< Joshua 17 >

1 Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha.
A tento byl los Manassesův (nebo on jest prvorozený Jozefův): Machirovi prvorozenému Manassesovu, otci Gálad, proto že byl muž bojovný, dostal se Galád a Bázan.
2 Ya mere, oke a dịịrị ndị fọdụrụ nʼebo Manase dịka ezinaụlọ ha si dị. Agbụrụ Abieza, Helek, Asriel, Shekem, Hefa na Shemida. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom agbụrụ Manase, nwa Josef, dịka ikwu ha si dị.
Dostalo se také jiným synům Manassesovým po čeledech jejich, synům Abiezer, a synům Helek, a synům Asriel, i synům Sechem, a synům Hefer, a synům Semida. (Nebo ti jsou synové Manassesovi, syna Jozefova, muži po rodech svých.
3 Ma Zelofehad, nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, amụtaghị ụmụ ndị ikom kama ọ mụtara naanị ụmụ ndị inyom, ndị aha ha bụ nke a: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza.
Ale Salfad, syn Hefer, syna Galád, syna Machir, syna Manasse, neměl synů, než dcery toliko, jejichž jsou tato jména: Mahla a Noa, Hegla, Melcha a Tersa.
4 Ndị inyom ndị a bịakwutere Elieza, onye nchụaja na Joshua nwa Nun, nʼihu ndị ndu ụmụ Izrel niile sị ha, “Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya kenye anyị ala nke anyị, dịka o si kenye ụmụ ndị ikom ikwu anyị.” Ya mere, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu, Joshua nyere ha ihe nketa ruuru ha nʼetiti ụmụnne nna ha, dịka ndị ọzọ si keta.
Kteréžto přistoupivše před Eleazara kněze, a před Jozue, syna Nun, i před knížata, řekly: Hospodin přikázal Mojžíšovi, aby nám dal dědictví u prostřed bratří našich. I dal jim Jozue podlé rozkázaní Hospodinova dědictví u prostřed bratří otce jejich.)
5 Manase chịtara ala oke iri, tinyere Gilead, na Bashan nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan,
Dostalo se provazců Manassesovi deset, krom země Galád a Bázan, kteráž byla před Jordánem.
6 nʼihi na e mere ka ndị inyom Manase keta oke nʼetiti ndị ikom ebo Manase. Ala fọdụrụ na Gilead bụ ndị ikom ebo Manase nwe ya.
Nebo dcery Manassesovy obdržely dědictví mezi syny jeho, země pak Galád přišla jiným synům Manassesovým.
7 Oke ala ebo Manase gbatịrị site nʼAsha ruo na Mikmetat, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Shekem. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ndịda site nʼebe ahụ tinyere ndị bi nʼala En-Tapụọa.
A byla meze Manassesova od Asser, Michmetat, jenž jest před Sichem, a táhne se na pravou stranu k obyvatelům Entafue.
8 Ala dị gburugburu Tapụọa bụ ala ebo Manase, ma obodo Tapụọa nʼonwe ya, nke dị nʼoke ala ebo Manase, bụ obodo ebo Ifrem.
(Manassesova zajisté byla země Tafue, ale Tafue podlé pomezí Manassesova jest synů Efraimových.)
9 Oke ala ụmụ Manase gbatịrị ga ndịda ruo na mmiri iyi Kana. Ụfọdụ obodo ndị Ifrem dị nʼebe ahụ, nʼetiti obodo ndị Manase, kama oke ala ndị Manase nʼakụkụ ugwu iyi ahụ kwụsịrị nʼosimiri Mediterenịa.
Odkudž sstupuje pomezí ku potoku Kána, na poledne tomu potoku, a tu jsou města Efraimova u prostřed měst Manassesových; pomezí pak Manassesovo jest na půlnoci toho potoka, a skonává se při moři.
10 Ala dị na ndịda bụ nke e kenyere Ifrem, ma ala mgbago ugwu bụ nke Manase. Ala ndị Manase gbatịrị ruo nʼosimiri Mediterenịa ma ha na ndị Asha nwekọrọ oke ala nʼakụkụ ugwu, ebe ha na ndị Isaka nwere oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
Na poledne jest díl Efraimův, a na půlnoci Manassesův, moře pak jest pomezí jejich; a v pokolení Asser sbíhají se na půlnoci, v pokolení pak Izachar na východ.
11 Manase ka e nyere obodo ndị a, nke dị nʼala e nyere Isaka na Asha: obodo Bet-Shan, na Ibleam, na Doa, na Endoa, na Teanak, na Megido, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo nke atọ bụ Nafọt.
Nebo dědictví Manassesovo jest mezi Izacharovým a Asserovým, Betsan i městečka jeho, a Jibleam a městečka jeho; též obyvatelé Dor a městečka jeho, a obyvatelé Endor a městečka jeho; také obyvatelé Tanach a městečka jeho, i obyvatelé Mageddo a městečka jeho; tři ty krajiny.
12 Ma ụmụ Manase enweghị ike ịchụpụ ndị Kenan bi nʼobodo ndị ahụ, nʼihi na ndị Kenan nọgidere bichie obodo ndị a.
Ale synové Manassesovi nemohli vypléniti obyvatelů těch měst; protož směleji počal Kananejský bydliti v zemi té.
13 Ma nʼikpeazụ, mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike, ha achụpụghị ndị Kenan niile bi nʼobodo ndị a kpamkpam, kama ha mere ka ha bụrụ ndị na-ejere ụmụ Izrel ozi, dịka ndị ohu ha.
Když se pak zsilili synové Izraelští, uvedli sobě Kananejské pod plat, a nevyhladili jich do konce.
14 Ma ụmụ ụmụ Josef sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na Onyenwe anyị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.”
Tedy mluvili synové Jozefovi k Jozue, řkouce: Proč jsi nám dal dědictví toliko los jeden a provazec jeden, poněvadž jsme lid mnohý; nebo až dosavad žehnal nám Hospodin.
15 Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.”
I řekl jim Jozue: Poněvadž jsi lid tak mnohý, vejdi do lesa, a vyplaň sobě tam v zemi Ferezejské a Refaimské, jestližeť jest malá hora Efraim.
16 Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.”
Jemuž odpověděli synové Jozefovi: I tak nám nepostačí ta hora; přes to vozy železné mají všickni Kananejští, kteříž bydlejí v luzích těch, i ti, kteříž jsou v Betsan a v městečkách jeho, i ti, kteříž jsou v údolí Jezreel.
17 Ma Joshua zara ụmụ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase, sị ha, “Unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị dị ike, ọ bụghị naanị otu oke ka unu ga-eketa,
I řekl Jozue domu Jozefovu, Efraimovu a Manassesovu, řka: Lid mnohý a silný jsi, nebudeš míti toliko dílu jednoho,
18 nʼihi na ala ugwu ugwu oke ọhịa ahụ bụkwa nke unu. Sụchaanụ ya, ruo na nsọtụ ya, ka ọ bụrụ nke unu. Ọ bụ ezie na ndị Kenan bi nʼime ya nwere ụgbọ agha igwe, bụrụkwa ndị sịrị ike, unu nwere ike ịchụpụ ha.”
Ale horu budeš míti. Jestližeť překáží les, tedy vysekáš jej, a obdržíš končiny její; nebo vyhladíš Kananejského, ačkoli má vozy železné a jest silný.

< Joshua 17 >