< Jona 4 >

1 Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ.
Kodwa uJona wacaphuka kakhulu wazonda.
2 Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị.
Wakhuleka kuThixo wathi, “Awu Thixo, kakusikho lokhu yini engakutshoyo ngisesekhaya? Yikho okwangenza ngaphangisa ukubalekela eThashishi. Ngangikwazi ukuthi unguNkulunkulu olomusa lesihawu, ophuza ukuthukuthela njalo ogcwele uthando, uNkulunkulu odedayo ongasoze ehlise ukuhlupheka.
3 Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. Ọ ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.”
Khathesi-ke Thixo, susa ukuphila kwami, ngoba kungcono kimi ukufa kulokuphila.”
4 Ma Onyenwe anyị sịrị, “O ziri ezi na ị ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?”
Kodwa uThixo waphendula wathi, “Kambe ubona ulelungelo na lokuthi uzonde?”
5 Mgbe ahụ, Jona si nʼebe ahụ pụọ jee nọdụ ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. O weere ahịhịa meere onwe ya ụlọ ndo, nọdụ nʼime ya, chere ka ọ hụ ihe gaje ime obodo ahụ.
UJona waphuma wayahlala endaweni ethile ngempumalanga kwedolobho. Wazenzela khonapho idunjana wahlala emthunzini walo walindela ukubona okwakuzakwenzakala edolobheni lelo.
6 Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara, nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ.
Kwasekusithi uThixo uNkulunkulu wakhulisa isihlahla esilamahlamvu kuJona samenzela umthunzi ekhanda lakhe ukuze ahlaliseke. UJona wathaba kakhulu ngaleli ivini.
7 Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ.
Kodwa emathathakusa ngelanga elilandelayo uNkulunkulu wathumela impehlane, eyaphehla isihlahla sacina sibuna.
8 O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.”
Kwathi ilanga seliphumile uNkulunkulu wathumela umoya wempumalanga ohaqazayo, ilanga lavutha phezu kwekhanda likaJona waze waqaleka. Wafisa ukufa, wathi, “Kungcono kimi ukuthi ngife kulokuthi ngiphile.”
9 Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.”
Kodwa uNkulunkulu wathi kuJona, “Ulelungelo na lokuthi uzonde ngenxa yesihlahla?” UJona wathi, “Yebo. Ngizonde kakhulu, kuthi kangife.”
10 Mgbe ahụ Onyenwe anyị kwuru, “I nwere obi ebere nʼebe osisi a dị, nke ị na-akụghị na nke i mekwaghị ka o too, bụ nke toro nʼanyasị, nwụọkwa nʼanyasị.
Kodwa uThixo wathi, “Uyazihlupha ngesihlahla lesi loba ungazange usinakekele loba usikhulise. Lihlume ngobusuku laphinde lafa ngobusuku.
11 Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?”
Kodwa iNiniva ilabantu abeqa izinkulungwane ezilikhulu elilamatshumi amabili abangehlukanisiyo isandla sabo sokudla kwesenxele, lenkomo ezinengi njalo. Bekungafanelanga yini na ukuthi ngilinqinekele idolobho elikhulu kangaka?”

< Jona 4 >