< Joshua 12 >

1 Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba.
이스라엘 자손이 요단 저편 해 돋는 편 곧 아르논 골짜기에서 헤르몬 산까지의 동방 온 아라바를 점령하고 그 땅에서 쳐 죽인 왕들은 이러하니라
2 Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn. Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya.
헤스본에 거하던 아모리 사람의 왕 시혼이라 그 다스리던 땅은 아르논 골짜기 가에 있는 아로엘에서부터 골짜기 가운데 성읍과 길르앗 절반 곧 암몬 자손의 지경 얍복 강까지며
3 Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga.
또 동방 아라바 긴네롯 바다까지며 또 동방 아라바의 바다 곧 염해의 벧여시못으로 통한 길까지와 남편으로 비스가 산록까지며
4 Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei.
또 르바의 남은 족속으로서 아스다롯과 에브레이에 거하던 바산 왕 옥이라
5 Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn.
그 치리하던 땅은 헤르몬 산과 살르가와 온 바산과 및 그술 사람과 마아가 사람의 지경까지의 길르앗 절반이니 헤스본 왕 시혼의 지경에 접한 것이라
6 Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.
여호와의 종 모세와 이스라엘 자손이 그들을 치고 여호와의 종 모세가 그 땅을 르우벤 사람과 갓 사람과 므낫세 반 지파에게 기업으로 주었더라
7 Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.
여호수아와 이스라엘 자손이 요단 이편 곧 서편 레바논 골짜기의 바알갓에서부터 세일로 올라가는 곳 할락 산까지에서 쳐서 멸한 왕들은 이러하니 (그 땅을 여호수아가 이스라엘의 구별을 따라 그 지파에게 기업으로 주었으니
8 Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ndị a bụ ndị eze ahụ:
곧 산지와 평지와 아라바와 경사지와 광야와 남방 곧 헷 사람과 아모리 사람과 가나안 사람과 브리스 사람과 히위 사람과 여부스 사람의 땅이라)
9 Eze Jeriko, otu eze Ai (nke dị nso na Betel), otu
하나는 여리고 왕이요 하나는 벧엘 곁의 아이 왕이요
10 eze Jerusalem, otu eze Hebrọn, otu
하나는 예루살렘 왕이요 하나는 헤브론 왕이요 하나는 야르뭇 왕이요
11 Eze Jamut, otu eze Lakish, otu
하나는 라기스 왕이요
12 eze Eglọn, otu eze Gaza, otu
하나는 에글론 왕이요 하나는 게셀 왕이요
13 eze Debịa, otu eze Geda, otu
하나는 드빌 왕이요 하나는 게델 왕이요
14 eze Homa, otu eze Arad, otu
하나는 호르마 왕이요 하나는 아랏 왕이요
15 eze Libna, otu eze Adulam, otu
하나는 립나 왕이요 하나는 아둘람 왕이요
16 eze Makeda, otu eze Betel, otu
하나는 막게다 왕이요 하나는 벧엘 왕이요
17 eze Tapụọa, otu eze Hefa, otu
하나는 답부아 왕이요 하나는 헤벨 왕이요
18 eze Afek, otu eze Lasharọn, otu
하나는 아벡 왕이요 하나는 랏사론 왕이요
19 eze Madọn, otu eze Hazọ, otu
하나는 마돈 왕이요 하나는 하솔 왕이요
20 eze Shịmrọn Meron, otu eze Akshaf, otu
하나는 시므론 므론 왕이요 하나는 악삽 왕이요
21 eze Teanak, otu eze Megido, otu
하나는 다아낙 왕이요 하나는 므깃도 왕이요
22 eze Kedesh, otu eze Jokneam, nʼime Kamel, otu
하나는 게데스 왕이요 하나는 갈멜의 욕느암 왕이요
23 eze Doa, (nʼime obodo Naftod), otu eze Goiim, nʼime Gilgal, otu na
하나는 돌의 높은 곳의 돌 왕이요 하나는 길갈의 고임 왕이요
24 eze Tịaza, otu. Ha niile dị ndị eze iri atọ na otu.
하나는 디르사 왕이라 도합 삼십일 왕이었더라

< Joshua 12 >