< Joshua 16 >
1 Ala e kenyere ụmụ ụmụ Josef bidoro nʼosimiri Jọdan nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jeriko gbatịrị ruo nʼọzara. O sitere na Jeriko gbagoo ala ugwu ugwu ahụ, ruokwa Betel.
योसेफको कुलको भू-भागको अंश यरीहोमा यर्दनबाट यरीहोको पानीका मुहानहरूको पूर्वतिर, मरुभूमितिर, बेथेलको पहाडी देश हुँदै यरीहोबाट माथि जान्छ ।
2 O sitekwara Betel (ya bụ Luz), gafee ruo Atarọt, ebe ndị Akai bi.
त्यसपछि यो बेथेलबाट लूजतिर, अरकीको क्षेत्रतिर गयो ।
3 Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ rute ala ndị Jaflet, ruo ala mgbada mgbada Bet-Horon. O si nʼebe ahụ ruo Gaza, tutu kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
त्यसपछि यो तल्लो बेथ-होरोनको क्षेत्रसम्मै यल्पेतीको क्षेत्रसम्म पश्चिमतिर झर्यो र गेजेरतिर गयो; यो समुद्रमा टुङ्गियो ।
4 Ụmụ Josef bụ Ifrem, na Manase nwetara ihe nketa ha.
योसेफका कुल मनश्शे र एफ्राइमले तिनीहरूका उत्तराधिकार यसरी प्राप्त गरे ।
5 Ndị a bụ ala nke ikwu dị iche iche dị nʼebo Ifrem nwetara. Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ malitere nʼAtarọt-Ada. Site nʼebe ahụ, o ruru nʼakụkụ elu elu Bet-Horon;
कुल-कुलअनुसार एफ्राइमको कुलको क्षेत्रः तिनीहरूको भागको पूर्वतिरको सिमाना अतारोत-अद्दारबाट माथिल्लो बेथ-होरोनसम्म निस्क्यो,
6 sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼosimiri Mediterenịa. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu malitere na Mikmetat, gafee nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Taanat Shaịlo, gafee ya ruo na Janoa.
र यो त्यहाँबाट सममुद्रसम्म पुग्यो । मिक्मतातबाट उत्तरतिर यो पूर्वतर्फ तानत-शीलोतिर मोडियो र यसभन्दा उता पूर्वतिर यानोह निस्क्यो ।
7 O sitere na Janoa gbadaa ruo Atarọt, na Naara, bịaruo Jeriko, gafee, kwụsị nʼosimiri Jọdan.
त्यसपछि यो यानोहबाट अतारोतिर तल झर्यो, र यरीहो पुगेर यर्दनमा अन्त भयो ।
8 Oke ala ahụ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ sitere na Tapụọa gaa ruo iyi Kana, na ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ ala ebo Ifrem ketara, dịka ikwu ha si dị.
तप्पूहबाट पश्चिमतिर कना खोलातिर समुद्रमा टुङ्गियो । यो कुल-कुलअनुसार एफ्राइमको कुलको भाग,
9 E tinyere obodo ukwu na obodo nta niile ekepụtara iche nʼihi ebo Ifrem nʼetiti ihe nketa ụmụ Manase.
मनश्शेको कुलको उत्तराधिकारभित्र एफ्राइमको कुललाई चुनिएका सहरहरूसँगै तिनीहरूका गाउँहरूसहित सबै सहर थिए ।
10 Ma ha achụpụghị ndị Kenan ndị bi na Gaza. Nʼihi nke a, ndị Kenan binyere ndị Ifrem ruo taa, ma e mere ka ha bụrụ ndị ọrụ ngo.
तिनीहरूले गेजेरमा बस्ने कनानीहरूलाई धपाएनन्, त्यसैले आजको दिनसम्म पनि एफ्राइमभित्र कनानीहरू बस्छन्, तर यी मानिसहरूलाई बेगारी काम गर्न लगाइएको थियो ।