< Joshua 11 >

1 Mgbe Jabin eze Hazọ nụrụ nke a, o ziri ozi zigara Jobab eze ndị Madọn, zigakwara ndị eze obodo Shịmrọn na Akshaf,
When Jabin, king of Hazor, heard about what happened, he sent a message to Jobab, king of Madon, to the kings of Shimron and Achshaph,
2 na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ,
and to the kings of the northern hill country, the Jordan Valley south of Kinnereth, the western foothills, and the foothills of Dor to the west,
3 zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa.
to the kings of the Canaanites, both east and west, the Amorites, the Hittites, the Perizzites, the Jebusites in the hill country, and the Hivites living near Mount Hermon in the land of Mizpah.
4 Ndị eze a niile kwekọrịtara chịkọtaa ndị agha ha niile nʼotu. Ndị agha ha chịkọtara dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha ji ọtụtụ ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ agha.
All their armies assembled together, a vast horde as numberless as the sand of the seashore, together with many, many horses and chariots.
5 Eze ndị a niile zukọrọ maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri Merọm, maka ibuso Izrel agha.
All these kings joined forces and set up camp beside the waters of Merom to fight against Israel.
6 Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.”
The Lord said to Joshua, “Don't be afraid because of them, for by this time tomorrow I myself will hand them all over to Israel, dead. Cripple their horses and burn their chariots.”
7 Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha.
Joshua and the Israelite army went and attacked them without warning at the waters of Merom.
8 Onyenwe anyị nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ.
The Lord handed them over to the Israelites who cut them down and chased them as far as Greater Sidon and Misrephoth Maim, and east to the valley of Mizpah, killing them until none were left.
9 Joshua na ndị agha ya mere ha ihe Onyenwe anyị kwuru na a ga-eme ha. Ha gbupụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, surekwaa ụgbọ agha ha niile nʼọkụ.
Afterwards Joshua did what the Lord had ordered: he crippled the horses and burned the chariots.
10 Mgbe ahụ, Joshua laghachiri azụ busoo Hazọ agha merie ya, were mma agha gbuo eze ya, nʼihi na Hazọ bụrịị isi obodo alaeze ahụ niile.
Then Joshua turned on Hazor. He captured it and killed its king, for Hazor was at that time the chief of all these kingdoms.
11 Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ.
Joshua had all the inhabitants killed, leaving no survivors. He set it apart and completely destroyed it—no one was left alive. Then he burned down Hazor.
12 Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile, jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
Joshua captured all these towns and killed their kings. He set them apart and completely destroyed them, as Moses the servant of the Lord had ordered.
13 Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ.
However, Israel did not burn any of the towns built on mounds, except Hazor, which Joshua did burn.
14 Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ.
The Israelites did take for themselves all the plunder and livestock from these towns. But they killed all the inhabitants, destroying them all so none were left alive.
15 Nʼihi na nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
As the Lord had instructed Moses, so Moses had instructed Joshua. Joshua did what he had been told—he did everything that the Lord had instructed Moses.
16 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel.
So Joshua conquered the whole land—the hill country, the Negev, all the land of Goshen, the western foothills, the Jordan Valley, the mountains of Israel, and the eastern foothills.
17 Nʼihi nke a, ala ndị Izrel nwere gbasara nʼụzọ niile site nʼugwu Halak, nke dị nso na Sia, ruo Baal-Gad nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, na ndịda ugwu Hemon. Joshua jidere ma gbukwaa ndị eze ndị ala ahụ niile.
This covered land from Mount Halak leading to Seir in the south, right up to Baal Gad in the north, below Mount Hermon in the valley of Lebanon. Joshua captured and killed all their kings.
18 O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha.
Joshua fought a long war with all these kings.
19 Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi.
Not a single town made peace with the Israelites except the Hivites, the inhabitants of Gibeon. All the rest were conquered in battle.
20 Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼonwe ya, mere ka ndị eze ahụ nyịchie obi ha, ka ha lụso Izrel agha, ka o si otu a laa ha nʼiyi, kpochapụkwa ha niile, na-emereghị ha amara, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
For the Lord made them stubborn, wanting to fight the Israelites so that they might be set apart and completely destroyed, wiped out without mercy, as the Lord had instructed Moses.
21 Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi.
During this time Joshua also annihilated the descendants of Anak living in the hill country of Hebron, Debir, and Anab, and all the hill country of Judah and Israel. Joshua set apart and completely destroyed their towns,
22 Ọ dịkwaghị otu onye Anak a hapụrụ ndụ nʼoke ala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, na Gat, na nʼime Ashdọd.
and there were no descendants of Anak left in the land of Israel, only some in Gaza, Gath, and Ashdod.
23 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu. O nyekwara ndị Izrel ala ahụ dịka ihe nketa ha. O kenyere ha ala ahụ dịka ebo ha si dị. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ala ahụ dara jụụ. Ibu agha adịghịkwa nʼime ya ọzọ.
So Joshua took the entire land in accordance with what the Lord had instructed Moses, giving it to Israel to own as it was divided up among the tribes. Then the land was at peace.

< Joshua 11 >