< Joshua 18 >

1 Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel,
Toute la communauté des enfants d’Israël s’assembla à Silo et y installa la Tente d’assignation; le pays était conquis et à leur disposition.
2 ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa.
Mais il restait, parmi les enfants d’Israël, sept tribus à qui on n’avait pas encore départi leur patrimoine.
3 Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?
Josué dit à ces Israélites: "Combien de temps encore négligerez-vous de prendre possession du pays que vous a donné l’Eternel, le Dieu de vos pères?
4 Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.
Désignez vous-mêmes trois hommes par tribu, afin que je leur donne mission de parcourir le pays et d’en faire le plan selon les possessions à attribuer; après quoi, ils viendront me trouver.
5 Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu.
Ils le diviseront en sept parts, Juda devant conserver sa frontière au midi, et la maison de Joseph devant garder la sienne au nord.
6 Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ.
Vous ferez donc délimiter le pays en sept parts et m’apporterez le plan ici, où je les tirerai pour vous au sort devant l’Eternel, notre Dieu.
7 Ma ndị Livayị agaghị eketa ala ọbụla nʼetiti unu, nʼihi na ihe nketa ha bụ ọrụ nchụaja ha na-arụ nʼihu Onyenwe anyị. Ebo Gad, na Ruben, na ọkara ebo Manase agaghị enwetakwa oke ọzọ, nʼihi na ha anarala ihe nketa nke ha nʼofe Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe Mosis onyeozi Onyenwe anyị kwere ha na nkwa na ha ga-ebi.”
Car, pour ce qui est des Lévites, ils n’ont point de part au milieu de vous, le ministère de l’Eternel étant leur apanage; quant à Gad, à Ruben et à la demi-tribu de Manassé, ils ont reçu leur patrimoine sur la rive orientale du Jourdain, telle que Moïse, serviteur de l’Eternel, le leur a attribué."
8 Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta Onyenwe anyị ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.”
Les délégués se disposant à partir pour lever le plan du pays, Josué leur donna cet ordre: "Allez, parcourez le pays, faites-en le plan et revenez auprès de moi, afin qu’ici, à Silo, je vous le répartisse au sort, en présence de l’Eternel."
9 Ndị ikom ahụ gabigara ala ahụ, depụta ya nʼakwụkwọ, nʼobodo nʼobodo dịka o si dị nʼoke asaa. Mgbe ha mesịrị nke a, ha lọghachikwutere Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu nʼime Shaịlo.
Les hommes partirent, traversèrent le pays, en dressèrent le plan par villes, en sept parties, sur un registre, et vinrent trouver Josué au camp, à Silo.
10 Joshua feere ha nza na Shaịlo nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ ka ọ nọ keere ndị Izrel ala ahụ dịka ebo ha si dị.
Et Josué jeta le sort à Silo, devant l’Eternel, et il y répartit le pays entre les enfants d’Israël, selon leurs groupements.
11 Ndị mbụ e kenyere ala site nʼife nza bụ ebo Benjamin dịka ikwu ha si dị. Ala niile e kenyere ebo Benjamin bụ nke dị nʼetiti ala e nyere ebo Juda na Josef.
Le premier lot échut à la tribu des enfants de Benjamin, selon leurs familles; les confins que leur attribua le sort se trouvaient entre les enfants de Juda et ceux de Joseph.
12 Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven.
Leur limite, du côté du nord, partait du Jourdain, montait au côté nord de Jéricho, passait à l’ouest de la montagne, et aboutissait au désert de Beth-Avén.
13 Oke ala ahụ sitekwara nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ Luz (ebe a na-akpọkwa Betel), ruokwa Atarọt-Ada, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu dị na mgbada Bet-Horon.
De là, elle gagnait le côté méridional de Louz, nommée aussi Béthel, et descendait vers Atrot-Addar, sur la montagne qui est au sud de Bethorôn-le-Bas.
