< Job 7 >

1 “Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?
“Ṣé ìjà kò ha si fún ènìyàn lórí ilẹ̀? Ọjọ́ rẹ̀ pẹ̀lú kò ha dàbí ọjọ́ alágbàṣe?
2 Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,
Bí ọmọ ọ̀dọ̀ tí máa ń kánjú bojú wo òjìji, àti bí alágbàṣe ti í kánjú wo ọ̀nà owó iṣẹ́ rẹ̀.
3 otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.
Bẹ́ẹ̀ ni a mú mi ní ìbànújẹ́ ní ọ̀pọ̀lọpọ̀ oṣù, òru ìdáni-lágara ni a sì là sílẹ̀ fún mi.
4 Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.
Nígbà ti mo dùbúlẹ̀, èmi wí pé, ‘Nígbà wo ni èmi ó dìde?’ Tí òru yóò sì kọjá, ó sì tó fún mi láti yí síyìn-ín yí sọ́hùn-ún, títí yóò fi di àfẹ̀mọ́júmọ́.
5 Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
Kòkòrò àti ògúlùtu erùpẹ̀ ni á fi wọ̀ mi ni aṣọ, awọ ara mi bù, o sì di bíbàjẹ́.
6 “Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.
“Ọjọ́ mi yára jù ọkọ̀ ìhunṣọ lọ, o sì di lílò ní àìní ìrètí.
7 O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.
Háà! Rántí pé afẹ́fẹ́ ni ẹ̀mí mi; ojú mi kì yóò padà rí rere mọ́.
8 Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ; unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.
Ojú ẹni tí ó rí mi, kì yóò rí mi mọ́; ojú rẹ̀ tẹ̀ mọ́ra mi, èmi kò sí mọ́.
9 Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa. (Sheol h7585)
Bí ìkùùkuu tí i túká, tí í sì fò lọ, bẹ́ẹ̀ ni ẹni tí ń lọ sí ipò òkú tí kì yóò padà wa mọ́. (Sheol h7585)
10 E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ; ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
Kì yóò padà sínú ilé rẹ̀ mọ́, bẹ́ẹ̀ ní ipò rẹ̀ kì yóò mọ̀ ọn mọ́.
11 “Ya mere agaghị m emechi ọnụ; aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ. Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.
“Nítorí náà èmi kì yóò pa ẹnu mi mọ́, èmi yóò máa sọ nínú ìrora ọkàn mi, èmi yóò máa ṣe ìráhùn nínú kíkorò ọkàn mi.
12 A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri, nke mere i ji eche m nche?
Èmi a máa ṣe Òkun tàbí ẹ̀mí búburú, tí ìwọ fi ń yan olùṣọ́ tì mi?
13 Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi, maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,
Nígbà tí mo wí pé, ibùsùn mi yóò tù mí lára, ìtẹ́ mi yóò mú ara mi fúyẹ́ pẹ̀lú.
14 nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,
Nígbà náà ni ìwọ fi àlá da yọ mi lénu bò mi, ìwọ sì fi ìran òru dẹ́rùbà mí.
15 ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ, karịa inwe ụdị ahụ m nke a.
Bẹ́ẹ̀ ni ọkàn mí yàn láti fún pa àti ikú ju kí ń wà láààyè ní ipò tí ara mí wà yìí lọ.
16 Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
O sú mi, èmi kò le wà títí: jọ̀wọ́ mi jẹ́, nítorí pé asán ni ọjọ́ mi.
17 “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe, i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,
“Kí ni ènìyàn tí ìwọ o máa kókìkí rẹ̀? Àti tí ìwọ ìbá fi gbé ọkàn rẹ lé e?
18 i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile, ma na-anwale ya mgbe mgbe?
Àti ti ìwọ ó fi máa wá í bẹ̀ ẹ́ wò ni òròòwúrọ̀, ti ìwọ o sì máa dán an wò nígbàkígbà!
19 Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ, maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?
Yóò ti pẹ́ tó kí ìwọ kí ó tó fi mí sílẹ̀ lọ, tí ìwọ o fi mí sílẹ̀ jẹ́ẹ́ títí èmi yóò fi lè dá itọ́ mi mì.
20 Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị, gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme? Gịnị mere i ji elekwasị m anya? Abụrụla m ibu arọ nye gị?
Èmi ti ṣẹ̀, ki ní èmi ó ṣe sí ọ. Ìwọ Olùsójú ènìyàn? Èéṣe tí ìwọ fi fi mí ṣe àmì itasi níwájú rẹ, bẹ́ẹ̀ ni èmi sì di ẹrẹ̀ wíwo fún ọ?
21 Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m, ma bupụ mmehie m? Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ. Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”
Èéṣe tí ìwọ kò sì dárí ìrékọjá mi jìn, kí ìwọ kí ó sì mú àìṣedéédéé mi kúrò? Ǹjẹ́ nísinsin yìí ni èmi ìbá sùn nínú erùpẹ̀, ìwọ ìbá sì wá mi kiri ní òwúrọ̀, èmi kì bá tí sí.”

< Job 7 >