< Jọn 4 >
1 Ugbu a, Jisọs matara na ndị Farisii anụla na ọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya na-emekwa baptizim karịa Jọn.
Naizvozvo Ishe paakaziva kuti VaFarisi vakange vanzwa kuti Jesu anoita nekubhabhatidza vadzidzi vakawanda kupfuura Johwani,
2 Ma ọ bụkwaghị Jisọs na onwe ya na-eme baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim.
kunyange Jesu pachake wakange asingabhabhatidzi, asi vadzidzi vake,
3 Ọ hapụrụ Judịa laghachi azụ na Galili.
akabva Judhiya, akaendazve muGarirea.
4 Ma ọ ga-esite nʼetiti Sameria gafee.
Asi wakange achifanira kugura neSamaria.
5 Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke.
Zvino wakasvika paguta reSamaria rinonzi Sikari, pedo nedunhu Jakobho raakange apa Josefa mwanakomana wake.
6 Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie.
Zvino chitubu chaJakobho chakange chiripo. Naizvozvo Jesu aneta nerwendo wakagara saizvozvo pachitubu. Raiva awa rinenge rechitanhatu.
7 Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.”
Kwakasvika mukadzi achibva muSamaria kuzochera mvura; Jesu akati kwaari: Ndipe ndinwe.
8 (Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.)
(Nokuti vadzidzi vake vakange vaenda muguta kunotenga kudya).
9 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.)
Naizvozvo mukadzi ari muSamaria wakati kwaari: Sei iwe uri muJudha uchikumbira kunwa kwandiri, mukadzi muSamaria? Nokuti VaJudha havadyidzani neVaSamaria.
10 Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.”
Jesu akapindura akati kwaari: Dai waiziva chipo chaMwari, uye kuti ndiani anoti kwauri: Ndipe ndinwe; ungadai waikumbira kwaari, uye ungadai akupa mvura mhenyu.
11 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a.
Mukadzi akati kwaari: Ishe, hamuna chinhu chekucheresa, uye tsime rakadzika; zvino munoitora kupi mvura mhenyu?
12 Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?”
Imwi muri mukuru kuna baba vedu Jakobho, vakatipa tsime, vakanwa pariri ivo, nevana vavo, nezvipfuwo zvavo here?
13 Jisọs zara sị, “Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ.
Jesu akapindura ndokuti kwaari: Ani nani anonwa pamvura iyi, achava nenyotazve;
14 Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.” (aiōn , aiōnios )
asi ani nani anonwa pamvura yandichamupa ini, haachatongozovi nenyota nekusingaperi; asi mvura yandichamupa ichava maari chitubu chemvura, inodzutukira kuupenyu husingaperi. (aiōn , aiōnios )
15 Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.”
Mukadzi akati kwaari: Ishe, ndipei mvura iyi, kuti ndirege kuva nenyota, kana kuuya pano kuzochera.
16 Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.”
Jesu akati kwaari: Enda, unodana murume wako, ugouya pano.
17 Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.” Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di.
Mukadzi akapindura ndokuti: Handina murume. Jesu akati kwaari: Wareva zvakanaka kuti: Handina murume.
18 I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.”
Nokuti wakava nevarume vashanu, uyo waunaye ikozvino haasi murume wako; apa wareva chokwadi.
19 Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma.
Mukadzi akati kwaari: Ishe, ndinoona kuti imwi muri muporofita.
20 Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.”
Madzibaba edu ainamata mugomo iri; asi imwi munoti muJerusarema ndimo munzvimbo munhu yaanofanira kunamatapo.
21 Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem.
Jesu akati kwaari: Mukadzi, nditende, kuti awa rinouya, ramuchashumira Baba musiri mugomo iri, kana paJerusarema.
22 Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu.
Imwi munonamata chamusingazivi; isu tinoshumira chatinoziva; nokuti ruponeso rwunobva kuVaJudha.
23 Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.
Asi awa rinouya, uye ratova iro, apo vanamati vechokwadi vachanamata Baba mumweya nemuchokwadi; nokutiwo Baba vanotsvaka vakadaro kuti vavanamate.
24 Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
Mwari Mweya; neavo vanomunamata vanofanira kunamata mumweya nemuchokwadi.
25 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.”
Mukadzi akati kwaari: Ndinoziva kuti Mesiasi anouya anonzi Kristu; kana iye asvika, achatiudza zvinhu zvese.
26 Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.”
Jesu akati kwaari: Ini ndinotaura kwauri, ndini.
27 Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?”
