< Job 5 >
1 “Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị? Ole ndị dị nsọ ị ga-agbakwuru?
“Call out if you please, but who will answer? To which of the holy ones will you turn?
2 Oke iwe na-egbu onye nzuzu, ekworo na-egbu onye na-enweghị uche.
For resentment kills a fool, and envy slays the simple.
3 Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ, mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ.
I have seen a fool taking root, but suddenly his house was cursed.
4 Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị, a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha.
His sons are far from safety, crushed in court without a defender.
5 Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi; ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu; akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso.
The hungry consume his harvest, taking it even from the thorns, and the thirsty pant after his wealth.
6 Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta, ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite.
For distress does not spring from the dust, and trouble does not sprout from the ground.
7 Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu, dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu.
Yet man is born to trouble as surely as sparks fly upward.
8 “Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile.
However, if I were you, I would appeal to God and lay my cause before Him—
9 Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.
the One who does great and unsearchable things, wonders without number.
10 Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo, ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.
He gives rain to the earth and sends water upon the fields.
11 Ọ na-ebuli ndị dị ala elu, na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha.
He sets the lowly on high, so that mourners are lifted to safety.
12 Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ, ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere.
He thwarts the schemes of the crafty, so that their hands find no success.
13 Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile, mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ.
He catches the wise in their craftiness, and sweeps away the plans of the cunning.
14 Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie, nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị;
They encounter darkness by day and grope at noon as in the night.
15 Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ, ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike.
He saves the needy from the sword in their mouth and from the clutches of the powerful.
16 Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya, ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya.
So the poor have hope, and injustice shuts its mouth.
17 “Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị; ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile.
Blessed indeed is the man whom God corrects; so do not despise the discipline of the Almighty.
18 Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha; Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.
For He wounds, but He also binds; He strikes, but His hands also heal.
19 Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii, mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa.
He will rescue you from six calamities; no harm will touch you in seven.
20 Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ; chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha.
In famine He will redeem you from death, and in battle from the stroke of the sword.
21 Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị. Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.
You will be hidden from the scourge of the tongue, and will not fear havoc when it comes.
22 Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi, ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche.
You will laugh at destruction and famine, and need not fear the beasts of the earth.
23 Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ, gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo.
For you will have a covenant with the stones of the field, and the wild animals will be at peace with you.
24 Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo; ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu.
You will know that your tent is secure, and find nothing amiss when inspecting your home.
25 Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ, matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala.
You will know that your offspring will be many, your descendants like the grass of the earth.
26 Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi, dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru.
You will come to the grave in full vigor, like a sheaf of grain gathered in season.
27 “Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu. Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị.”
Indeed, we have investigated, and it is true! So hear it and know for yourself.”