, Šion, Anaharat;
20 Rabit, Kishiọn, Ebez na
Harabit, Kišjon, Ebes;
21 Remet, En-Ganim, En-Hada na Bet-Pazez.
Remet i En-Ganim, En-Hada i Bet-Pases.
22 Oke ala ha ruru na Taboa, Shahazuma na Bet-Shemesh, ma kwụsị nʼosimiri Jọdan. Obodo ndị a niile dị iri na isii, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
Potom međa dotiče Tabor, Šahasimu i Bet-Šemeš i izlazi na Jordan: šesnaest gradova s njihovim selima.
23 Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị.
To je baština plemena sinova Jisakarovih po porodicama njihovim: ti gradovi s njihovim selima.
24 Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị.
Peti ždrijeb iziđe za pleme sinova Ašerovih po njihovim porodicama.
25 Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Helkat, Hali, Beten, Akshaf,
Njihova je zemlja bila: Helkat, Hali, Beten, Akšaf,
26 Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat.
Alamelek, Amad, Mišal. Na zapadu je međa doticala Karmel i Šihor Libnat.
27 O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe.
Zatim je okretala prema sunčanom istoku do Bet-Dagona i doticala se Zebuluna i doline Jiftahela sa sjevera; protezala se dalje Bet-Haemekom i Neielom i dosezala slijeva Kabul,
28 Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.
pa Abdon, Rehob, Hamon i Kanu sve do Velikog Sidona.
29 Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib
Međa je tada zavijala prema Rami i do tvrdoga grada Tira te je okretala prema Hosi i izlazila na more. Obuhvaćala je Mehaleb, Akzib,
30 na Umma, Afek na Rehob. Ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri abụọ na abụọ tinyere obodo nta ha niile.
Ako, Afek i Rehob: dvadeset i dva grada s njihovim selima.
31 Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị.
To je baština plemena sinova Ašerovih po porodicama njihovim: ti gradovi i njihova sela.
32 Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.
Šesti ždrijeb izađe za sinove Naftalijeve po njihovim porodicama.
33 Oke ala ha malitere na Helef ruo nʼosisi ukwu dị na Zaananim, Adami Nekeb na Jabneel, gafee ruo Lakum, kwụsị nʼosimiri Jọdan.
Njihova međa ide od Helefa i od Hrasta u Saananimu, od Adami Hanekeba i Jabneela do Lakuma i izbija na Jordan.
34 Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.
Potom međa okreće na zapad k Aznot Taboru i pruža se odande prema Hukoku; na jugu se dotiče Zebuluna, na zapadu Ašera, na istoku Jordana.
35 Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret,
Utvrđeni gradovi bijahu Hasidim, Ser, Hamat, Rakat, Kineret;
36 Adama, Rema, Hazọ,
Adama, Rama, Hasor,
37 Kedesh, Edrei, En-Hazoa,
Kedeš, Edrej, En-Hasor;
38 Iron, Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh. Ya mere, ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri na itoolu, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
Jiron, Migdal-El, Horem, Bet-Anat, Bet-Šemeš: devetnaest gradova s njihovim selima.
39 Obodo ndị a na obodo nta ha niile ka ebo Naftalị dịka ikwu ha si dị, nwetara dịka ihe nketa ha.
To je baština plemena Naftalijevih sinova po porodicama njihovim: ti gradovi i njihova sela.
40 Site nʼife nza ebo Dan, bụ ebo nke asaa nwetara ihe nketa dịka ikwu ha si dị.
Izađe sedmi ždrijeb za pleme sinova Danovih po porodicama njihovim.
41 Oke ala ihe nketa ha bụ ndị a: Zora, Eshtaol, Ia-Shemesh,
Područje baštine njihove bilo je: Sora, Eštaol, Ir Šemeš,
42 Shaalabin, Aijalon, Itla,
Šaalabin, Ajalon, Jitla,
43 Elọn, Timna, Ekrọn,
Elon, Timna, Ekron,
44 Elteke, Gibeton, Baalat,
Elteke, Gibeton, Baalat,
45 Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn,
Jehud, Bene-Berak, Gat-Rimon,
46 Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa.
Me-Hajarkon i Harakon s područjem prema Jafi.
47 Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie.
Ali područje sinova Danovih bilo je za njih pretijesno; zato udare Danovi sinovi na Lešem, osvoje ga i sve pobiju oštricom mača; zaposjednu grad, nastane se u njemu i Lešem prozovu Dan, po imenu Dana, oca svoga.
48 Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị.
To je baština plemena sinova Danovih po porodicama njihovim: ti im gradovi i sela njihova.
49 Mgbe e kechara ala ahụ niile, nye ebo ọbụla ala dịka ọnụọgụgụ ha niile si dị, ụmụ Izrel nyere Joshua, nwa Nun ihe nketa ha nʼetiti ha.
Kada završe diobu zemlje ždrijebom i utvrde njezine međe, dadu Izraelci Jošui, sinu Nunovu, baštinu u svojoj sredini.
50 Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na Joshua nwere ike iwere ala ọbụla ọ chọrọ. Ya mere, ha nyere Joshua obodo Timnat Sera nke dị nʼugwu Ifrem. Joshua wugharịrị obodo ahụ biri nʼime ya.
Po zapovijedi Jahvinoj dali su mu grad koji je sebi želio: Timnat-Serah u Efrajimovoj gori; on utvrdi taj grad i nastani se u njemu.
51 Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.
To su baštine koje su svećenik Eleazar i Jošua, sin Nunov, i glavari izraelskih plemena podijelili ždrijebom među plemena izraelska u Šilu, pred Jahvom, na vratima Šatora sastanka. Tako je zavšena razdioba zemlje.

< Joshua 19 >