< Jọn 21 >
1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee.
After these things Jesus manifested himself again to the disciples at the sea of Tiberias. And he manifested [himself] thus.
2 Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya.
There were together Simon Peter, and Thomas called Didymus, and Nathanael who was of Cana of Galilee, and the [sons] of Zebedee, and two others of his disciples.
3 Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla.
Simon Peter says to them, I go to fish. They say to him, We also come with thee. They went forth, and went on board, and that night took nothing.
4 Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs.
And early morn already breaking, Jesus stood on the shore; the disciples however did not know that it was Jesus.
5 Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.”
Jesus therefore says to them, Children, have ye anything to eat? They answered him, No.
6 Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.
And he said to them, Cast the net at the right side of the ship and ye will find. They cast therefore, and they could no longer draw it, from the multitude of fishes.
7 Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ.
That disciple therefore whom Jesus loved says to Peter, It is the Lord. Simon Peter therefore, having heard that it was the Lord, girded his overcoat [on him] (for he was naked), and cast himself into the sea;
8 Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise.
and the other disciples came in the small boat, for they were not far from the land, but somewhere about two hundred cubits, dragging the net of fishes.
9 Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha.
When therefore they went out on the land, they see a fire of coals there, and fish laid on it, and bread.
10 Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.”
Jesus says to them, Bring of the fishes which ye have now taken.
11 Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.
Simon Peter went up and drew the net to the land full of great fishes, a hundred and fifty-three; and though there were so many, the net was not rent.
12 Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị.
Jesus says to them, Come [and] dine. But none of the disciples dared inquire of him, Who art thou? knowing that it was the Lord.
13 Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ.
Jesus comes and takes the bread and gives it to them, and the fish in like manner.
14 Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.
This is already the third time that Jesus had been manifested to the disciples, being risen from among [the] dead.
15 Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”
When therefore they had dined, Jesus says to Simon Peter, Simon, [son] of Jonas, lovest thou me more than these? He says to him, Yea, Lord; thou knowest that I am attached to thee. He says to him, Feed my lambs.
16 Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.”
He says to him again a second time, Simon, [son] of Jonas, lovest thou me? He says to him, Yea, Lord; thou knowest that I am attached to thee. He says to him, Shepherd my sheep.
17 Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m.
He says to him the third time, Simon, [son] of Jonas, art thou attached to me? Peter was grieved because he said to him the third time, Art thou attached to me? and said to him, Lord, thou knowest all things; thou knowest that I am attached to thee. Jesus says to him, Feed my sheep.
18 Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.”
Verily, verily, I say to thee, When thou wast young, thou girdedst thyself, and walkedst where thou desiredst; but when thou shalt be old, thou shalt stretch forth thy hands, and another shall gird thee, and bring thee where thou dost not desire.
19 O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.”
But he said this signifying by what death he should glorify God. And having said this, he says to him, Follow me.
20 Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”)
Peter, turning round, sees the disciple whom Jesus loved following, who also leaned at supper on his breast, and said, Lord, who is it that delivers thee up?
21 Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?”
Peter, seeing him, says to Jesus, Lord, and what [of] this [man]?
22 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.”
Jesus says to him, If I will that he abide until I come, what [is that] to thee? Follow thou me.
23 Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?”
This word therefore went out among the brethren, That disciple does not die. And Jesus did not say to him, He does not die; but, If I will that he abide until I come, what [is that] to thee?
24 Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu.
This is the disciple who bears witness concerning these things, and who has written these things; and we know that his witness is true.
25 Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
And there are also many other things which Jesus did, the which if they were written one by one, I suppose that not even the world itself would contain the books written.