< Juel 2 >

1 Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn. Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m. Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji, nʼihi na ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị na-abịa, ọ na-abịaru nso.
Blow a horn in Zion, And shout in My holy hill, All inhabitants of the earth tremble, For the Day of YHWH is coming, for [it is] near!
2 Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị. Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ. Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu. Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ, a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa.
A day of darkness and thick darkness, A day of cloud and thick darkness, As darkness spread on the mountains, A people numerous and mighty, Like there has not been from of old, And after it there is not again—Until the years of generation and generation.
3 Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu, ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ. Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden, ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu, o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha.
Before it fire has consumed, And after it a flame burns, As the Garden of Eden [is] the land before it, And after it a wilderness—a desolation! And also there has not been to it an escape,
4 Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya, ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha.
As the appearance of horses [is] its appearance, And as horsemen, so they run.
5 Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.
As the noise of chariots, they skip on the tops of the mountains, As the noise of a flame of fire devouring stubble, As a mighty people set in array for battle.
6 Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu. Ihu ha na-agbarụkwa.
Pained are peoples from its face, All faces have gathered paleness.
7 Ha na-ekwogharị dịka ndị agha; ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha. Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị, na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha.
They run as mighty ones, As men of war they go up a wall, And they each go in his own ways, And they do not change their paths.
8 Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ. Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị. Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha, ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị.
And each does not press his brother, They each go on in his way, If they fall by the missile, they are not cut off.
9 Ha na-enukwasị obodo, na-agbagharị nʼelu mgbidi, na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ; na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile.
In the city they run to and fro, On the wall they run, Into houses they go up by the windows, They go in as a thief.
10 Ala na-ama jijiji nʼihu ha, eluigwe na-emekwa mkpọtụ. Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị, kpakpando adịghịkwa enye ìhè.
At their face the earth has trembled, The heavens have shaken, Sun and moon have been black, And stars have gathered up their shining.
11 Olu Onyenwe anyị dara nʼihu ndị agha, ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ, ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya. Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu bụrụkwa ihe dị egwu. Onye pụrụ ịnagide ya?
And YHWH has given forth His voice before His force, For His camp [is] very great, For mighty [is] the doer of His word, For great [is] the Day of YHWH—very fearful, And who bears it?
12 “Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”
“And also now,” a declaration of YHWH, “Turn back to Me with all your heart, And with fasting, and with weeping, And with lamentation.”
13 Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.
And tear your heart, and not your garments, And turn back to your God YHWH, For He [is] gracious and merciful, Slow to anger, and abundant in kindness, And relenting from evil.
14 Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.
Who knows—He turns back, Indeed—He has relented, And He has left behind Him a blessing, A present and drink-offering of your God YHWH?
15 Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ.
Blow a horn in Zion, Sanctify a fast—proclaim a restraint.
16 Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.
Gather the people, sanctify an assembly, Assemble the aged, Gather infants and sucklings of the breasts, Let a bridegroom go out from his inner chamber, And a bride out of her closet.
17 Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’”
Let the priests weep between the porch and the altar, servants of YHWH, And let them say: “Have pity, O YHWH, on Your people, And do not give Your inheritance to reproach, To the ruling over them of nations, Why do they say among peoples, Where [is] their God?”
18 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya, nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.
And let YHWH be zealous for His land, And have pity on His people.
19 Onyenwe anyị zaghachiri ha sị, “Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ. Agaghị m emekwa ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ.
Let YHWH answer and say to His people, “Behold, I am sending to you the grain, And the new wine, and the oil, And you have been satisfied with it, And I make you no longer a reproach among nations,
20 “Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya, m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu. Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ; ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Isisi ọjọọ ya ga-esipụta, isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche.
And the northern I put far off from you, And have driven him to a land dry and desolate, With his face toward the Eastern Sea, And his rear to the Western Sea, And his stink has come up, And his stench comes up, For he has exerted himself to work.”
21 Atụkwala egwu, gị ala Juda, kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ, nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya.
Do not fear, O land! Be glad and rejoice, For YHWH has exerted Himself to work.
22 Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile, nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ. Osisi na-amị mkpụrụ ha, osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju.
Do not fear, O livestock of the field! For pastures of a wilderness have sprung up, For the tree has borne its fruit, Fig tree and vine have given their strength!
23 Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ.
And you sons of Zion, Be glad and rejoice in your God YHWH, For He has given to you the Teacher for righteousness, And causes a shower to come down to you, Early rain and spring rain [as] in the beginning.
24 Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ.
And the floors have been full [with] pure grain, And the presses have overflown [with] new wine and oil.
25 “Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu.
“And I have repaid to you the years that the locust consumed, The cankerworm, and the caterpillar, and the palmer-worm, My great force that I sent against you.
26 Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.
And you have eaten, eating and being satisfied, And have praised the Name of your God YHWH, Who has dealt with you wonderfully, And My people are not ashamed for all time.
27 Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel. Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, na ọ dịkwaghị onye ọzọ. Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ.
And you have known that I [am] in the midst of Israel, And I [am] your God YHWH, and there is none else, And My people are not ashamed for all time.
28 “Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
And it has come to pass afterward, I pour out My Spirit on all flesh, And your sons and your daughters have prophesied, Your old men dream dreams, Your young men see visions.
29 Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.
And also on the menservants and on the maidservants, In those days I pour out My Spirit.
30 Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.
And I have given wonders in the heavens and in the earth: Blood, and fire, and columns of smoke.
31 Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.
The sun is turned to darkness, and the moon to blood, Before the coming of the Day of YHWH, The great and the fearful.
32 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka Onyenwe anyị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.
And it has come to pass, Everyone who calls on the Name of YHWH is delivered, For in Mount Zion and in Jerusalem there is an escape, As YHWH has said, And among the remnants whom YHWH is calling!”

< Juel 2 >