< Joshua 15 >

1 Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a.
Boy sayısına göre Yahuda oymağına verilen bölge, güneyde Edom sınırına, en güneyde de Zin Çölü'ne kadar uzanıyordu.
2 Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu.
Güney sınırları, Lut Gölü'nün güney ucundaki körfezden başlayıp
3 Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka;
Akrep Geçidi'nin güneyine, oradan da Zin Çölü'ne geçiyor, Kadeş-Barnea'nın güneyinden Hesron'a ve Addar'a çıkıyor, oradan da Karka'ya kıvrılıyor,
4 site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.
Asmon'u aşıp Mısır Vadisi'ne uzanıyor ve Akdeniz'de son buluyordu. Güney sınırları buydu.
5 Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,
Doğu sınırı, Lut Gölü kıyısı boyunca Şeria Irmağı'nın ağzına kadar uzanıyordu. Kuzey sınırı, Şeria Irmağı'nın göl ağzındaki körfezden başlıyor,
6 gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.
Beythogla'ya ulaşıp Beytarava'nın kuzeyinden geçiyor, Ruben oğlu Bohan'ın taşına varıyordu.
7 Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.
Sınır, Akor Vadisi'nden Devir'e çıkıyor, vadinin güneyinde Adummim Yokuşu karşısındaki Gilgal'a doğru kuzeye yöneliyor, buradan Eyn-Şemeş sularına uzanarak Eyn-Rogel'e dayanıyordu.
8 Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim.
Sonra Ben-Hinnom Vadisi'nden geçerek Yevus Kenti'nin –Yeruşalim'in– güney sırtlarına çıkıyor, buradan Refaim Vadisi'nin kuzey ucunda bulunan Hinnom Vadisi'nin batısındaki dağın doruğuna yükseliyor,
9 Site nʼelu ugwu ebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị ruo na mmiri ime ala Neftoa, pụta site nʼebe ahụ ruo obodo niile dị nso ugwu Efrọn. Site nʼEfrọn, oke ala ahụ gbadara ruo Baala (nke aha ya ọzọ bụ Kiriat Jearim).
oradan da Neftoah sularının kaynağına kıvrılıyor, Efron Dağı'ndaki kentlere uzanarak Baala'ya –Kiryat-Yearim'e– dönüyordu.
10 Oke ala ahụ mere dịka ọ ga-agba Baala gburugburu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site nʼebe ahụ pụta nʼugwu Sia, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼakụkụ ugwu Jearim (ya bụ Kesalon), gbatịa ruo na ndịda Bet-Shemesh, gafee ruo nʼọdịda anyanwụ oke ala Timna.
Baala'dan batıya, Seir Dağı'na yönelen sınır, Yearim –Kesalon– Dağı'nın kuzey sırtları boyunca uzanarak Beytşemeş'e iniyor, Timna'ya varıyordu.
11 O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri.
Sonra Ekron'un kuzey sırtlarına uzanıyor, Şikeron'a doğru kıvrılarak Baala Dağı'na ulaştıktan sonra Yavneel'e çıkıyor, Akdeniz'de son buluyordu.
12 Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Ndị a bụ oke ala gbara ndị Juda gburugburu dịka ikwu ha niile si dị.
Batı sınırı Akdeniz'in kıyılarıydı. Yahudaoğulları'ndan gelen boyların çepeçevre sınırları buydu.
13 Dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak.
Yeşu, RAB'den aldığı buyruk uyarınca, Yahuda bölgesindeki Kiryat-Arba'yı –Hevron'u– Yefunne oğlu Kalev'e miras olarak verdi. Arba, Anaklılar'ın atasıydı.
14 Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha.
Kalev, Anak'ın üç torununu, onun soyundan gelen Şeşay, Ahiman ve Talmay'ı oradan sürdü.
15 O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ.
Oradan eski adı Kiryat-Sefer olan Devir Kenti halkının üzerine yürüdü.
