< Jọn 6 >
1 Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas).
După acestea, Isus s-a dus dincolo de marea Galileii, care este marea Tiberiadei.
2 Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa.
Și o mare mulțime îl urma pentru că vedeau miracolele lui pe care le făcea peste cei ce erau bolnavi.
3 Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya.
Și Isus a urcat pe munte și acolo s-a așezat cu discipolii săi.
4 Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso.
Și paștele, sărbătoarea iudeilor, era aproape.
5 Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”
Atunci Isus, ridicând ochii și văzând că o mare mulțime a venit la el, i-a spus lui Filip: De unde să cumpărăm pâine, ca aceștia să mănânce?
6 Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme.
Și spunea aceasta ca să îl încerce, fiindcă el știa ce avea să facă.
7 Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.”
Filip i-a răspuns: Pâine de două sute de dinari nu le este suficientă, ca fiecare din ei să ia câte puțin.
8 Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara,
Unul dintre discipolii săi, Andrei, fratele lui Simon Petru, i-a spus:
9 “Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?”
Este aici un băiețel care are cinci pâini de orz și doi peștișori; dar ce sunt acestea la atâția?
10 Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.
Și Isus a spus: Faceți oamenii să se așeze. Și în locul acela era multă iarbă. Atunci bărbații s-au așezat, în număr de aproape cinci mii.
11 Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.
Și Isus a luat pâinile și după ce a adus mulțumiri, [le]-a împărțit discipolilor, iar discipolii celor ce ședeau jos; la fel și din pești cât au dorit.
12 Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.”
După ce s-au săturat, Isus le-a spus discipolilor săi: Adunați frânturile care rămân, ca nu cumva ceva să se piardă.
13 Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.
Așadar, au adunat și au umplut douăsprezece coșuri cu frânturile celor cinci pâini de orz care au rămas în plus celor ce au mâncat.
14 Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”
Atunci oamenii aceia, când au văzut miracolul pe care îl făcuse Isus, au spus: Într-adevăr acesta este profetul ce trebuia să vină în lume.
15 Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.
De aceea Isus, știind că sunt gata să vină să îl ia cu forța să îl facă împărat, s-a dus din nou pe munte, numai el singur.
16 Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,
Iar când s-a făcut seară, discipolii lui au coborât la mare.
17 ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.
Și s-au urcat într-o corabie și au trecut marea spre Capernaum. Și deja se făcuse întuneric și Isus tot nu venise la ei.
18 Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.
Și marea s-a întărâtat pentru că sufla un vânt puternic.
19 Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha.
Și după ce au vâslit cam douăzeci și cinci sau treizeci de stadii, ei îl văd pe Isus umblând pe mare și apropiindu-se de corabie, și s-au temut.
20 Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”
Dar el le-a spus: Eu sunt; nu vă temeți.
21 Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.
Atunci cu voie bună l-au primit în corabie; și îndată corabia a sosit la țărmul spre care mergeau.
22 Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ.
A doua zi, când mulțimea care stătea de cealaltă parte a mării a văzut că acolo nu era nicio altă corabie decât aceea în care se urcaseră discipolii lui, și că Isus nu intrase cu discipolii lui în corabie, ci discipolii plecaseră singuri cu ea;
23 Mgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya.
(Dar din Tiberiada au venit alte corăbii aproape de locul unde mâncaseră pâinea, după ce Domnul mulțumise).
24 Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs.
Când a văzut așadar mulțimea că nici Isus, nici discipolii lui nu erau acolo, au urcat și ei în corăbii și au venit la Capernaum, căutând pe Isus.
25 Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?”
Și când l-au găsit de cealaltă parte a mării, i-au spus: Rabi, când ai venit aici?
26 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.
Isus le-a răspuns și a zis: Adevărat, adevărat vă spun: Voi mă căutați nu pentru că ați văzut miracolele, ci pentru că ați mâncat din pâini și v-ați săturat.
27 Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” (aiōnios )
Lucrați nu pentru mâncarea care piere, ci pentru mâncarea care rămâne pentru viața veșnică pe care Fiul omului v-o va da; fiindcă pe el l-a sigilat Dumnezeu Tatăl. (aiōnios )
28 Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”
Atunci i-au spus: Ce să facem ca să putem lucra faptele lui Dumnezeu?
29 Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”
Isus a răspuns și le-a zis: Aceasta este lucrarea lui Dumnezeu: să credeți în acela pe care l-a trimis el.
30 Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ?
De aceea i-au spus: Așadar ce semn faci tu, ca să vedem și să te credem? Ce lucrezi tu?
31 Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’”
Părinții noștri au mâncat mană în pustie; așa cum este scris: Le-a dat pâine din cer să mănânce.
32 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe.
Atunci Isus le-a spus: Adevărat, adevărat vă spun: Nu Moise v-a dat acea pâine din cer, ci Tatăl meu vă dă adevărata pâine din cer.
33 Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”
Fiindcă pâinea lui Dumnezeu este cel care se coboară din cer și dă viață lumii.
34 Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”
Atunci i-au spus: Doamne, dă-ne totdeauna această pâine.
35 Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
Și Isus le-a spus: Eu sunt pâinea vieții; cine vine la mine nu va flămânzi niciodată; și cine crede în mine, nicidecum nu va înseta niciodată.
36 Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
Dar v-am spus că: M-ați și văzut și tot nu credeți.
