< Job 6 >

1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
Kisha Ayubu akajibu na kusema,
2 “A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!
“Oo, laiti maumivu yangu makubwa yangepimwa; laiti misiba yangu yote mikubwa ingewekwa kwenye mizani!
3 Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri, nke mere okwu m ji ada ike ike.
Kwa kuwa sasa ungekuwa mzito kuliko mchanga wa baharini. Kwa sababu hiyo maneno yangu yamekuwa ya haraka.
4 Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.
Kwa kuwa mishale ya Mwenyezi ipo ndani yangu, moyo wangu umelewa sumu; Vitisho vya Mungu vimejipanga vyenyewe dhidi yangu.
5 Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata, ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?
Je punda mwitu hulia akiwa na malisho? Au ng'ombe huwa dhaifu wakati wa njaa ambapo anachakula?
6 A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu, ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?
Je inawezekana kitu kisicho na ladha kulika bila chumvi? Au kuna radha yoyote katika ute mweupe wa yai?
7 A jụrụ m ịmetụ ya aka, nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.
Nakataa kuvigusa; kwangu mimi vinafanana na chakula kichukizacho.
8 “O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.
Oo, kama nigeweza kupata haja yangu; oo, kama Mungu angeridhia jambo nilitamanilo sana:
9 Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.
kama Mungu ingempendeza kuniangamiza mara moja, kwamba angeulegeza mkono wake na kuyakatilia mbali maisha yangu!
10 Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.
Hii ingeweza kuwa faraja yangu hata sasa - hata kama nafurahia sana maumivu yasiyopungua: kwa kuwa sikuyakana maneno yake Mtakatifu.
11 “Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?
Nguvu yangu ni ipi, hata nijaribu kusubiri? Mwisho wangu ni upi, utakao refusha maisha yangu?
12 Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?
Je nguvu zangu ni nguvu za mawe? Au mwili wangu umeumbwa kwa shaba nyeusi?
13 Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka, ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?
Je si kweli kwamba sina msaada ndani yangu, na kwamba hekima imeondolewa mbali nami?
14 “Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.
Kwa mtu ambaye yu karibu kuzirai, inapasa uaminifu uonyeshwe na rafiki zake; hata kwake yeye aachaye kumcha Mwenyezi.
15 Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha, dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,
Lakini ndugu zangu wamekuwa waaminifu kwangu kama mkondo wa maji jangwani, mfano wa mifereji ya maji ipitayo mpaka pasipo kitu,
16 nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi, nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.
ambayo imekuwa mieusi kwa sababu ya barafu juu yake, na kwa sababu ya theluji ambayo hujificha yenyewe ndani yake.
17 Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị, nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.
Wakati zikiyeyuka, hutoweka; kukiwa na joto, hutoweka mahali hapo.
18 Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha. Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.
Misafara ambayo husafiri kwa njia yao hugeuka na maji; huzurura jangwani na kisha hupotea.
19 Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri, otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.
Misafara kutoka Tema huitazama, wakati majeshi ya Sheba huitarajia.
20 Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi, ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.
Wamevunjika moyo kwa sababu walitumaini kupata maji. Wakaenda huko, lakini walidanganywa.
21 Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru, unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.
Kwa sasa ninyi rafiki si kitu kwangu; mmeona hali yangu ya kutisha nanyi mwaogopa.
22 O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m, sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,
Je nilisema kwenu, 'Nipeni kitu furani?' Au, 'nitoleeni zawadi katika mali zenu?'
23 gbapụtanụ m nʼaka ndị iro, maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?
Au, 'Niokoeni toka mkononi mwa mtesi wangu?' Au, 'Nitoleeni fidia kwa watesi wangu?'
24 “Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ, gosi m ebe m si mejọọ.
Nifundishe, nami nitaishika amani yangu; nifanye nifahamu wapi nilipokosea.
25 Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi! Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?
Jinsi gani maneno ya kweli yanavyo umiza! Lakini hoja zenu, jee hasa zimenionya nini mimi?
26 Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m? Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?
Je mnapanga kuyakemea maneno yangu, mnayachukulia maneno ya mtu mwenye kukata tamaa sawa na upepo?
27 Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna, ma refukwaa enyi unu.
Hasa, mna piga kura kwa ajili ya yatima, na kupatana bei juu ya rafiki yenu kama bidhaa.
28 “Lezie m anya nke ọma, ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?
Sasa, kwa sababu hiyo, tafadhari nitazame, kwa hakika sitasema uongo usoni penu.
29 Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi, tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.
Rudini, nawasihi; lisiwepo neno la uonevu na nyinyi; Hasa, rudini, sababu zangu ni za haki.
30 Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta? Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?
Je mna uovu ulimini mwangu? Je kinywa changu hakiwezi kungundua madhara?

< Job 6 >