< Jọn 14 >

1 “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.
"Do not let your heart be troubled. Believe in God. Believe also in me.
2 Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi?
In my Father's house are many mansions. If it weren't so, I would have told you; for I go to prepare a place for you.
3 Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ.
And if I go and prepare a place for you, I will come again, and will receive you to myself; that where I am, you may be there also.
4 Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”
And you know the way where I am going."
5 Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?”
Thomas said to him, "Lord, we do not know where you are going. How can we know the way?"
6 Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.
Jesus said to him, "I am the way, the truth, and the life. No one comes to the Father except through me.
7 Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.”
If you know me, you will know my Father also. From now on you do know him and have seen him."
8 Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.”
Philip said to him, "Lord, show us the Father, and that will be enough for us."
9 Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’
Jesus said to him, "Have I been with you all this time, and still you do not know me, Philip? He who has seen me has seen the Father. How can you say, 'Show us the Father?'
10 Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya.
Do you not believe that I am in the Father, and the Father is in me? The words that I say to you I do not speak from myself; but the Father who lives in me does his works.
11 Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a.
Believe me that I am in the Father, and the Father is in me; or else believe because of the works themselves.
12 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m.
Truly, truly, I tell you, he who believes in me, the works that I do, he will do also; and he will do greater works than these, because I am going to the Father.
13 Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya.
And whatever you ask in my name, this I will do, that the Father may be glorified in the Son.
14 Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.
If you ask me anything in my name, I will do it.
15 “Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile.
If you love me, you will keep my commandments.
16 Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. (aiōn g165)
I will pray to the Father, and he will give you another Helper, that he may be with you forever, — (aiōn g165)
17 Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu.
the Spirit of truth, whom the world cannot receive; because it neither sees him nor knows him; but you know him, for he lives with you, and will be in you.
18 Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
I will not leave you orphans. I will come to you.
19 Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ.
Yet a little while, and the world will see me no more; but you will see me. Because I live, you will live also.
20 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu.
In that day you will know that I am in my Father, and you in me, and I in you.
21 Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.”
The one who has my commandments and keeps them is the one who loves me. And the one who loves me will be loved by my Father, and I will love him, and will reveal myself to him."
22 Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”
Judas (not Iscariot) said to him, "Lord, what has happened that you are about to reveal yourself to us, and not to the world?"
23 Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri.
Jesus answered and said to him, "If anyone loves me, he will keep my word; and my Father will love him, and we will come to him and make our dwelling place with him.
24 Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.
He who does not love me does not keep my words. The word which you hear is not mine, but the Father's who sent me.
25 “Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ.
All this I have spoken to you while I am still with you.
26 Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.
But the Helper, the Holy Spirit, whom the Father will send in my name, he will teach you all things, and will remind you of all that I said to you.
27 Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
Peace I leave with you. My peace I give to you. I do not give to you as the world gives. Do not let your heart be troubled, neither let it be afraid.
28 “Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m.
You heard how I told you, 'I am going away, and I will come to you.' If you loved me, you would rejoice that I am going to the Father; for the Father is greater than I.
29 Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere.
Now I have told you before it happens so that, when it happens, you may believe.
30 Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nʼihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. O nwekwaghị ike ọbụla nʼebe m nọ.
I will not speak with you much longer, for the ruler of this world is coming, and he has no hold on me.
31 Ana m eme dịka Nna m nyere m nʼiwu, ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nʼanya. “Bilienụ ugbu a ka anyị si ebe a pụọ.
But that the world may know that I love the Father, and as the Father commanded me, so I do. Arise, let us go from here.

< Jọn 14 >