< Jọn 19 >
1 Mgbe ahụ, Pailet kpụụrụ Jisọs, a pịa ya ihe.
After that Pilate took Jesus and had him scourged;
2 Ndị agha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi, yinyekwa ya uwe mwụda na-acha odo odo.
and the soldiers plaited a crown of thorns, placed it on his head, and threw a purple cloak about him, and kept marching up to him,
3 Ha bịakwutere ya ọtụtụ mgbe na-asị, “Ekele, gị Eze ndị Juu!” Ha na-amakwa ya ụra nʼihu.
saying, "Hail! King of the Jews!" They also gave him blow after blow with their hands.
4 Pailet pụkwara nʼezi ọzọ sị ha, “Lee, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu mara na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.”
Pilate again came forth and said to the people, "See, I am going to bring his out to you, that you may clearly know that I find no crime in him,"
5 Mgbe Jisọs yi okpu ogwu na uwe odo odo pụta, Pailet sịrị ha, “Lekwanụ nwoke ahụ!”
Then as Jesus came out, wearing the crown of thorns and the purple robe, Pilate said to them, "BEHOLD, THE MAN!"
6 Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.”
So when the chief priests and the police saw him, they shouted. "Crucify him! Crucify him!" "Take him yourselves and crucify him," said Pilate, "for I find no crime in him."
7 Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.”
The Jews answered him, "We have a law, and by that law he ought to die, because he made himself out to be God’s Son,"
8 Mgbe Pailet nụrụ nke a, oke egwu tụrụ ya karịa.
Now when Pilate heard these words he was more alarmed than ever,
9 Ọ laghachiri azụ nʼime ụlọeze ahụ, jụọ Jisọs, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs azaghị ya ihe ọbụla.
and entering the Praetorium again, he said to Jesus, "What is your origin?"
10 Pailet sịrị ya, “Ị na-agba m nkịtị? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ike ịkpọgide gị nʼobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?”
Jesus made no answer. So Pilate said to him. "Do you not speak to me? Do you not know that I have power to release you, or power to crucify you?"
11 Jisọs zara ya, “Ị garaghị enwe ike ọbụla nʼebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nʼelu rute gị aka. Nke a mere mmehie onye duru m nye nʼaka gị ji karịa.”
"You would have no power over me," answered Jesus, "unless it had been given you from above. For this reason he who has betrayed me to you has the greater sin."
12 Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.”
After that Pilate began to seek to release him, but the Jews shouted out. "If you release this man you are no friend of the Emperor. Any man who makes himself out to be king is a rebel against the Emperor."
13 Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru).
On hearing what they said, Pilate brought Jesus out and made him sit on the judge’s seat in a place called the Mosaic Pavement (the Hebrew name is Gabbatha).
14 Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!”
And it was the day of Preparation for the Passover, about six o’clock in the morning. Then he said to the Jews, "Behold your King!"
15 Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.” Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?” Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.”
Then they shouted. "Away with him! Away with him! Crucify him!" "Crucify your King?" said Pilate. The chief priests answered, "We have no king but Caesar!"
16 Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. Ha kpọọrọ Jisọs pụọ.
So then he gave him over to them to be crucified.
17 O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru).
So they took Jesus, who went forth bearing his own cross, to a place called The Place of a Skull - in the Hebrew tongue, Golgotha.
18 Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
There they crucified him; and with him two others, one on either side, and Jesus between them.
19 O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu.
And Pilate moreover wrote an inscription and placed it above the cross. What he wrote was, "JESUS, THE NAZARENE, KING OF THE JEWS"
20 Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin.
This inscription was read by many of the Jews, because the place where they crucified Jesus was near the city, and the inscription was written in Hebrew, Latin, and Greek.
21 Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.”
So the high priests of the Jews said to Pilate, "Do not write ‘King of the Jews,’ but ‘He said, I am King of the Jews.’"
22 Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.”
Pilate answered, "What I have written, I have written!"
23 Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya.