37 Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.
Tot ce îmi dă Tatăl va veni la mine; și pe cel ce vine la mine nicidecum nu îl voi arunca afară;
38 Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m.
Pentru că am coborât din cer nu ca să fac voia mea, ci voia celui ce m-a trimis.
39 Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.
Și aceasta este voia Tatălui ce m-a trimis, ca din tot ce mi-a dat să nu pierd nimic, ci să îl înviez în ziua de apoi.
40 Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.” (aiōnios )
Și aceasta este voia celui ce m-a trimis, ca oricine care vede pe Fiul și crede în el, să aibă viață veșnică; și eu îl voi învia în ziua de apoi. (aiōnios )
41 Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.”
Atunci iudeii cârteau despre el, pentru că a spus: Eu sunt pâinea care s-a coborât din cer.
42 Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?”
Și spuneau: Nu este acest Isus, fiul lui Iosif, al cărui tată și mamă îi cunoaștem? Cum de spune el atunci: Am coborât din cer?
43 Jisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu.
De aceea Isus a răspuns și le-a zis: Nu cârtiți între voi.
44 O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.
Nimeni nu poate veni la mine decât dacă Tatăl care m-a trimis îl atrage; și eu îl voi învia în ziua de apoi.
45 E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.
Este scris în profeți: Și toți vor fi învățați de Dumnezeu. Așadar, fiecare om care a auzit și a învățat de la Tatăl, vine la mine.
46 O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ.
Nu că cineva a văzut pe Tatăl, afară de acela care este de la Dumnezeu; el l-a văzut pe Tatăl.
47 Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
Adevărat, adevărat vă spun: Cel ce crede în mine are viață veșnică. (aiōnios )
48 Abụ m achịcha nke ndụ.
Eu sunt pâinea vieții.
49 Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ.
Părinții voștri au mâncat mană în pustie și au murit.
50 Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ.
Aceasta este pâinea care coboară din cer, ca să mănânce din ea oricine și să nu moară.
51 Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.” (aiōn )
Eu sunt pâinea vie care a coborât din cer; dacă mănâncă cineva din această pâine, va trăi pentru totdeauna; și pâinea pe care o voi da eu este carnea mea, pe care o voi da pentru viața lumii. (aiōn )
52 Mgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?”
De aceea iudeii se certau între ei, spunând: Cum poate acest om să ne dea carnea lui să o mâncăm?
53 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu.
Atunci Isus le-a spus: Adevărat, adevărat vă spun: Dacă nu mâncați carnea Fiului omului și nu beți sângele lui, nu aveți viață în voi.
54 Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ. (aiōnios )
Cine carnea mea o mănâncă și bea sângele meu are viață eternă, și eu îl voi învia în ziua de apoi. (aiōnios )
55 Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ.
Căci carnea mea este într-adevăr mâncare, și sângele meu este într-adevăr băutură.
56 Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya.
Cine carnea mea o mănâncă și bea sângele meu locuiește în mine, și eu în el.
57 Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.
Așa cum Tatăl cel viu m-a trimis și eu trăiesc prin Tatăl, tot așa cel care mă mănâncă, va trăi și el prin mine.
58 Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn )
Aceasta este pâinea care a coborât din cer, nu așa cum au mâncat părinții voștri mană și au murit; cel ce mănâncă din pâinea aceasta va trăi pentru totdeauna. (aiōn )
59 O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
Acestea le-a spus în sinagogă pe când îi învăța în Capernaum.
60 Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?”
De aceea mulți dintre discipolii lui când au auzit, au spus: Greu este cuvântul acesta; cine îl poate asculta?
61 Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu?
Dar Isus, cunoscând în el însuși că discipolii lui cârteau despre aceasta, le-a spus: Aceasta vă poticnește?
62 Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ.
Dar dacă l-ați vedea pe Fiul omului urcându-se unde era mai înainte?
63 Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.
Duhul este cel care dă viață; carnea nu folosește la nimic; cuvintele pe care vi le spun eu, sunt duh și sunt viață.
64 Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye.
Dar sunt unii dintre voi care nu cred. Fiindcă Isus știa de la început cine erau cei care nu au crezut și cine este cel care îl va trăda.
65 Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.”
Și spunea: Din această cauză v-am spus că nimeni nu poate veni la mine, decât dacă i-a fost dat de Tatăl meu.
66 Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.
De atunci mulți dintre discipolii lui au mers înapoi și nu mai umblau cu el.
67 Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?”
Atunci Isus a spus celor doisprezece: Nu doriți și voi să plecați?
68 Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
Atunci Simon Petru i-a răspuns: Doamne, la cine să ne ducem? Tu ai cuvintele vieții eterne. (aiōnios )
69 Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”
Și noi credem și suntem siguri că tu ești Cristosul, Fiul Dumnezeului cel viu.
70 Jisọs zara ha, “Ọ bụghị m họpụtara unu mmadụ iri na abụọ? Ma otu onye nʼime unu bụ ekwensu!”
Isus le-a răspuns: Nu v-am ales eu pe voi cei doisprezece? Și unul dintre voi este diavol?
71 Ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saimọn Iskarịọt, onye nʼagbanyeghị na ọ bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ, bụ onye ga-arara ya nye.
Și vorbea despre Iuda Iscariot, al lui Simon; fiindcă el avea să îl trădeze, fiind unul dintre cei doisprezece.