Zvino nenguva iyi vadzidzi vake vakasvika, vakashamisika kuti anotaura nemukadzi; asi hakuna umwe wakati: Munotsvakei? Kana: Munotaurirei naye?
28 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ,
Naizvozvo mukadzi akasiya chirongo chake, ndokubva oenda muguta, akati kuvanhu:
29 “Bịanụ lee otu nwoke onye gwara m ihe niile m merela. Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst ahụ?”
Uyai, muone munhu, wandiudza zvinhu zvese zvandakaita; ko uyu haasi iye Kristu here?
30 Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya.
Naizvozvo vakabuda muguta, vakauya kwaari.
31 Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.”
Zvichakadaro vadzidzi vakamunyengetedza vachiti: Rabhi, idyai.
32 Ma ọ sịrị ha, “Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.”
Asi iye wakati kwavari: Ini ndine kudya kwekudya kwamusingazivi imwi.
33 Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?”
Naizvozvo vadzidzi vakataurirana vachiti: Kuti pane umwe wamuvigira zvekudya?
34 Jisọs sịrị ha, “Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya.
Jesu akati kwavari: Zvekudya zvangu ndizvo kuti ndiite chido chewakandituma, nekupedza basa rake.
35 Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ.
Imwi hamutauri here kuti: Kuchine mwedzi mina, zvino kukohwa kunosvika? Tarirai, ndinoti kwamuri: Simudzai meso enyu, muone minda, kuti yatochenera kukohwa.
36 Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ. (aiōnios )
Zvino anokohwa anogamuchira mubairo, uye anounganidza zvibereko muupenyu husingaperi; kuti vaviri anokusha neanokohwa vafare pamwe. (aiōnios )
37 Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’
Nokuti pane izvi shumo ndeyechokwadi inoti: Umwe anokusha, uye umwe anokohwa.
38 E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.”
Ini ndakakutumai kukohwa zvamusakashandira; vamwe vakashanda, zvino imwi mapinda pabasa ravo.
39 Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.”
Zvino vazhinji veVaSamaria kubva muguta iro vakatenda kwaari nekuda kweshoko remukadzi, rakapupura richiti: Wandiudza zvese zvandakaita.
40 Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ.
Zvino VaSamaria vakati vachisvika kwaari, vakamunyengetedza kuti agare navo; ndokugarapo mazuva maviri.
41 Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya.
Vazhinji vakawedzerwa vakatenda nekuda kweshoko rake.
42 Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
Zvino vakati kumukadzi: Hatichatendi nekuda kwekureva kwako; nokuti tazvinzwira, uye tinoziva kuti uyu ndiye zvirokwazvo Muponesi wenyika, Kristu.
43 Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.
Zvino shure kwemazuva maviri wakabvapo, ndokuenda kuGarirea;
44 (Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.)
nokuti Jesu amene wakapupura kuti muporofita haana rukudzo munyika yekwake.
45 Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ.
Zvino wakati asvika kuGarirea, VaGarirea vakamugamuchira, vaona zvinhu zvese zvaakaita paJerusarema pamabiko, nokuti naivo vakange vaenda kumabiko.
46 Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm.
Zvino Jesu wakasvikazve paKana yeGarirea, paakange aita mvura ive waini. Zvino pakange pane rimwe jinda, mwanakomana waro wakange achirwara paKapenaume.
47 Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.
Iro rakati richinzwa kuti Jesu wabva Judhiya akasvika kuGarirea, rikaenda kwaari, rikamugombedzera kuti aburukire aporese mwanakomana waro; nokuti wakange odofa.
48 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.”
Naizvozvo Jesu akati kwariri: Kunze kwekuti maona zviratidzo nezvishamiso, hamungatongotendi.
49 Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”
Jinda rikati kwaari: Ishe, burukai mwana wangu asati afa.
50 Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa.
Jesu akati kwaari: Enda, mwanakomana wako anorarama. Munhu ndokutenda shoko Jesu raakareva kwaari, akaenda.
51 Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma.
Zvino wakati oburuka, varanda vake vakamuchingamidza, vakamuudza vachiti: Mwana wenyu anorarama.
52 Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.”
Zvino akavabvunza awa raakatanga kunaya. Zvino vakati kwaari: Zuro neawa rechinomwe fivhiri yakamuregedza.
53 Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.
Naizvozvo baba vakaziva kuti maiva imo muawa Jesu maakati kwaari: Mwanakomana wako anorarama; zvino akatenda iye neimba yake yese.
54 Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.
Ichizve chiratidzo chechipiri Jesu chaakaita, abva Judhiya asvika Garirea.