< Job 6 >
2 “A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!
о, если бы верно взвешены были вопли мои, и вместе с ними положили на весы страдание мое!
3 Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri, nke mere okwu m ji ada ike ike.
Оно верно перетянуло бы песок морей! Оттого слова мои неистовы.
4 Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.
Ибо стрелы Вседержителя во мне; яд их пьет дух мой; ужасы Божии ополчились против меня.
5 Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata, ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?
Ревет ли дикий осел на траве? мычит ли бык у месива своего?
6 A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu, ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?
Едят ли безвкусное без соли, и есть ли вкус в яичном белке?
7 A jụrụ m ịmetụ ya aka, nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.
До чего не хотела коснуться душа моя, то составляет отвратительную пищу мою.
8 “O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.
О, когда бы сбылось желание мое и чаяние мое исполнил Бог!
9 Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.
О, если бы благоволил Бог сокрушить меня, простер руку Свою и сразил меня!
10 Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.
Это было бы еще отрадою мне, и я крепился бы в моей беспощадной болезни, ибо я не отвергся изречений Святаго.
11 “Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?
Что за сила у меня, чтобы надеяться мне? и какой конец, чтобы длить мне жизнь мою?
12 Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?
Твердость ли камней твердость моя? и медь ли плоть моя?
13 Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka, ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?
Есть ли во мне помощь для меня, и есть ли для меня какая опора?
14 “Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.
К страждущему должно быть сожаление от друга его, если только он не оставил страха к Вседержителю.
15 Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha, dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,
Но братья мои неверны, как поток, как быстро текущие ручьи,
16 nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi, nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.
которые черны от льда и в которых скрывается снег.
17 Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị, nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.
Когда становится тепло, они умаляются, а во время жары исчезают с мест своих.
18 Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha. Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.
Уклоняют они направление путей своих, заходят в пустыню и теряются;
19 Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri, otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.
смотрят на них дороги Фемайские, надеются на них пути Савейские,
20 Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi, ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.
но остаются пристыженными в своей надежде; приходят туда и от стыда краснеют.
21 Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru, unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.
Так и вы теперь ничто: увидели страшное и испугались.
22 O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m, sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,
Говорил ли я: дайте мне, или от достатка вашего заплатите за меня;
23 gbapụtanụ m nʼaka ndị iro, maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?
и избавьте меня от руки врага, и от руки мучителей выкупите меня?
24 “Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ, gosi m ebe m si mejọọ.
Научите меня, и я замолчу; укажите, в чем я погрешил.
25 Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi! Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?
Как сильны слова правды! Но что доказывают обличения ваши?
26 Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m? Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?
Вы придумываете речи для обличения? На ветер пускаете слова ваши.
27 Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna, ma refukwaa enyi unu.
Вы нападаете на сироту и роете яму другу вашему.
28 “Lezie m anya nke ọma, ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?
Но прошу вас, взгляните на меня; буду ли я говорить ложь пред лицом вашим?
29 Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi, tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.
Пересмотрите, есть ли неправда? пересмотрите, - правда моя.
30 Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta? Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?
Есть ли на языке моем неправда? Неужели гортань моя не может различить горечи?