< Jọn 11 >
1 Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị.
有一个患病的人,名叫拉撒路,住在伯大尼,就是马利亚和她姊姊马大的村庄。
2 Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa.
这马利亚就是那用香膏抹主,又用头发擦他脚的;患病的拉撒路是她的兄弟。
3 Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, “Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa.”
她姊妹两个就打发人去见耶稣,说:“主啊,你所爱的人病了。”
4 Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.”
耶稣听见,就说:“这病不至于死,乃是为 神的荣耀,叫 神的儿子因此得荣耀。”
5 Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya.
耶稣素来爱马大和她妹子并拉撒路。
6 Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ.
听见拉撒路病了,就在所居之地仍住了两天。
7 Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa.”
然后对门徒说:“我们再往犹太去吧。”
8 Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”
门徒说:“拉比,犹太人近来要拿石头打你,你还往那里去吗?”
9 Jisọs zara, “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ.
耶稣回答说:“白日不是有十二小时吗?人在白日走路,就不至跌倒,因为看见这世上的光。
10 Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha.”
若在黑夜走路,就必跌倒,因为他没有光。”
11 Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.”
耶稣说了这话,随后对他们说:“我们的朋友拉撒路睡了,我去叫醒他。”
12 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-adị mma.”
门徒说:“主啊,他若睡了,就必好了。”
13 Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu.
耶稣这话是指着他死说的,他们却以为是说照常睡了。
14 Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, “Lazarọs anwụọla.
耶稣就明明地告诉他们说:“拉撒路死了。
15 Ma nʼihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nʼebe ahụ, ka unu nwe ike kwere. Ma bịanụ ka anyị gakwuru ya.”
我没有在那里就欢喜,这是为你们的缘故,好叫你们相信。如今我们可以往他那里去吧。”
16 Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, “Ka anyị gakwanụ ka anyị soro ya nwụọ.”
多马,又称为低土马,就对那同作门徒的说:“我们也去和他同死吧。”
17 Mgbe Jisọs rutere, ọ chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nʼili ụbọchị anọ.
耶稣到了,就知道拉撒路在坟墓里已经四天了。
18 Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ.
伯大尼离耶路撒冷不远,约有六里路。
19 Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke.
有好些犹太人来看马大和马利亚,要为她们的兄弟安慰她们。
20 Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ.
马大听见耶稣来了,就出去迎接他;马利亚却仍然坐在家里。
21 Mata sịrị Jisọs, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.
马大对耶稣说:“主啊,你若早在这里,我兄弟必不死。
22 Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.”
就是现在,我也知道,你无论向 神求什么, 神也必赐给你。”
23 Jisọs sịrị ya, “Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ.”
耶稣说:“你兄弟必然复活。”
24 Mata sịrị ya, “Amara m na ọ ga-ebili ọzọ nʼụbọchị mbilite nʼọnwụ nʼoge ikpeazụ.”
马大说:“我知道在末日复活的时候,他必复活。”
25 Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.
耶稣对她说:“复活在我,生命也在我。信我的人虽然死了,也必复活;
26 Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?” (aiōn )
凡活着信我的人必永远不死。你信这话吗?” (aiōn )
27 Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe m, ekwere m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke, onye ga-abịa nʼụwa.”
马大说:“主啊,是的,我信你是基督,是 神的儿子,就是那要临到世界的。”
28 Mgbe o kwuchara nke a, ọ gara kpọọ nwanne ya nwanyị bụ Meri, jiri nwayọọ sị ya, “Onye ozizi abịala, ọ na-akpọ gị.”
马大说了这话,就回去暗暗地叫她妹子马利亚,说:“夫子来了,叫你。”
29 Mgbe ọ nụrụ nke a, ọ biliri ọsịịsọ ga zute ya.
马利亚听见了,就急忙起来,到耶稣那里去。
30 Ruo mgbe a, Jisọs abịarutebeghị nʼobodo nta ahụ, ma ọ ka nọ nʼebe ahụ Mata zutere ya.
那时,耶稣还没有进村子,仍在马大迎接他的地方。
31 Ndị Juu nọ nʼụlọ na-akasị Meri obi hụrụ ya ka ọ pụrụ ngwangwa. Ha sochiri ya nʼazụ nʼihi na ha chere na ọ na-aga nʼili ibe akwa nʼebe ahụ.
