< Jọn 3 >
1 O nwere otu nwoke onyeisi ndị Juu nke so nʼotu ndị Farisii aha ya bụ Nikọdimọs.
Now there was a Pharisee called Nicodemus, a ruler of the Jews,
2 Ọ bịakwutere ya nʼabalị sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere na Chineke, nʼihi na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịrụ ọrụ ebube dị otu a ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”
who came to Jesus by night, and said to him, Rabbi, we know that you are a teacher come from God; for no man can do these miracles which you do, unless God be with him.
3 Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.”
Jesus answering, said to him, Most assuredly, I say to you, unless a man be born again, he can not discern the Reign of God.
4 Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?”
Nicodemus replied, How can a grown man be born? Can he enter his mother's womb anew, and be born?
5 Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke.
Jesus answered, Most assuredly, I say to you, unless a man be born of water and Spirit, he can not enter the kingdom of God.
6 Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ.
That which is born of the flesh is flesh; that which is born of the Spirit is Spirit.
7 Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’
Wonder not, then, that I have said to you, You must be born again.
8 Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.”
The Spirit breathes where he pleases, and you hear the report of him, but know not whence he comes, or whither he goes; so is every one who is born of the spirit.
9 Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?”
Nicodemus answered, How can these things be?
10 Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a?
Jesus replied, Are you the teacher of Israel, and know not these things?
11 Nʼezie, nʼezie agwa m unu. Anyị na-ekwu banyere ihe anyị maara, na-akọwapụtakwa ihe anyị hụrụ, ma unu onwe unu adịghị anabata akaebe anyị.
Most assuredly, I say to you, we speak what we know, and testify what we have seen; yet you receive not our testimony.
12 Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe?
If you understood not, when I told you earthly things, how will you understand when I tell you heavenly things?
13 O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata.
For none has ascended into heaven, but he who descended from heaven; the Son of Man, whose abode is heaven.
14 Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu.
As Moses placed on high the serpent in the wilderness, so must the Son of Man be placed on high;
15 Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.” (aiōnios )
that whosoever believes on him may not perish, but obtain eternal life: (aiōnios )
16 Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
for God has so loved the world, as to give his own begotten Son, that whosoever believes on him, may not perish, but obtain eternal life. (aiōnios )
17 Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.
For God has sent his Son into the world, not to condemn the world, but that the world may be saved by him.
18 Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.
He who believes on him shall not be condemned; he who believes not, is already condemned, because he has not believed on the name of the only begotten Son of God.
19 Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ.
Now this is the ground of condemnation; that light has come into the world, and men have preferred the darkness to the light, because their deeds were evil.
20 Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè.
For whosoever does evil, hates the light, and shuns it, lest his deeds should be detected.
21 Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.
But he who obeys the truth, comes to the light, that it may be manifest that his actions are agreeable to God.
22 Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime obodo Judịa, ebe ọ nọtụrụ nwa oge, meekwa baptizim.
After this, Jesus went, with his disciples, into the territory of Judea, where he remained with them, and immersed.
23 Nʼotu aka ahụ, Jọn nọkwa nʼọnụ mmiri Enọn dị nso na Salim na-eme baptizim nʼihi na mmiri buru ibu nʼebe ahụ, ndị mmadụ gakwara nʼihu na-abịakwute ya, ọ na-emekwa ha baptizim.
John also was immersing in Enon, near Salim, because there was much water there; and people came thither, and were immersed.
24 E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ.
For John was not yet cast into prison.
25 Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha.
Now John's disciples had a dispute with a Jew, about purification.
26 Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.”
Then they went to John, and said to him, Rabbi, he who was with you near the Jordan, of whom you gave so great a character; he, too, immerses, and the people flock to him.
27 Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe.
John answered, A man can have no power but what he derives from heaven.
28 Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa.
You yourselves are witness for me, that I said, I am not the Messiah; but am sent before him.
29 Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a.
The bridegroom is he who has the bride; but the friend of the bridegroom, who assists him, rejoices to hear the bridegroom's voice: this, my joy, therefore, is complete.
30 Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala.
He must increase, while I decrease.
31 “Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile.
He who comes from above, is above all. He who is from the earth is earthly, and speaks as being from the earth. He who comes from heaven, is above all.
32 Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya.
What he testifies, is what he has seen and heard; yet his testimony is not received.
33 Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu.
He who receives his testimony, vouches the veracity of God.
34 Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju.
for he whom God has commissioned, relates God's own words; for to him God gives not the Spirit by measure.
35 Nna hụrụ Ọkpara ya nʼanya, o tinyekwala ihe niile nʼaka ya.
The Father loves the Son, and has subjected all things to him.
36 Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.” (aiōnios )
He who believes on the Son, has life eternal; he who rejects the Son, shall not see life: but the vengeance of God awaits him. (aiōnios )