< Jọn 10 >

1 “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe.
我實實在在告訴你們:凡不由門進入羊棧,而由別處爬進去的,便是賊,便是強盜。
2 Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ.
由門進去的,才是羊的牧人。
3 Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ.
看門的給他開門,羊聽他的聲音;他按著名字呼喚自己的羊,並引領出來。
4 Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya.
當他把羊放出來以後,就走在羊前面,羊也跟隨他,因為認得他的聲音。
5 Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.”
羊決不跟隨陌生人,反而逃避他,因為羊不認得陌生人的聲音。」
6 Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha.
耶穌給他們講了這個比喻,他們卻不明白給他們所講的是什麼。
7 Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ.
於是耶穌又對他們說: 「我實實在在告訴你們: 我是羊的門;
8 Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị.
凡在我以先來的,都是賊和強盜,沒有聽從他們。
9 Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
我就是門,誰若經過我進來,必可得安全;可以進,可以出,可以找到草場。
10 Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.
賊來,無非是為偷竊、殺害、毀滅; 我來,卻是為叫他們獲得生命,且獲得更豐富的生命。
11 “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.
我是善牧: 善牧為羊捨掉自己的性命。
12 Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha.
傭工,因不是牧人,羊也不是他自己的,一看見狼來,便棄羊逃跑──狼就抓住羊,把羊趕散了,
13 Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ.
因為他是傭工,對羊漠不關心。
14 “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m.
我是善牧,我認識我的羊,我的羊也認識我,
15 Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ.
正如父認識我,我也認識父一樣;我並且為羊捨掉我的性命。
16 Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
我還有別的羊,不屬於這一棧,我也該把他們引來,他們要聽我的聲音,這樣,將只有一個羊群,一個牧人。
17 Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ.
父愛我,因為我捨掉我的性命,為再取回它來:
18 O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.”
誰也不能痔去我的性命,而我是甘心情願捨掉它;我有權捨掉它,我也有權再取回它來:這是我由我父接受的命令。」
19 Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a.
因了這些話,猶太人中間又發生了紛爭;
20 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?”
他們中有許人說: 「他附魔發瘋,為什麼還聽他呢?」
21 Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?”
另有些人說: 「這話不是附魔的人所能說的;難道魔鬼能開瞎子的眼睛麼?」
22 Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi,
那時,在耶路撒冷舉行重建節,正是冬天。
23 ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba Solomọn.
耶穌徘徊於聖殿撒羅滿遊廊下。
24 Ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-edebe anyị nʼọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst ahụ, gwaghee anyị ọnụ.”
猶太人圍起他來,向他說:「你使我們的心神懸疑不定,要到幾時呢?你如果是默西亞,就坦白告訴我們罷!」
25 Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m.
耶穌答覆說: 「我已經告訴了你們,你們卻不相信;我以我父的名所作的工作,為我作證,
26 Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m.
但你們還是不信,因為你們不是屬於我的羊。
27 Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.
我的羊聽我的聲音,我也認識他們,他們也跟隨我;
28 Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. (aiōn g165, aiōnios g166)
我賜與他們永生,他們永遠不會喪亡;誰也不能從我手中把他們奪去。 (aiōn g165, aiōnios g166)
29 Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m.
那賜給我羊群的父,超越一切,為此,誰也不能從我父手裏將他們奪去。
30 Mụ na nna m bụ otu.”
我與父原是一體。」
31 Ndị Juu tụtụlitekwara nkume ọzọ ịtụ ya.
猶太人又拿起石頭來,要砸死他。
32 Ma Jisọs zara ha, “E zila m unu ọtụtụ ọrụ ọma nke sitere nʼaka Nna m, olee nke unu na-achọ ịtụ m nkume nʼihi ya?”
耶穌向他們說: 「我賴我父給你們顯示了許多善事,為了那一件,你們要砸死我呢?」
33 Ndị Juu zara ya, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nʼihi ọrụ ọma ndị a, kama nʼihi nkwulu na nʼihi na gị bụ mmadụ efu, ma ị na-eme onwe gị Chineke.”
猶太人回答說:「為了善事,我們不會砸死你;而是為了褻瀆話,為你是人,卻把你自己當作是天主。」
34 Jisọs zara ha, “Edeghị ya nʼiwu unu, sị, ‘Mụ onwe m sịrị na unu bụ chi’?
耶穌卻向他們說: 「在你們的法律上不是記載著:『我說過: 你們是神麼』?
35 Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị ahụ nabatara okwu Chineke ‘chi,’ apụghịkwa imebi ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.
如果,那些承受天主的話,天主尚且稱他們為神──而經書是不能廢棄的──
36 Unu na-ekwu na onye ahụ Chineke doro nsọ ma zitekwa ya nʼime ụwa na-ekwulu Chineke nʼihi na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke?’
那麼,父所祝聖並派遣到世界上來的,因為說過: 我是天主子,你們就說: 你說褻瀆的話麼?
37 Unu ekwenyela na m, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọrụ Nna m ka m na-arụ.
假使我不做我父的工作,你們就不必信我;
38 Ma ọ bụrụ na m na-arụ ya, a sịkwarị na unu ekweghị na m, kwerenụ nʼọrụ ndị a, ka unu nwee ike mata ma ghọtakwa na Nna ahụ nọ nʼime m, mụ onwe m nọkwa nʼime Nna ahụ.”
但若是我做了,你們縱然不肯信我,至少要信這些工作,如此你們必定認出父在我內,我在父內。」
39 Ọzọkwa, ha gbalịrị ijide ya ma ọ siri nʼaka ha pụọ.
他們又企圖捉拿他,他卻從他們手中走脫了。
40 Mgbe ahụ ọ laghachiri azụ nʼofe osimiri Jọdan, bụ ebe Jọn nọrọ na mbụ mee baptizim, ebe ahụ ka ọ nọdụrụ.
耶穌又到約旦河對岸,若翰先前施洗的地方去了,並住在那裏。
41 Ọtụtụ ndị mmadụ bịakwutere ya. Ha na-asị, “Jọn arụghị ọrụ ihe ịrịbama ọbụla, ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu.”
有許多人到他那裏說:「若翰固然沒有行過神跡,但若翰關於這人所說的一切,都是真的。」
42 Ọtụtụ mmadụ kwenyekwara na ya nʼebe ahụ.
許多人就在那裏信了耶穌。

< Jọn 10 >