< Jọn 5 >
1 Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem.
After this, there was a Jewish festival so Jesus went to Jerusalem.
2 Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise.
Now near the Sheep Gate in Jerusalem is a pool called Bethzatha in Hebrew, with five porches beside it.
3 Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị.
Crowds of sick people were lying in these porches—those who were blind, lame, or paralyzed.
4 Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya.
5 Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ.
One man who was there had been sick for thirty-eight years. Jesus looked at him, knowing he had been lying there for long time, and asked him,
6 Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?”
“Do you want to be healed?”
7 Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.”
“Sir,” the sick man answered, “I don't have anyone to help me get into the pool when the water is stirred. While I'm trying to get there, someone always gets in before me.”
8 Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.”
“Stand up, pick up your mat, and start walking!” Jesus told him.
9 Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike.
Immediately the man was healed. He picked up his mat and started walking. Now the day that this happened was the Sabbath.
10 Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.”
So the Jews said to the man who'd been healed, “This is the Sabbath! It's against the law to carry a mat!”
11 Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’”
“The man who healed me told me to pick up my mat and start walking,” he replied.
12 Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?”
“Who's this person who told you to carry your mat and walk?” they asked.
13 Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ.
However, the man who'd been healed didn't know who it was, for Jesus had slipped away into the surrounding crowd.
14 Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.”
Later on Jesus found the man in the Temple, and told him, “Look, now you've been healed. So stop sinning or something worse may happen to you.”
15 Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya.
The man went and told the Jews it was Jesus who had healed him.
16 Ya mere, nʼihi na Jisọs na-eme ihe ndị a nʼụbọchị izuike, ndị Juu malitere isogbu ya.
So the Jews started to harass Jesus because he was doing things on the Sabbath.
17 Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.”
But Jesus told them, “My Father is still working, and so am I.”
18 Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.
This was why the Jews tried even harder to kill him, for not only did he break the Sabbath but also called God his Father, making himself equal with God.
19 Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa.
Jesus explained to them, “I tell you the truth, the Son can do nothing by himself; he can only do what he sees the Father doing. Whatever the Father does the Son does as well.
20 Nʼihi na Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya nʼanya ma na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Nʼezie ọ ga-agbagwoju unu anya nʼihi na ọ ga-egosi ya ihe karịrị ndị a.
For the Father loves the Son, and reveals to him everything he does; and the Father will show to him even more incredible things that will completely amaze you.
21 Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla ọ masịrị ya ndụ.
For just as the Father gives life to those he resurrects from the dead, in the same way the Son also gives life to those that he wants.
22 Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara.
The Father judges no one. He has given to the Son all the authority to judge,
23 Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.
so that everyone may honor the Son just as they honor the Father. Anyone who doesn't honor the Son doesn't honor the Father who sent him.
24 “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. (aiōnios )
I tell you the truth: those who follow what I say and trust the one who sent me have eternal life. They won't be condemned, but have gone from death to life. (aiōnios )
25 Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ.
I tell you the truth: The time is coming—in fact it's here already—when the dead will hear the voice of the Son of God, and those who hear will live!
26 Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya.
Just as the Father has life-giving power in himself, so has he given the Son the same life-giving power in himself.
27 O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ.
The Father also granted the authority for judgment to him, for he is the Son of man.
28 “Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya
Don't be surprised at this, for the time is coming when all those in the grave will hear his voice
29 ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe.
and will rise again: those who have done good to the resurrection of life, and those who have done evil to the resurrection of condemnation.
30 Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.
I can do nothing by myself. I judge based on what I'm told, and my decision is right, for I'm not doing my own will but the will of the one who sent me.
31 “Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu.
If I were to make claims about myself, such claims wouldn't be valid;
32 Enwere m onye ọzọ na-agbara m ama, amatakwara m na ama ya banyere m bụ eziokwu.
but someone else gives evidence about me, and I know what he says about me is true.
33 “Unu zigaara Jọn ndị ozi, ọ gbakwaala ama maka eziokwu ahụ.
You asked John about me, and he told the truth,
34 Ọ bụghị na m na-anabata ama nke mmadụ, kama a na m ekwu ya ka enwe ike ịzọpụta unu.
but I don't need any human endorsement. I'm explaining this to you so you can be saved.
35 Ọ bụ oriọna nke na-enwu na-amụkekwa, unu họrọkwara ịṅụrị ọṅụ nʼìhè ya nʼoge nta.
John was like a brightly-burning light, and you were willing to enjoy his light for a while.
36 “Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m.
But the evidence I'm giving is greater than John's. For I am doing the work that the Father gave me to do,
37 Ya bụ Nna ahụ zitere m na-agbakwa ama nʼonwe ya banyere m. Unu anụbeghị olu maọbụ hụ ụdịdị ya.
and this is the proof that the Father sent me. The Father who sent me, he himself speaks on my behalf. You've never heard his voice, and you've never seen what he looks like,
38 Okwu ya anọkwaghị nʼime unu nʼihi na unu ekweghị nʼonye o zitere.
and you don't accept what he says, because you don't trust in the one he sent.
39 Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m. (aiōnios )
You search the Scriptures because you think that through them you'll gain eternal life. But the evidence they give is in support of me! (aiōnios )
40 Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ.
And yet you don't want to come to me so that you might live.
41 “Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ.
I'm not looking for human approval
42 Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu.
—I know you, and that you don't have God's love in you.
43 Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya.
For I've come to represent my Father, and you won't accept me; but if someone comes representing themselves, then you accept them!
44 Olee otu unu ga-esi kwere ebe unu na-anara otuto site nʼaka ibe unu, ma unu adịghị achọ otuto nke si nʼaka onye naanị ya bụ Chineke?
How can you trust in me when you look for praise from one another and yet you don't look for praise from the one true God?
45 “Unu echela na m ga-ebo unu ebubo nʼihu Nna ahụ. Onye ga-ebo unu ebubo bụ Mosis, bụ onye unu tụkwasịrị obi na ya.
But don't think I will be making accusations about you to the Father. It's Moses who is accusing you, the one in whom you place such confidence.
46 Ọ bụrụ na unu kwenyeere Mosis, unu gakwara ekwere na m, nʼihi na o dere banyere m.
For if you really trusted Moses you would trust in me, because he wrote about me.
47 Ma ebe unu na-ekweghị nʼihe o dere, olee otu unu ga-esi kwere nʼihe m kwuru?”
But since you don't trust what he said, why would you trust what I say?”