16 Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa, bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
Kalev, “Kiryat-Sefer halkını yenip orayı ele geçirene kızım Aksa'yı eş olarak vereceğim” dedi.
17 Ya mere, Otniel, nwa Kenaz, nwa nwanne Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
Kenti Kalev'in kardeşi Kenaz'ın oğlu Otniel ele geçirdi. Bunun üzerine Kalev kızı Aksa'yı ona eş olarak verdi.
18 Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
Kız Otniel'in yanına varınca, onu babasından bir tarla istemeye zorladı. Kalev, eşeğinden inen kızına, “Bir isteğin mi var?” diye sordu.
19 Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
Kız, “Bana bir armağan ver” dedi, “Madem Negev'deki toprakları bana verdin, su kaynaklarını da ver.” Böylece Kalev yukarı ve aşağı su kaynaklarını ona verdi.
20 Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị.
Boy sayısına göre Yahudaoğulları oymağının payı buydu.
21 Obodo niile nke ndị ebo Juda dị na Negev, nʼakụkụ ndịda nʼoke ala Edọm bụ ndị a: Kabzeel, Eda, Jaguo,
Yahudaoğulları oymağının Edom sınırlarına doğru en güneyde kalan kentleri şunlardı: Kavseel, Eder, Yagur,
22 Kina, Dimona, Adada,
Kina, Dimona, Adada,
23 Kedesh, Hazọ, Itnan,
Kedeş, Hasor, Yitnan,
24 Zif, Telem, Bealot,
Zif, Telem, Bealot,
25 Hazọ Hadata, Keriọt Hezrọn (ya bụ Hazoa),
Hasor-Hadatta, Keriyot-Hesron –Hasor–
26 Amam, Shema, na Molada,
Amam, Şema, Molada,
27 Haza Gada, Heshmọn, Bet-Pelet,
Hasar-Gadda, Heşmon, Beytpelet,
28 Haza Shual, Bịasheba, Biziotịa,
Hasar-Şual, Beer-Şeva, Bizyotya,
29 Baala, Iyim, Ezem,
Baala, İyim, Esem,
30 Eltolad, Kesil, Homa,
Eltolat, Kesil, Horma,
31 Ziklag, Madmanna, Sansanna,
Ziklak, Madmanna, Sansanna,
32 Lebaot, Shilhim, Ain na Rimọn. Ọnụọgụgụ obodo ndị a dị iri abụọ na itoolu. Obodo nta ndị ọzọ gbara ha niile gburugburu.
Levaot, Şilhim, Ayin ve Rimmon; köyleriyle birlikte yirmi dokuz kent.
33 Obodo niile ndị a dị na ndịda ugwu ka e nyekwara ebo Juda. Obodo ndị a bụ, Eshtaol, Zora, Ashna,
Şefela'dakiler, Eştaol, Sora, Aşna,
34 Zanoa, En-Ganim, Tapụọa, Enam,
Zanoah, Eyn-Gannim, Tappuah, Enam,
35 Jamut, Adulam, Soko, Azeka,
Yarmut, Adullam, Soko, Azeka,
36 Shaaraim, Aditaịm na Gedera (maọbụ Gederotaịm). Ha niile dị obodo iri na anọ. Obodo nta ndị ọzọ gbakwara ha gburugburu.
Şaarayim, Aditayim, Gedera ve Gederotayim; köyleriyle birlikte on dört kent.
37 Ebo Juda ketara Zenan, Hadasha, Migdal Gad,
Senan, Hadaşa, Migdal-Gad,
38 Dilean, Mizpa, Jekteel,
Dilan, Mispe, Yokteel,
39 Lakish, Bozkat, Eglọn,
Lakiş, Boskat, Eglon,
40 Kabọn, Laamam, Kitlish,
Kabbon, Lahmas, Kitliş,
41 Gederọt, Bet-Dagọn, Naama na Makeda. Obodo ndị a dị iri na isii, tinyekwara obodo nta ha. Ndị Juda ketakwara:
Gederot, Beytdagon, Naama ve Makkeda; köyleriyle birlikte on altı kent.
