< Job 41 >

1 “Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan maọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya?
なんぢ鈎をもて鱷を釣いだすことを得んや その舌を糸にひきかくることを得んや
2 Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya?
なんぢ葦の繩をその鼻に通し また鈎をその齶に衝とほし得んや
3 Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere? Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?
是あに頻になんぢに願ふことをせんや 柔かになんぢに言談んや
4 Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
あに汝と契約を爲んや なんぢこれを執て永く僕と爲しおくを得んや
5 Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?
なんぢ鳥と戲むるる如くこれとたはむれ また汝の婦人等のために之を繋ぎおくを得んや
6 Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa? Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
また漁夫の社會これを商貨と爲して商賣人の中間に分たんや
7 Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?
なんぢ漁叉をもてその皮に滿し 魚矛をもてその頭を衝とほし得んや
8 Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka, ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.
手をこれに下し見よ 然ばその戰鬪をおぼえて再びこれを爲ざるべし
9 Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya. Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu.
視よその望は虚し 之を見てすら倒るるに非ずや
10 Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe. Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m?
何人も之に激する勇氣あるなし 然ば誰かわが前に立うる者あらんや
11 Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.
誰か先に我に與へしところありて我をして之に酬いしめんとする者あらん 普天の下にある者はことごとく我有なり
12 “Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan, na ike ya, na ụdịdị ya mara mma.
我また彼者の肢體とその著るしき力とその美はしき身の構造とを言では措じ
13 Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ? Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?
誰かその外甲を剥ん 誰かその雙齶の間に入ん
14 Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
誰かその面の戸を開きえんや その周圍の齒は畏るべし
15 Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,
その並列る鱗甲は之が誇るところ その相闔たる樣は堅く封じたるがごとく
16 nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
此と彼とあひ接きて風もその中間にいるべからず
17 E jikọtara ha ọnụ nke ọma, ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.
一々あひ連なり堅く膠て離すことを得ず
18 Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere; anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ.
嚔すれば即はち光發す その目は曙光の眼瞼(を開く)に似たり
19 Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya, icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya.
その口よりは炬火いで火花發し
20 Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.
その鼻の孔よりは煙いできたりて宛然葦を焚く釜のごとし
21 Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
その氣息は炭火を爇し 火燄その口より出づ
22 Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
力氣その頸に宿る 懼るる者その前に彷徨まよふ
23 Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha.
その肉の片は密に相連なり 堅く身に着て動かす可らず
24 Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.
その心の堅硬こと石のごとく その堅硬こと下磨のごとし
25 Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.
その身を興す時は勇士も戰慄き 恐怖によりて狼狽まどふ
26 O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya, o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya.
劍をもて之を撃とも利ず 鎗も矢も漁叉も用ふるところ無し
27 Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa; bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.
是は鐡を見ること稿のごとくし銅を見ること朽木のごとくす
28 Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga, ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.
弓箭もこれを逃しむること能はず 投石機の石も稿屑と見做る
29 Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka, ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.
棒も是には稿屑と見ゆ 鎗の閃めくを是は笑ふ
30 Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ, nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.
その下腹には瓦礫の碎片を連ね 泥の上に麥打車を引く
31 Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite; ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.
淵をして鼎のごとく沸かへらしめ 海をして香油の釜のごとくならしめ
32 Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga; mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ.
己が後に光る道を遺せば淵は白髮をいただけるかと疑がはる
33 O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya, o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ.
地の上には是と並ぶ者なし 是は恐怖なき身に造られたり
34 Ọ na-eleda ndị mpako niile anya. Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”
是は一切の高大なる者を輕視ず 誠に諸の誇り高ぶる者の王たるなり

< Job 41 >