那些同马利亚在家里安慰她的犹太人,见她急忙起来出去,就跟着她,以为她要往坟墓那里去哭。
32 Mgbe Meri rutere nʼebe Jisọs nọ, ọ dara nʼụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.”
马利亚到了耶稣那里,看见他,就俯伏在他脚前,说:“主啊,你若早在这里,我兄弟必不死。”
33 Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-ebe akwa ya na ndị Juu ahụ so ya ka ha na-ebekwa akwa, o metụrụ ya nʼime mmụọ ya. O nwere ọmịiko dị ukwuu.
耶稣看见她哭,并看见与她同来的犹太人也哭,就心里悲叹,又甚忧愁,
34 Ọ sịrị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.”
便说:“你们把他安放在哪里?”他们回答说:“请主来看。”
36 Mgbe ahụ ndị Juu na-asị, “Lee ka o si hụ ya nʼanya.”
犹太人就说:“你看他爱这人是何等恳切。”
37 Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nwoke a meghere anya onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka nwoke a hapụ ịnwụ?”
其中有人说:“他既然开了瞎子的眼睛,岂不能叫这人不死吗?”
38 Ọzọkwa, Jisọs sụrụ ude nʼime onwe ya nke ukwuu, bịarute nʼili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba e jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya.
耶稣又心里悲叹,来到坟墓前;那坟墓是个洞,有一块石头挡着。
39 Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
耶稣说:“你们把石头挪开。”那死人的姊姊马大对他说:“主啊,他现在必是臭了,因为他死了已经四天了。”
40 Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?”
耶稣说:“我不是对你说过,你若信,就必看见 神的荣耀吗?”
41 Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m.
他们就把石头挪开。耶稣举目望天,说:“父啊,我感谢你,因为你已经听我。
42 Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.”
我也知道你常听我,但我说这话是为周围站着的众人,叫他们信是你差了我来。”
43 Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!”
说了这话,就大声呼叫说:“拉撒路出来!”
44 Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”
那死人就出来了,手脚裹着布,脸上包着手巾。耶稣对他们说:“解开,叫他走!”
45 Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya.
那些来看马利亚的犹太人见了耶稣所做的事,就多有信他的;
46 Ma ụfọdụ nʼime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe o mere.
但其中也有去见法利赛人的,将耶稣所做的事告诉他们。
47 Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama.
祭司长和法利赛人聚集公会,说:“这人行好些神迹,我们怎么办呢?
48 Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nʼihu, mmadụ niile ga-ekwere na ya. Ndị Rom ga-abịakwa, kwatuo ụlọnsọ ukwu ma napụ anyị obodo anyị.”
若这样由着他,人人都要信他,罗马人也要来夺我们的地土和我们的百姓。”
49 Ma otu onye nʼime ha bụ Kaịfas, onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe ọbụla.
内中有一个人,名叫该亚法,本年作大祭司,对他们说:“你们不知道什么。
50 Ọ bụ na unu amaghị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile, karịa nʼobodo anyị niile ga-ala nʼiyi.”
独不想一个人替百姓死,免得通国灭亡,就是你们的益处。”
51 Dị ka onyeisi nchụaja nke afọ ahụ, o kwughị nke a site nʼechiche ya, kama o buru amụma na Jisọs ga-anwụ nʼihi mba ndị Juu.
他这话不是出于自己,是因他本年作大祭司,所以预言耶稣将要替这一国死;
52 Ọ bụghị nʼihi mba ahụ naanị, kama, ka ọ kpọkọta ụmụ Chineke ndị gbasara nʼebe niile.
也不但替这一国死,并要将 神四散的子民都聚集归一。
53 Ya mere, site nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi gbuo ya.
从那日起,他们就商议要杀耶稣
54 Ya mere, Jisọs kwụsịrị ịgagharị ebe ndị Juu ga-ahụ ya. O siri nʼebe ahụ pụọ gaa nʼakụkụ ọzara nʼotu obodo nta a na-akpọ Ifrem. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ nʼebe ahụ.
所以,耶稣不再显然行在犹太人中间,就离开那里往靠近旷野的地方去,到了一座城,名叫以法莲,就在那里和门徒同住。
55 Mmemme Ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nʼakụkụ ala ndị Juu niile bịa Jerusalem. Ha bịara tutu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha.
犹太人的逾越节近了,有许多人从乡下上耶路撒冷去,要在节前洁净自己。
56 Ha na-achọ Jisọs na-ajụrịta onwe ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, “Gịnị ka unu chere? Ọ bụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?”
他们就寻找耶稣,站在殿里彼此说:“你们的意思如何,他不来过节吗?”
57 Ma nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọbụla hụrụ ya bịa gwa ha ka ha gaa jide ya.
那时,祭司长和法利赛人早已吩咐说,若有人知道耶稣在哪里,就要报明,好去拿他。