After the soldiers had crucified Jesus, they took his garments and divided them into four parts, to each soldier a part, and the tunic. Now the tunic was seamless, woven in one piece from top to bottom;
24 Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere.
so the soldiers said one to another. "Let us not tear it. Let us draw lots, to see whose it shall be" - that the Scripture might be fulfilled. They divided my garments among them, For my raiment did they cast lots. This was what the soldiers did.
25 Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs.
Now there stood near the cross of Jesus, his mother and his mother’s sister, Mary the wife of Clopas, and Mary Magdalene.
26 Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.”
When Jesus saw his mother, and standing near her the disciple whom he loved, he said to his mother, "Woman behold your son."
27 Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya.
Then he said to the disciple, "Behold your mother." And from that hour the disciple took her to his home.
28 Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.”
After that, when Jesus knew that everything was now accomplished, he said in fulfilment of the words of Scripture, "I am thirsty."
29 Otu ite mmanya ọra dọrọ nso nʼebe ahụ. Ha were ogbo denye nʼime mmanya ahụ, kenye ogbo ahụ nʼosisi hisọp welie ya elu chee ya nʼọnụ.
There was a jar full of vinegar standing there; and they filled a sponge with vinegar, and put it upon a stalk of hyssop, and put it to his lips.
30 Mgbe Jisọs detụrụ mmanya ahụ ọnụ, ọ sịrị, “Ọ gwụchaala.” O hulatara isi ya, kubie ume.
Then after he had taken the vinegar, Jesus said, "IT IS FINISHED!" And bowing his head, he yielded up his spirit.
31 Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha.
It was Preparation Day, so in order to prevent the bodies’ hanging on the cross during the Sabbath (for the Sabbath was a great day) the Jews begged Pilate to have the legs broken, and the bodies taken away.
32 Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya.
So the soldiers came and broke the legs of the first man and of the other who had been crucified with him.
33 Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya.
But upon coming to Jesus they saw that he was already dead, and did not break his legs.
34 Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara.
One of the soldiers, however, pierced his side with a lance, and immediately blood and water flowed out.
35 Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.
And he who saw it has borne testimony, and his testimony is trustworthy, and he knows that he is telling the truth in order that you may believe.
36 Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.”
For this happened that the Scripture might be fulfilled, Not one of his bones shall be broken.
37 E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.”
And again another Scripture says, They shall look on him whom they have pierced.
38 Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere Arimatia, onye na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo, nʼihi egwu ndị Juu, jekwuuru Pailet rịọ ka o nye ya ikike iburu ahụ Jisọs, Pailet kwere, ya mere ọ bịara buru ahụ ya.
After these things Joseph of Arimathea, who was a disciple of Jesus, but in secret because of fear of the Jews, asked Pilate for permission to take the body of Jesus, and Pilate gave him leave. So he came and took the body.
39 Nikọdimọs, onye ahụ bịakwutere Jisọs nʼabalị na mbụ, bịakwara. O wetara máá na aloos a gwakọtara agwakọta, nke ọtụtụ ya ruru ihe dịka kilogram iri atọ na anọ.
Nicodemus also (the one who visited Jesus by night, at first) came bringing a mixture of myrrh and aloes, weighing nearly a hundred pounds.
40 Ha buuru ahụ Jisọs, tee ya ụda ndị ahụ, fụchikwaa ya nʼakwa ọcha linin dịka omenaala olili ozu nke ndị Juu si dị.
So they took the body of Jesus and wound it in linen with the spices, according to the Jewish mode of burial.
41 Ebe ahụ a kpọgidere ya nʼobe dị nʼotu ubi a gbara ogige. Nʼime ogige a, otu ili ọhụrụ dị na ya nke e jibeghị lie onye ọbụla.
There was a garden near the place where Jesus had been crucified, and in the garden a new tomb in which no one had ever been laid.
42 Nʼihi na ọ bụ ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, nakwa nʼihi na ili ahụ dị nso, ha dọnyere ahụ Jisọs nʼime ya.
Here, because of its being Preparation Day, and as the tomb was near by, they placed Jesus.