< Juel 3 >

1 “Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,
« Na mikolo mpe na tango wana, tango nakozongisa bakangami ya Yuda mpe ya Yelusalemi,
2 na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat. Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.
nakosangisa bato ya bikolo nyonso mpe nakokitisa bango na lubwaku ya Jozafati. Nakosambisa bango kuna na tina na libula na Ngai, Isalaele, bato na Ngai; pamba te bapanzi bato na Ngai kati na bikolo mpe bakaboli mokili na Ngai.
3 Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.
Babeti zeke mpo na kokabola bato na Ngai, bapesi bilenge mibali basi ya ndumba, bateki bilenge basi mpo na kozwa kaka vino, mpe balangwe yango.
4 “Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.
Eh bongo bino, Tiri mpe Sidoni, bituka ya bato ya Filisitia, likambo nini lisusu kati na Ngai mpe bino? Bolingi kozongisela Ngai mabe to kotombokela Ngai? Soki yango nde ezali makanisi na bino, Ngai nde nasengeli kozongisela bino mabe na lombangu.
5 Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu.
Pamba te bozwaki palata mpe wolo na Ngai, bomengo na Ngai ya motuya makasi mpe bomemaki yango na batempelo na bino.
6 Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.
Botekaki bato ya Yuda mpe ya Yelusalemi epai ya Bagreki mpo na komema bango mosika ya mokili na bango.
7 “Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi.
Ngai moko nakopesa bango makasi mpo ete babima na bisika nyonso epai wapi botekaki bango.
8 Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
Nakoteka bana na bino ya mibali mpe ya basi epai ya bato ya Yuda, mpe bango bakoteka bango epai ya bato ya Sabe, ekolo ya mosika penza, » elobi Yawe.
9 Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.
« Bosakola likambo oyo kati na bikolo: Bobulisa mampinga mpo na bitumba! Bolamusa bilombe! Tika ete bilombe nyonso ya bitumba bapusana mpe baya!
10 Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!”
Bosala mipanga, na nzela ya bakongo na bino; mpe makonga, na nzela ya bipasola na bino! Tika ete moto na bolembu aloba: ‹ Nazali makasi. ›
11 Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!
Bino bikolo nyonso ya zingazinga, boya na lombangu mpe bosangana! Oh Yawe, kitisa bilombe na Yo!
12 “Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe.
Tika ete bikolo nyonso elamuka mpe emata kino na lubwaku ya Jozafati! Pamba te kuna nde nakovanda mpo na kosambisa bikolo nyonso ya zingazinga.
13 Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.”
Bosimba bambeli, pamba te bambuma eteli. Boya, bokamola bambuma ya vino, pamba te ekamolelo etondi, banzungu etondi, mabe na bango eleki ndelo.
14 Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ.
Bato bazali ebele, ebele penza, na lubwaku ya kosambisama. Mokolo ya Yawe ekomi pene, na lubwaku ya kosambisama.
15 Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè.
Sanza mpe moyi ekoyinda, minzoto ekongenga lisusu te.
16 Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.
Wuta na Siona, Yawe akoloba makasi; wuta na Yelusalemi, akoloba na mongongo makasi lokola kake; Lola mpe mabele ekoningana. Kasi Yawe akozala ekimelo mpo na bato na Ye, engumba batonga makasi mpo na bana ya Isalaele.
17 “Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ.
Boye, bokoyeba solo ete Ngai nazali Yawe, Nzambe na bino; navandaka na Siona, ngomba na Ngai ya bule. Yelusalemi ekozala engumba ya bule, bapaya bakolekela lisusu wana te.
18 “Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim.
Na mokolo wana, bangomba ekotangisa vino ya sika, mpe miliki ekotanga na bangomba mikuse. Miluka nyonso ya Yuda ekotonda na mayi, etima moko ya mayi ekobima wuta na Tempelo ya Yawe mpe ekosopela lubwaku ya banzete ya akasia mayi.
19 Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
Kasi mokili ya Ejipito ekobebisama, mokili ya Edomi ekokoma esobe mpo na makambo mabe oyo basalaki epai ya bato ya Yuda, pamba te basopaki makila ya bato ya Yuda na mabele na bango, atako basalaki mabe te.
20 Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.
Bato bakokoma kovanda na mokili ya Yuda mpo na libela, mpe na engumba Yelusalemi, libela na libela.
21 Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị.
Nakopetola bino mpo na ngambo ya makila, mpo ete nanu napetola bino te. »

< Juel 3 >