< Job 42 >

1 Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị:
Then Job answered the LORD:
2 “Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa.
“I know that you can do all things, and that no purpose of yours can be restrained.
3 Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata.
You asked, ‘Who is this who hides counsel without knowledge?’ therefore I have uttered that which I didn’t understand, things too wonderful for me, which I didn’t know.
4 “Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’
You said, ‘Listen, now, and I will speak; I will question you, and you will answer me.’
5 Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.
I had heard of you by the hearing of the ear, but now my eye sees you.
6 Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”
Therefore I abhor myself, and repent in dust and ashes.”
7 Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru.
It was so, that after the LORD had spoken these words to Job, the LORD said to Eliphaz the Temanite, “My wrath is kindled against you, and against your two friends; for you have not spoken of me the thing that is right, as my servant Job has.
8 Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.”
Now therefore, take to yourselves seven bulls and seven rams, and go to my servant Job, and offer up for yourselves a burnt offering; and my servant Job shall pray for you, for I will accept him, that I not deal with you according to your folly. For you have not spoken of me the thing that is right, as my servant Job has.”
9 Ya mere, Elifaz onye Teman, na Bildad, onye Shu, na Zofa, onye Naaman mere dịka Onyenwe anyị si nye ha nʼiwu. Onyenwe anyị nabatakwara ekpere nke Job kpere nʼihi ndị enyi ya.
So Eliphaz the Temanite and Bildad the Shuhite and Zophar the Naamathite went and did what the LORD commanded them, and the LORD accepted Job.
10 Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, Onyenwe anyị mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ.
The LORD restored Job’s prosperity when he prayed for his friends. The LORD gave Job twice as much as he had before.
11 Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo.
Then all his brothers, all his sisters, and all those who had been of his acquaintance before, came to him and ate bread with him in his house. They comforted him, and consoled him concerning all the evil that the LORD had brought on him. Everyone also gave him a piece of money, and everyone a ring of gold.
12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.
So the LORD blessed the latter end of Job more than his beginning. He had fourteen thousand sheep, six thousand camels, one thousand yoke of oxen, and a thousand female donkeys.
13 Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ.
He had also seven sons and three daughters.
14 Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk.
He called the name of the first, Jemimah; and the name of the second, Keziah; and the name of the third, Keren Happuch.
15 Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere.
In all the land were no women found so beautiful as the daughters of Job. Their father gave them an inheritance amongst their brothers.
16 Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ.
After this Job lived one hundred and forty years, and saw his sons, and his sons’ sons, to four generations.
17 Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.
So Job died, being old and full of days.

< Job 42 >