< Jọn 9 >
1 Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya.
As he passed by, he saw a man blind from birth.
2 Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?”
His disciples asked him, “Rabbi, who sinned, this man or his parents, that he was born blind?”
3 Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya.
Jesus answered, “This man did not sin, nor did his parents, but that the works of God might be revealed in him.
4 Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ.
I must work the works of him who sent me while it is day. The night is coming, when no one can work.
5 Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.”
While I am in the world, I am the light of the world.”
6 Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya.
When he had said this, he spat on the ground, made mud with the saliva, anointed the blind man’s eyes with the mud,
7 Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.
and said to him, “Go, wash in the pool of Siloam” (which means “Sent”). So he went away, washed, and came back seeing.
8 Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?”
Therefore the neighbors and those who saw that he was blind before said, “Is not this he who sat and begged?”
9 Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.”
Others were saying, “It is he.” Still others were saying, “He looks like him.” He said, “I am he.”
10 Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?”
They therefore were asking him, “How were your eyes opened?”
11 Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.”
He answered, “A man called Jesus made mud, anointed my eyes, and said to me, ‘Go to the pool of Siloam and wash.’ So I went away and washed, and I received sight.”
12 Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.”
Then they asked him, “Where is he?” He said, “I do not know.”
13 Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii.
They brought him who had been blind to the Pharisees.
14 Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya.
It was a Sabbath when Jesus made the mud and opened his eyes.
15 Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
Again therefore the Pharisees also asked him how he received his sight. He said to them, “He put mud on my eyes, I washed, and I see.”
16 Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.
Some therefore of the Pharisees said, “This man is not from God, because he does not keep the Sabbath.” Others said, “How can a man who is a sinner do such signs?” So there was division among them.
17 Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”
Therefore they asked the blind man again, “What do you say about him, because he opened your eyes?” He said, “He is a prophet.”
18 Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya.
The Jews therefore did not believe concerning him, that he had been blind and had received his sight, until they called the parents of him who had received his sight,
19 Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?”
and asked them, “Is this your son, whom you say was born blind? How then does he now see?”
20 Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya.
His parents answered them, “We know that this is our son, and that he was born blind;
21 Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.”
but how he now sees, we do not know; or who opened his eyes, we do not know. He is of age. Ask him. He will speak for himself.”
22 Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha.
His parents said these things because they feared the Jews; for the Jews had already agreed that if any man would confess him as Christ, he would be put out of the synagogue.
23 Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”
Therefore his parents said, “He is of age. Ask him.”
24 Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”
So they called the man who was blind a second time, and said to him, “Give glory to God. We know that this man is a sinner.”
25 Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
He therefore answered, “I do not know if he is a sinner. One thing I do know: that though I was blind, now I see.”
26 Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
They said to him again, “What did he do to you? How did he open your eyes?”
27 Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?”
He answered them, “I told you already, and you did not listen. Why do you want to hear it again? You do not also want to become his disciples, do you?”
28 Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis.
They insulted him and said, “You are his disciple, but we are disciples of Moses.
29 Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”
We know that God has spoken to Moses. But as for this man, we do not know where he comes from.”
30 Nwoke ahụ zaghachiri sị ha, “Ma otu ọ dị, nke a bụ ihe ịtụnanya! Unu amaghị ebe o sịrị bịa ma o meghere anya m.
The man answered them, “How amazing! You do not know where he comes from, yet he opened my eyes.
31 Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.
We know that God does not listen to sinners, but if anyone is a worshiper of God and does his will, he listens to him.
32 Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. (aiōn )
From the age (aiōn ) it has never been heard of that anyone opened the eyes of someone born blind.
33 Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”
If this man were not from God, he could do nothing.”
34 Ha zara sị ya, “Gị onye a mụrụ nʼime mmehie, ị na-achọ ikuziri anyị ihe?” Ha chụpụrụ ya nʼezi.
They answered him, “You were altogether born in sins, and do you teach us?” Then they threw him out.
35 Jisọs nụrụ na ha achụpụla ya nʼezi, ma mgbe ọ chọtara ya, ọ sịrị ya, “I kweere na Nwa nke Mmadụ?”
Jesus heard that they had thrown him out, and finding him, he said, “Do you believe in the Son of God?”
36 Ọ zara sị, “Onyenwe m, ọ bụ onye? Gwa m ka m nwe ike ikwere na ya.”
He answered, “Who is he, Lord, that I may believe in him?”
37 Jisọs sịrị ya, “Ị hụla ya ugbu a; onye gị na ya na-ekwurịta okwu bụ onye ahụ.”
Jesus said to him, “You have both seen him, and it is he who speaks with you.”
38 Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.
He said, “Lord, I believe!” and he worshiped him.
39 Jisọs sịrị, “Ọ bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.”
Jesus said, “I came into this world for judgment, that those who do not see may see; and that those who see may become blind.”
40 Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị ya, “Anyị onwe anyị, anyị bụkwa ndị kpuru ìsì?”
Those of the Pharisees who were with him heard these things, and said to him, “Are we also blind?”
41 Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”
Jesus said to them, “If you were blind, you would have no sin; but now you say, ‘We see.’ Therefore your sin remains.