< Jọn 8 >
1 Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv.
耶穌上了橄欖山。
2 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe.
清晨他又來到聖殿,眾百姓都到他跟前來,他便坐下教訓他們。
3 Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile.
那時,經師和法利賽人帶來了一個犯姦淫時被捉住的婦人,叫她站在中間,
4 Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko.
便向耶穌說:「師傅! 這婦人是正在犯姦淫時被捉住的,
5 Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”
在法律上,梅瑟命令我們該用石頭砸死這樣的婦人;可是,你說什麼呢?」
6 Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala.
他們說這話,是要試探耶穌,好能控告他;耶穌卻彎下身去,用指頭在地上畫字。
7 Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.”
因為他們不斷地追問,他便直起身來,向他們說:「你們中間誰沒有罪,先向她投石罷! 」
8 Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala.
他又彎下身去,在地上寫字。
9 Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya.
他們一聽這話,就從年老的開始到年幼的,一個一個地都溜走了,只留下耶穌一人和站在那裡的婦人。
10 Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?”
耶穌遂直起身來向說: 「婦人!他們在那裏呢?沒有人定你的罪嗎?」
11 Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.”
她說: 「主!沒有人。」耶穌向她說: 「我也不定你的罪;去罷! 從今以後,不要再犯罪了! 」
12 Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
耶穌又向眾人講說: 「我是世界的光;跟隨我的,決不在黑暗中行走,必有生命的光。」
13 Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.”
法利賽於是對對他說: 「你為你自己作證,你的證據是不可憑信的。」
14 Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga.
耶穌回答說:「我即便為我自己作證,我的證據是可憑信的,因為我知道:我從那裏來,往那裏去;你們卻不知道: 我從那裏來,或往那裏去。
15 Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe.
你們只憑肉眼判斷,我卻不判斷任何人;
16 Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.
即使我判斷,我的判斷仍是真實的,因為我不是獨自一個,而是有我,還有派遣我來的父。
17 E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’
在你們的法律上也記載著: 兩個人的作證是可憑信的。
18 Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”
今有我為我自己作證,也有派遣我的父,為我作證。」
19 Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”
他們使問他說: 「你的父在那裏?」耶穌答覆說:「你們不認識我,也不認識我的父;若是你們認識了我,也就認識我的父了。」
20 Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị.
這些話是耶穌於聖殿施教時,在銀庫院裏所講的。誰也沒有捉拿,因為的時辰還沒有到。
21 Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.”
那時,耶穌又向他們說:「我去了,你們要尋找我,你們必要死在你們的罪惡中;我所去的地方,你們不能去。」
22 Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?”
猶太人便說: 「他說: 我所去的地方,你你們不能去;莫非他要自殺嗎?」
23 Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a.
耶穌向他們說: 「你們是出於下,我卻是出於上;你們是出於這個世界,我卻不是出於這個世界。
24 A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.”
因此,我對你們說過: 你但要死在你們的罪惡中。的確,你們若不相信我就是那一位,你們必要死在你們的罪惡中。」
25 Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ.
於是,他們問耶穌說: 「你到底是誰?」耶穌回答他們說: 「難道從起初我沒有對你們講論過嗎?
26 E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.”
對你們我有許多事要說,要譴責;但是派遣我來者是真實的;我由他聽來的,我就講給世界聽。」
27 Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya.
們不明白他是在給他們講論父。
28 Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a.
耶穌遂說: 「當你們高舉了人子以後,你們便知道我就是那一位。我由我自己不作什麼;我所講論的,都是依照父所教訓我的。
29 Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.”
派遣我來者與我在一起,他沒有留下我獨自一個,因為我常作他所喜悅的事。」
30 Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
當耶穌講這些話時,許多人便信了他。
31 Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m.
於是,耶穌對那些信他的猶太人說: 「你們如果固守我的話,就確是我的門徒,
32 Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”
也會認識真理,而真理必會使你們獲得自由。」
33 Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?”
他們回答說: 「我們是亞巴郎的後裔,從未給人做過奴隸;怎麼你說:你們要成為自由的呢?」
34 Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.
耶穌答覆說: 「我實實在在告訴你們: 凡是犯罪的,就是罪惡的奴隸。
35 Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. (aiōn )
奴隸不能永遠住在家裏,兒子卻永遠居住。 (aiōn )
36 Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu.
那麼,如果天主子使你們自由了,你們的確是自由的。
37 Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu.
我知道你們是亞巴郎後裔,你們圖謀殺害我,因為你們容納不下我的話。
38 Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.”
我說的,是我在父那裏所看見的;而你們行的,卻是你們從你們的父那裏所學習的。」
39 Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ.
他們回答說: 「我們的父是亞巴郎。」耶穌對他們說: 「假如你們是亞巴郎的子女,你們就該作啞巴郎的事。
40 Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a.
如今,你們竟圖謀殺害我──這個給你們說出從天主那裏所聽到的真理的人──亞巴郎卻沒有做過言這樣的事。
41 Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.”
你們正做你們父親的事業。」他們向他說:「我們不是由淫亂生的,我們只有一個父親: 就是天主。」
42 Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m.
耶穌回答說:「假如天主是你們的父親,你們必愛我,因為我是由天主出發而來的,並不是由我自己來的,而是那一位派遣了我。
43 Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m.
為什麼你們不明白我的講論呢?無非是你們不肯聽我的話。
44 Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha.
你們是出於你們的父親魔鬼並願意追隨你們父親的慾望。從起初,他就是殺人的兇手,不站在真理上,因為在他內沒有真理;他幾時撒謊,正出於他的本性,因為他是撒謊者,而且又是撒謊者的父親。
45 Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m.
至於我,因為我說真理,你們卻不信我。
46 O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m?
你們中誰能指證我有罪?若是我說真理,為什麼你們卻不信我呢?
47 Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.”
出於天主的,必聽天主的話;你們所以不聽,因為你們不是出於天主。」
48 Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?”
猶太人遂向他說: 「我們說你是個撒瑪黎雅人,並附有魔鬼,豈不正對嗎?」
49 Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m.
耶穌答覆說: 「我沒有附魔,我只是尊敬我的父,你們卻侮辱我。
50 Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe.
然而,我不尋求我的光榮,有為我尋求而行判斷的一位。
51 Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.” (aiōn )
我實實在在告訴你們: 「誰如果遵行我的話, 永遠見不到死亡。」 (aiōn )
52 Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn )
猶太向他說: 「現在我們知道: 你附有魔鬼;亞巴郎和先知都死了;你卻說: 誰如果遵行我的話,永遠嚐不到死味。 (aiōn )
53 Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?”
難道你比我們的父親亞巴郎還大嗎?他死了,先知們也死了。你把你自己當作什麼人呢?」
54 Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m.
耶穌答覆說: 「我如果光榮我自己,我的光榮算不了什麼;那光榮是我的,是我的父,就是你們所稱的「我們的天主」。
55 Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya.
你們不認識他,我卻認識他;我若說我不認識他,我便像你們一樣是個撒謊者;但是,我認識他,也遵守他的話。
56 Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.”
你們的父親亞巴郎曾歡欣喜樂地企望看到我的日子,他看見了極其高興。」
57 Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?”
猶太就對他說: 「你還沒有五十歲,就見過亞巴郎嗎?」
58 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.”
耶穌回答說: 「我實實在在告訴你們: 在亞巴郎出現以前我就有。」
59 Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.
他們就拿起石頭來要向他投去;耶穌卻隱沒了,從聖殿裏出去了。