14 Site nʼugwu ahụ chere Bet-Horon ihu nʼakụkụ ndịda, oke ala ahụ gbadara ndịda gbasoro akụkụ ọdịda anyanwụ pụta na Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim, otu nʼime obodo ndị Juda. Nke a bụ oke ala ahụ nʼọdịda anyanwụ.
Puis elle s’infléchissait et tournait du côté de l’ouest, au midi de la montagne qui fait face à Bethorôn, et se terminait à Kiryath-Baal ou Kiryath-Yearîm, ville de la tribu de Juda: voilà pour le côté occidental.
15 Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa.
Le côté du midi partait de l’extrémité de Kiryath-Yearîm, et continuait dans la direction de la mer et atteignait la source de Mê-Nephtoah;
16 O sitekwara nʼebe ahụ gbada ruo na ndịda ugwu ahụ nke chere ihu na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nʼakụkụ ugwu Ndagwurugwu nke Refaim. O sitekwara nʼebe ahụ gafee ruokwa nʼakụkụ ndịda ugwu obodo ndị Jebus, ruo En-Rogel.
puis la limite descendait à l’extrémité de la montagne faisant face à la vallée de Ben Hinnom, qui est au côté nord de la vallée des Rephaïm; suivait la vallée de Hinnom jusqu’au côté sud de Jébus et atteignait En-Roghel;
17 Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben.
tournait au nord vers En-Chémech, de là vers Gheliloth, en face de la montée d’Adoummim, et descendait vers la Pierre de Bohân-ben-Ruben;
18 O sitere nʼebe ahụ gafee nʼakụkụ ugwu Bet-Araba gbadata rute nʼAraba,
se poursuivait vers le côté nord de la Plaine, et atteignait Araba;
19 ọ gafere gbatịrị ruo nʼakụkụ Bet-Hogla na mgbago ugwu, pụta nʼakụkụ ugwu nke osimiri Nnu, nke bụ nʼakụkụ ndịda ọnụ mmiri osimiri Jọdan. Nke a bụ oke ala ha nʼakụkụ ndịda.
de là, elle passait au côté nord de Beth-Hogla, et aboutissait à la pointe nord de la mer Salée, à l’extrémité sud du Jourdain: telle était la frontière méridionale.
20 Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ bụ osimiri Jọdan. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin, dịka oke ala ya niile si dị gburugburu, dị ka ikwu ya niile si dị nʼakụkụ niile.
Et le Jourdain formait la limite du côté de l’orient. Telle fut, dans tout son circuit, la possession des enfants de Benjamin selon leurs familles.
21 Ndị a bụ obodo e kenyere ebo Benjamin, dịka ikwu ha si dị: Jeriko, Bet-Hogla, Emek Keziz,
Les villes de cette tribu, réparties entre ses familles, étaient: Jéricho, Beth-Hogla, Emek-Keçis;
22 Bet-Araba, Zemaraim, Betel,
Beth-Haaraba, Cemaraïm, Béthel;
23 Avim, Para, Ofra,
Awim, Para, Ofra;
24 Kefa Amoni, Ofni, Geba, obodo iri na abụọ na obodo nta ha ndị ọzọ.
Kefar-Ammona, Ofni et Ghéba: douze villes, avec leurs bourgades.
25 Na Gibiọn, Rema, Beerọt,
Plus Gabaon, Rama, Beërot;
26 Mizpa, Kefira, Moza,
Miçpé, Kefira, Moça;
27 Rekem, Iapeel, Tarala,
Rékem, Yirpeël, Tareala;
28 Zela, Haelef na obodo ndị Jebus, nke aha ya bụ Jerusalem, Gibea na Kiriat Jearim, obodo iri na anọ na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin maka ikwu ya niile.
Cèla, Elef, Jébus, la même que Jérusalem, Ghibeath, Kiryath: quatorze villes, avec leurs bourgades. Tel fut le patrimoine des descendants de Benjamin, selon leurs familles.

< Joshua 18 >