< Jọn 15 >

1 “Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi.
«Io sono la vera vite e il Padre mio è il vignaiolo.
2 Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ.
Ogni tralcio che in me non porta frutto, lo toglie e ogni tralcio che porta frutto, lo pota perché porti più frutto.
3 Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu.
Voi siete gia mondi, per la parola che vi ho annunziato.
4 Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m.
Rimanete in me e io in voi. Come il tralcio non può far frutto da se stesso se non rimane nella vite, così anche voi se non rimanete in me.
5 “Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla.
Io sono la vite, voi i tralci. Chi rimane in me e io in lui, fa molto frutto, perché senza di me non potete far nulla.
6 Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa.
Chi non rimane in me viene gettato via come il tralcio e si secca, e poi lo raccolgono e lo gettano nel fuoco e lo bruciano.
7 Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.
Se rimanete in me e le mie parole rimangono in voi, chiedete quel che volete e vi sarà dato.
8 Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.
In questo è glorificato il Padre mio: che portiate molto frutto e diventiate miei discepoli.
9 “Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m.
Come il Padre ha amato me, così anch'io ho amato voi. Rimanete nel mio amore.
10 Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya.
Se osserverete i miei comandamenti, rimarrete nel mio amore, come io ho osservato i comandamenti del Padre mio e rimango nel suo amore.
11 Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke.
Questo vi ho detto perché la mia gioia sia in voi e la vostra gioia sia piena.
12 Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya.
Questo è il mio comandamento: che vi amiate gli uni gli altri, come io vi ho amati.
13 Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya.
Nessuno ha un amore più grande di questo: dare la vita per i propri amici.
14 Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu.
Voi siete miei amici, se farete ciò che io vi comando.
15 Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m.
Non vi chiamo più servi, perché il servo non sa quello che fa il suo padrone; ma vi ho chiamati amici, perché tutto ciò che ho udito dal Padre l'ho fatto conoscere a voi.
16 Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m.
Non voi avete scelto me, ma io ho scelto voi e vi ho costituiti perché andiate e portiate frutto e il vostro frutto rimanga; perché tutto quello che chiederete al Padre nel mio nome, ve lo conceda.
17 Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.
Questo vi comando: amatevi gli uni gli altri.
18 “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị.
Se il mondo vi odia, sappiate che prima di voi ha odiato me.
19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị.
Se foste del mondo, il mondo amerebbe ciò che è suo; poiché invece non siete del mondo, ma io vi ho scelti dal mondo, per questo il mondo vi odia.
20 Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.
Ricordatevi della parola che vi ho detto: Un servo non è più grande del suo padrone. Se hanno perseguitato me, perseguiteranno anche voi; se hanno osservato la mia parola, osserveranno anche la vostra.
21 Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m.
Ma tutto questo vi faranno a causa del mio nome, perché non conoscono colui che mi ha mandato.
22 Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha.
Se non fossi venuto e non avessi parlato loro, non avrebbero alcun peccato; ma ora non hanno scusa per il loro peccato.
23 Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị.
Chi odia me, odia anche il Padre mio.
24 A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị.
Se non avessi fatto in mezzo a loro opere che nessun altro mai ha fatto, non avrebbero alcun peccato; ora invece hanno visto e hanno odiato me e il Padre mio.
25 Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’
Questo perché si adempisse la parola scritta nella loro Legge: Mi hanno odiato senza ragione.
26 “Mgbe Onye Ndụmọdụahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m.
Quando verrà il Consolatore che io vi manderò dal Padre, lo Spirito di verità che procede dal Padre, egli mi renderà testimonianza;
27 Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.
e anche voi mi renderete testimonianza, perché siete stati con me fin dal principio.

< Jọn 15 >