42 Libna, Eta, Ashan
Livna, Eter, Aşan,
43 Ifta, Ashna, Nezib,
Yiftah, Aşna, Nesiv,
44 Keila, Akzib na Maresha. Ha niile dị obodo itoolu, tinyekwara obodo nta ha niile.
Keila, Akziv ve Mareşa; köyleriyle birlikte dokuz kent.
45 Ha ketakwara Ekrọn, na obodo nta ya niile.
Kasaba ve köyleriyle birlikte Ekron;
46 Ọ bụ ha nwekwa obodo niile dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Ekrọn, ndị dị nso nso Ashdọd, na obodo nta niile dị ha nso.
Ekron'un batısı, Aşdot'un çevresindeki bütün köyler;
47 Ma Ashdọd nʼonwe ya, na ụmụ obodo nta ya niile, na Gaza na obodo nta ya niile, ruo nʼiyi Ijipt, na ruo nʼoke osimiri Mediterenịa.
kasaba ve köyleriyle birlikte Aşdot; Mısır Vadisi'ne ve Akdeniz'in kıyısına kadar kasaba ve köyleriyle birlikte Gazze.
48 Ha nwetakwara ala ndị dị nʼugwu ugwu bụ, Shamia, Jatịa, Sokoh,
Dağlık bölgede Şamir, Yattir, Soko,
49 Dana, Kiriat-Sana (ya bụ Debịa),
Danna, Kiryat-Sanna –Devir–
50 Anab, Eshtemo, Anim,
Anav, Eştemo, Anim,
51 Goshen, Họlọn na Gailo, ha niile dị obodo iri na otu tinyere obodo nta ha niile.
Goşen, Holon ve Gilo; köyleriyle birlikte on bir kent.
52 Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Eshan,
Arav, Duma, Eşan,
53 Janim, Bet-Tapụọa, Afeka,
Yanum, Beyttappuah, Afeka,
54 Humta, Kiriat Aba nke bụ Hebrọn na Zior, obodo itoolu tinyere obodo nta ha niile.
Humta, Kiryat-Arba –Hevron– ve Sior; köyleriyle birlikte dokuz kent.
55 Maon, Kamel, Zif, Juta,
Maon, Karmel, Zif, Yutta,
56 Jezril, na Jokdeam, Zanoa,
Yizreel, Yokdeam, Zanoah,
57 Kain, Gibea na Timna, obodo iri tinyere obodo nta ha niile.
Kayin, Giva ve Timna; köyleriyle birlikte on kent.
58 Halhaul, Bet Zoa, Gedoa,
Halhul, Beytsur, Gedor,
59 Maarat, Bet-Anot na Eltekọn, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.
Maarat, Beytanot ve Eltekon; köyleriyle birlikte altı kent.
60 Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim na Raba, obodo abụọ tinyere obodo nta ha niile.
Kiryat-Baal –Kiryat-Yearim– ve Rabba; köyleriyle birlikte iki kent.
61 Obodo ha ndị dị nʼọzara bụ ndị a: Bet-Araba, Midin, Sekaka,
Çölde Beytarava, Middin, Sekaka,
62 Nibshan, Obodo Nnu na En-Gedi, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.
Nivşan, Tuz Kenti ve Eyn-Gedi; köyleriyle birlikte altı kent.
63 Ma ebo Juda enweghị ike ịchụpụ ndị Jebus bi nʼime Jerusalem; ruo taa ndị Jebus bi na Jerusalem, nʼetiti ụmụ Juda.
Yahudaoğulları Yeruşalim'de yaşayan Yevuslular'ı oradan çıkartamadılar. Yevuslular bugün de Yeruşalim'de Yahudaoğulları'yla birlikte yaşıyorlar.

< Joshua 15 >