< Jọn 7 >
1 Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya.
Añe izay le nañavelo e Galilia ao t’Iesoà, f’ie tsy te homb’e Iehodà mb’eo amy te nipay hañè-doza ama’e o Tehodao.
2 Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso,
Nitotoke henane zay i sabadida-kivoho’ o Jiosioy,
3 ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ.
le hoe ty asa’ o rahalahi’eo ama’e: Isitaho ty eto, akia mb’e Iehodà añe, hahaoniña’ o mpiama’oo ka o fitoloñañe anoe’oo,
4 Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
amy te tsy mitoloñ’ añetake ze te ho fohiñe, fa am-palangesañe. Kanao manao o raha rezao irehe, le atrefo i valobohòkey.
5 Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.
Toe tsy niantok’ aze ka o rahalahi’eo.
6 Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile.
Le hoe t’Iesoà am’ iareo: Mbe tsy tondroke ty androko, fe songa mete ama’ areo ze andro.
7 Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ.
Tsy eo ty halaiña’ ty voatse toy anahareo fa heje’e ka iraho mpanesek’ aze ty amy hatsivokara’ey.
8 Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.”
Mionjona mb’amy sabadidakey mb’eo, fe tsy homb’ amy famantañañey hey iraho amy te mbe tsy heneke o androkoo.
9 Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili.
Ie nanoa’e izay le nitambatse e Galilia ao.
10 Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo.
Aa naho fa nionjom-ban-tsabadidake mb’eo o rahalahi’eo, le nimb’eo ka re, fe tsy nisorogodañe fa niampitsàmpitse.
11 Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?”
Nipay aze amy sabadidakey o Jiosio, ie nifanao ty hoe: Aia re?
12 E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.”
Lako firehoreho ty ama’e i màroy: hoe ty ila’e: Vañoñe indatiy, hoe ka ty ila’e: Aiy! toe ampandridrihe’e ty màro.
13 Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
Fe tsy teo ty nahaboa-drehake aze ami’ty fihembañañe o Tehodao.
14 Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe.
Ie ho nivaky mira i sabadidakey, le nionjomb’ añ’ anjomban’ Añahare mb’eo t’Iesoà, nañoke.
15 Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?”
Nilatsà’ o Tehodao le nanao ty hoe: Taia ty nampahilala indatiy o sokitseo, ie tsy nianatse?
16 Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m.
Tinoi’ Iesoà ty hoe: Tsy ahy o fañòhakoo, fa a i nañitrik’ ahiy.
17 Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke.
Ie no’ ondatio ty hanao o satri’eo le ho rendre’e i fañòhañey ke hirik’ aman’ Añahare, he te ahy o volañekoo.
18 Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya.
Mipay tsiriry ty mivolañe ty aze; f’ie mipay hañomey engeñe amy nañitrik’ azey ro to vaho tsy aman-kakeo.
19 Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?”
Tsy i Mosè hao ty nanolotse i Hake ama’ areo, fe tsy ama’areo ty mañorike i Hake? Akore t’ie mipay hampivetrak’ ahy?
20 Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”
Hoe ty natoi’ i màroy: Amañ’ anga-draty irehe, ia ze o mipay hañoho-doza ama’oo?
21 Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya.
Hoe t’Iesoà tam’ iereo: Nanao raha raike iraho, le hene latsa.
22 Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu.
Nimea’ i Mosè anahareo o savatseo (tsy t’ie hirik’ amy Mosè, fa boak’ aman-droae); vaho manavatse ondaty ami’ty Sabotse nahareo.
23 Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike?
Aa naho savareñe ami’ty Sabata t’indaty tsy handilara’e ty Hà’ i Mosè; mahaviñetse anahareo hao te nampijangañeko fonitse ami’ty Sabata t’indaty?
24 Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”
Ko mizaka ami’ty vinta’e, fa mizakà an-jaka tò.
25 Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu?
Le hoe ty ila’ o nte Ierosalemeo: Tsy itoy hao i paia’ iereo ho vonoeñey?
26 Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst?
Hehe t’ie milañoñe am-batraike eo fe tsy ivolaña’ iareo. Hera toe fohi’ o roandriañeo te ie ro toe i Norizañey?
27 Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”
Fohintika ty nihirifa’ indatiy; aa ie avy i Norizañey, tsy ho fohi’ ondaty ty niboaha’e.
