< Jọn 12 >

1 Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie.
Six days before the Passover Jesus came to Bethany, where Lazarus, whom he had raised from the dead, was living.
2 Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ.
There a supper was given in his honor at which Martha waited, while Lazarus was one of those present at the table.
3 Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.
So Mary took a pound of choice spikenard perfume of great value, and anointed the feet of Jesus with it, and then wiped them with her hair. The whole house was filled with the scent of the perfume.
4 Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru,
One of the disciples, Judas Iscariot, who was about to betray Jesus, asked,
5 “Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?”
“Why was not this perfume sold for a year’s wages, and the money given to poor people?”
6 O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego.
He said this, not because he cared for the poor, but because he was a thief, and, being in charge of the purse, used to take what was put in it.
7 Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m.
“Leave her alone,” said Jesus, “so that she may keep it until the day when my body is being prepared for burial.
8 Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”
The poor you always have with you, but you will not always have me.”
9 Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie.
Now great numbers of people found out that Jesus was at Bethany; and they came there, not only because of him, but also to see Lazarus, whom he had raised from the dead.
10 Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs.
The chief priests, however, plotted to put Lazarus, as well as Jesus, to death,
11 Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.
because it was owing to him that many of the people had left them, and were becoming believers in Jesus.
12 Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem.
On the following day great numbers of people who had come to the Festival, hearing that Jesus was on his way to Jerusalem, took palm branches,
13 Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!”
and went out to meet him, shouting as they went, “God save him! Blessed is he who comes in the name of the Lord – the king of Israel!”
14 Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya,
Having found a young donkey, Jesus seated himself on it, in accordance with the passage of scripture –
15 “Atụla egwu, gị ada Zayọn! Lee, eze gị ka ọ na-abịa. Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”
‘Fear not, people of Zion. Your king is coming to you, sitting on the foal of a donkey.’
16 Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a.
His disciples did not understand all this at first; but, when Jesus had been exalted, then they remembered that these things had been said of him in scripture, and that they had done these things for him.
17 Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya.
Meanwhile the people who were with him, when he called Lazarus out of the tomb and raised him from the dead, were telling what they had seen.
18 Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ.
This, indeed, was why the crowd met him – because people had heard that he had given this sign of his mission.
19 Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.”
So the Pharisees said to one another, “You see that you are gaining nothing! Why, all the world has run after him!”
20 Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ.
Among those who were going up to worship at the Festival were some Greeks,
21 Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.”
who went to Philip of Bethsaida in Galilee, and said, “Sir, we wish to see Jesus.”
22 Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.
Philip went and told Andrew, and then together they went and told Jesus.
23 Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto.
This was his reply – “The time has come for the Son of Man to be exalted.
24 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ.
In truth I tell you, unless a grain of wheat falls into the ground and dies, it remains solitary; but, if it dies, it becomes fruitful.
25 Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. (aiōnios g166)
A person who loves their life loses it; while someone who hates their life in the present world will preserve it for eternal life. (aiōnios g166)
26 Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ.
If someone is ready to serve me, let them follow me; and where I am, there my servant will be also. If a person is ready to serve me, my Father will honor them.
27 “Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a.
Now I am distressed at heart and what can I say? Father, bring me safe through this hour – yet it was for this reason that I came to this hour –
28 Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.”
Father, honor your own name.” At this there came a voice from heaven, which said, “I have already honored it, and I will honor it again.”
29 Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”
The crowd of bystanders, who heard the sound, said that it was thundering. Others said, “An angel has been speaking to him.”
30 Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu.
“It was not for my sake that the voice came,” said Jesus, “but for yours.
31 Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a.
Now this world is on its trial. Now the Spirit that is ruling this world will be driven out;
32 Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.”
and I, when I am lifted up from the earth, will draw all people to myself.”
33 O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ.
By these words he indicated what death he was destined to die.
34 Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?” (aiōn g165)
“We,” replied the people, “have learned from the Law that the Christ is to remain for ever; how is it, then, that you say that the Son of Man must be ‘lifted up’ Who is this ‘Son of Man’?” (aiōn g165)
35 Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.
“Only a little while longer,” answered Jesus, “will you have the light among you. Travel on while you have the light, so that darkness may not overtake you; he who travels in the darkness does not know where he is going.
36 Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya.
While you still have the light, believe in the light, so that you may be children of light.” After he had said this, Jesus went away, and hid himself from them.
37 Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya.
But, though Jesus had given so many signs of his mission before their eyes, they still did not believe in him,
38 Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?”
in fulfillment of the words of the prophet Isaiah, where he says – ‘Lord, who has believed our teaching? And to whom has the might of the Lord been revealed?’
39 Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị,
The reason why they were unable to believe is given by Isaiah elsewhere, in these words –
40 “O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.”
‘He has blinded their eyes, and blunted their mind, so that they should not see with their eyes, and perceive with their mind, and turn – And I should heal them.’
41 Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.
Isaiah said this, because he saw Christ’s glory; and it was of him that he spoke.
42 Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere.
Yet for all this, even among the leading men there were many who came to believe in Jesus; but, because of the Pharisees, they did not acknowledge it, because they were afraid that they should be expelled from their synagogues;
43 Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.
for they valued honor from people more than honor from God.
44 Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.
But Jesus had proclaimed, “He who believes in me believes, not in me, but in him who sent me;
45 Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m.
and he who sees me sees him who sent me.
46 Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.
I have come as a light into the world, so that no one who believes in me should remain in the darkness.
47 “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.
When anyone hears my teaching and pays no heed to it, I am not his judge; for I came not to judge the world, but to save the world.
48 Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ.
He who rejects me, and disregards my teaching, has a judge already – the message which I have delivered will itself be his judge at the Last day.
49 Okwu ndị a esiteghị nʼaka m. Ha sitere nʼaka Nna ahụ onye zitere m ma nyekwa m iwu ihe m ga-ekwu na otu m ga esi kwuo ya.
For I have not delivered it on my own authority; but the Father, who sent me, has himself given me his command as to what I should say, and what message I should deliver.
50 Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.” (aiōnios g166)
And I know that eternal life lies in keeping his command. Therefore, whatever I say, I say only what the Father has taught me.” (aiōnios g166)

< Jọn 12 >