< Job 7 >

1 “Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?
人在世上岂无争战吗? 他的日子不像雇工人的日子吗?
2 Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,
像奴仆切慕黑影, 像雇工人盼望工价;
3 otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.
我也照样经过困苦的日月, 夜间的疲乏为我而定。
4 Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.
我躺卧的时候便说: 我何时起来,黑夜就过去呢? 我尽是反来复去,直到天亮。
5 Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
我的肉体以虫子和尘土为衣; 我的皮肤才收了口又重新破裂。
6 “Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.
我的日子比梭更快, 都消耗在无指望之中。
7 O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.
求你想念,我的生命不过是一口气; 我的眼睛必不再见福乐。
8 Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ; unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.
观看我的人,他的眼必不再见我; 你的眼目要看我,我却不在了。
9 Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa. (Sheol h7585)
云彩消散而过; 照样,人下阴间也不再上来。 (Sheol h7585)
10 E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ; ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
他不再回自己的家; 故土也不再认识他。
11 “Ya mere agaghị m emechi ọnụ; aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ. Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.
我不禁止我口; 我灵愁苦,要发出言语; 我心苦恼,要吐露哀情。
12 A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri, nke mere i ji eche m nche?
我对 神说:我岂是洋海, 岂是大鱼,你竟防守我呢?
13 Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi, maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,
若说:我的床必安慰我, 我的榻必解释我的苦情,
14 nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,
你就用梦惊骇我, 用异象恐吓我,
15 ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ, karịa inwe ụdị ahụ m nke a.
甚至我宁肯噎死,宁肯死亡, 胜似留我这一身的骨头。
16 Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
我厌弃性命,不愿永活。 你任凭我吧,因我的日子都是虚空。
17 “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe, i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,
人算什么,你竟看他为大, 将他放在心上?
18 i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile, ma na-anwale ya mgbe mgbe?
每早鉴察他, 时刻试验他?
19 Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ, maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?
你到何时才转眼不看我, 才任凭我咽下唾沫呢?
20 Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị, gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme? Gịnị mere i ji elekwasị m anya? Abụrụla m ibu arọ nye gị?
鉴察人的主啊,我若有罪,于你何妨? 为何以我当你的箭靶子, 使我厌弃自己的性命?
21 Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m, ma bupụ mmehie m? Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ. Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”
为何不赦免我的过犯, 除掉我的罪孽? 我现今要躺卧在尘土中; 你要殷勤地寻找我,我却不在了。

< Job 7 >