28 Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya.
Aa le nipoña-peo añ’anjomban’ Añahare ao t’Iesoà te nañoke, nanao ty hoe: Eka! Fohi’ areo iraho mbore rendre’ areo ty nihirifako; Tsy nañira-batan-dRaho, fe vañoñe i nañitrik’ Ahiy, i amoea’ areoy.
29 Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.”
F’ie fantako, amy te hirik’ ama’e, ie ty nañirak’ ahy.
30 Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.
Nipay hitsepak’ aze iereo, fe tsy teo ty hahagaoñ’ aze ie mbe tsy nitondroke i ora’ey.
31 Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”
Le maro am’ ondatio ty niantok’ aze vaho nanao ty hoe: Ie totsake eo i Norizañey, hanao viloñe maro te amo nanoe’ itìañeo hao?
32 Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.
Jinanji’ o Fariseoo i nivesovesoe’ i màroy, le nañitrike mpifeleke hitsepak’ aze o mpisorom-beio naho o Fariseoo.
33 Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m.
Le hoe ty nanoa’ Iesoà: Anianike avao iraho te ama’areo vaho hienga mb’amy nañirak’ ahiy añe.
34 Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”
Hipay ahy nahareo fe tsy hahaisake; toe tsy mete’ areo hombàñe ty hombako.
35 Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe?
Le hoe ty fifanaontsi’ o Tehodao: Aia ty homba’e te tsy ho trea-tika? Hera homb’ amo miparaitak’ amo Grika añeoo, hañòke o Grikao;
36 Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”
Inoñe i enta’e ty hoe: Ho paiae’ areo iraho, fa tsy ho isa’ areo; naho, Tsy lefe areo ombañe ty hombako?
37 Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri.
Ie amy andro honka ra’elahi’ i sabadidakeiy, le niongake t’Iesoà nipazake ty hoe: Ampomb’ amako mb’etoa hikama rano ze taliñiereñe. Ze miato amako,
38 Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.”
hoe i Tsara Masiñey, le higoangoañe boak’ añ’arofo’e ao ty rano veloñe.
39 O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto.
(i Arofo ho rambese’ o mpiato ama’eo i nitsarae’e zay, fe mboe tsy ie i Arofoy, amy te mbe tsy nirengèñe t’Iesoà.)
40 Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.”
Aa le maro amy lahialeñe nahajanjiñe i tsaray ro nanao ty hoe: Toe ie i Mpitokiy.
41 Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta?
Hoe ty ila’e: Ie i Norizañey, fa hoe ka ty ila’e: Ho hirike e Galilia añe hao i Norizañey?
42 Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?”
Tsy fa tsinara’ o Sokitse Masiñeo hao te ho hirik’ amo tiri’ i Davideo i Norizañey, naho ho boake Betleheme, rova’ i Davide?
43 Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya.
Aa le nifampiria ty ama’e ondatio.
44 Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.
Teo o te hitsepak’ azeo, f’ie tsy nipaoham-pitañe.
45 Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?”
Aa le nibalike mb’amo mpisorom-bey naho Fariseoo mb’eo o mpifelekeo, le hoe ty nanoa’ o beio: Akore t’ie tsy nasese’areo?
46 Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.”
Le hoe ty natoi’ o mpifelekeo: Mbe lia’e tsy nahafilañoñe manahak’ indatiy t’indaty.
47 Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu?
Le natoi’ o Fariseoo ty hoe: I nahareo ka hao ty nampandridrihe’e?
48 Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi?
Ia amo roandriañeo naho amo Fariseoo ty miantok’ aze?
49 E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
Fokom-pàtse i màroy, amy te tsy apota’e t’i Hake.
50 Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha,
Hoe t’i nanoa’ i Nikodemosy (i mpiam’ iareo nitilike Iesoà taoloy).
51 “Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?”
Mamàtse ondaty aolo’ te ijanjiñañe hahafohiñe i nanoe’ey hao i Han-tikañey?
52 Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.”
Natoi’ iereo ty hoe: Nte-Galilia ka v-iheo? Hotsohotsò naho oniño te tsy itroaram-pitoky ty Galilia.
53 Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.
Le hene nimpoly mb’an-kiboho’e mb’eo.