< Job 8 >

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị: 2 “Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a? Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike. 3 Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ? 4 Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya, o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha. 5 Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike, rịọ Onye pụrụ ime ihe niile, 6 ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi, ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị. 7 Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala, ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu. 8 “Jụọ ọgbọ ndị gara aga ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara. 9 Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo. 10 Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe? Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu? 11 Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị? Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị? 12 Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha, ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ. 13 Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke, otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi. 14 Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa; ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide. 15 Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi; ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa. 16 Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị, nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ. 17 Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ, ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a. 18 Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya, ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’ 19 Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ, site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa. 20 “Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ, maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume. 21 Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị. Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta. 22 Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe, ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”

< Job 8 >