< Job 5 >

1 “Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị? Ole ndị dị nsọ ị ga-agbakwuru?
“Koowoola kaakano, waliwo anaakuyitaba? Era ani ku batukuvu gw’onoolaajaanira?
2 Oke iwe na-egbu onye nzuzu, ekworo na-egbu onye na-enweghị uche.
Obukyayi butta atalina magezi, n’obuggya butta omusirusiru.
3 Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ, mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ.
Ndabye abasirusiru nga banywevu, naye mangu ddala ne nkolimira ekifo kye batuulamu.
4 Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị, a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha.
Abaana baabwe tebalina bukuumi, babetenterwa mu luggya nga tewali abawolereza.
5 Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi; ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu; akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso.
Omuyala alya amakungula gaabwe era atwala n’ag’omu maggwa era awankirawankira eby’obugagga byabwe.
6 Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta, ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite.
Kubanga okulaba ennaku tekuva mu nsi, wadde obuzibu okuva mu ttaka,
7 Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu, dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu.
wabula abantu bazaalibwa kulaba nnaku, ng’ensasi bwe zibuuka waggulu.
8 “Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile.
Naye nze, nzija kunoonya Katonda era mmulekere ensonga zange.
9 Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.
Akola ebikulu, ebitanoonyezeka, ebyewuunyisa ebitabalika.
10 Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo, ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.
Atonnyesa enkuba ku nsi, n’aweereza amazzi mu byalo.
11 Ọ na-ebuli ndị dị ala elu, na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha.
Ayimusa abo abanyigirizibwa n’abo abakaaba ne basitulibwa mu mirembe.
12 Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ, ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere.
Aziyiza enkwe z’ababi, emikono gyabwe gireme okutuukiriza bye bateesa.
13 Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile, mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ.
Agwikiririza abagezigezi mu bukujjukujju bwabwe, n’enkwe zaabwe n’aziziyiriza ddala.
14 Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie, nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị;
Ekizikiza kibabuutikira emisana, ne bawammanta mu ttuntu ng’ekiro.
15 Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ, ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike.
Naye aggya abali mu bwetaavu mu mukono gw’abo ab’amaanyi, n’abawonya ekitala kyabwe.
16 Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya, ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya.
Abaavu ne balyoka baba n’essuubi, n’akamwa k’abatali benkanya ne kazibibwa.
17 “Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị; ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile.
“Alina omukisa omuntu Katonda gw’abuulirira; noolwekyo tonyooma kukangavvula kw’oyo Ayinzabyonna.
18 Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha; Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.
Kubanga ye y’afumita ate era y’anyiga, y’alumya era y’awonya.
19 Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii, mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa.
Alikuwonya mu buzibu bwa ngeri mukaaga. Weewaawo ne mu ngeri musanvu tootuukibwengako kulumizibwa.
20 Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ; chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha.
Mu njala alikuwonya okufa, era anaakuwonyanga mu lutalo olw’ekitala.
21 Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị. Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.
Onookuumibwanga eri olulimi olukambwe, era tootyenga okuzikirira bwe kunaabanga kujja gy’oli.
22 Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi, ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche.
Oliseka ng’okuzikirira n’enjala bizze, era tootyenga nsolo nkambwe ez’oku nsi.
23 Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ, gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo.
Onoobanga n’enkolagana n’amayinja ag’omu nnimiro, era onoobanga n’emirembe awali ensolo enkambwe.
24 Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo; ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu.
Olimanya nti, ensiisira yo eri mirembe; era eby’obugagga byo olibibala n’olaba nga tewali kibuzeeko.
25 Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ, matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala.
Olimanya ng’ezzadde lyo liriba ddene, ne bazzukulu bo baliba bangi ng’omuddo ogw’oku nsi.
26 Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi, dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru.
Olituusibwa ku ntaana yo nga wakaddiyira ddala, ng’eŋŋaano bwe tuukira mu kiseera kyayo.
27 “Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu. Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị.”
“Ekyo twakyekenneenya, kituufu. Kimanye nga kikwata ku ggwe.”

< Job 5 >