< Job 41 >
1 “Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan maọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya?
E HOOPAA anei oe i ka leviatana me ka makau? A e kaomi i kona alelo me ke aho?
2 Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya?
E hiki anei ia oe ke hookomo i ke kaula kaluha i kona ihu? A me ka makau e hoolou i kona iwia?
3 Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere? Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?
E hoomahuahua anei ia i ka nonoi ana ia oe? E olelo anei ia i na mea hooluolu ia oe?
4 Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
A hoopaa anei ia i ka berita me oe? E lawe anei oe ia ia i kauwa mau loa?
5 Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?
E paani pu anei oe me ia me he manu la? E hoopaa anei oe ia ia no kou poe wahine opio?
6 Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa? Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
E hana anei na makamaka ia ia i mea ahaaina? E mahele anei lakou ia ia iwaena o ka poe kuai?
7 Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?
E hiki anei ia oe ke hoopiha i kona ili i na mea oi? I kona poo hoi i na o-ia?
8 Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka, ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.
E kau oe i kou lima maluna ona, E hoomanao i ke kaua, a e hooki iho.
9 Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya. Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu.
Aia hoi, o ka manao e paa aku ia ia ua make hewa: Aole anei e hina ilalo ka mea e nana aku ana ia ia?
10 Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe. Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m?
Aohe mea aa e hoala ia ia: A owai la hoi ka mea e hiki ke ka imua o'u?
11 Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.
Owai ka i hana mua mai na'u, a e uku aku au? O na mea a pau malalo o ka lani, no'u ia.
12 “Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan, na ike ya, na ụdịdị ya mara mma.
Aole au e huna i kona mau lala, Aole hoi i ka ikaika a me ka nani o kana mea kaua.
13 Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ? Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?
Owai ka mea e wehe ae i ke alo o kona kapa? Owai ka mea e komo iloko o kona mau a palua?
14 Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
Owai ka mea e wehe ae i na pani o kona maka? O kona mau niho a puni he mea weliweli ia.
15 Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,
O kona haaheo, o kona mau palekaua paa no ia, I hoopiliia i ka mea kapili paa.
16 nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
Ua pili kekahi i kekahi, Aole e komo ka makani iwaena o lakou.
17 E jikọtara ha ọnụ nke ọma, ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.
Ua pili pu kekahi me kekahi, Ua hui pu ia lakou, aole e hiki ke hookaawaleia'e.
18 Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere; anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ.
Ma kona kiha ana alohi mai la ka malamalama, O kona mau maka ua like me na lihilihi o ke kakahiaka.
19 Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya, icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya.
Mailoko mai o kona waha hele aku na lapalapa, A lele aku na huna ahi.
20 Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.
Mailoko mai o kona mau pukaihu puka aku ka mahu, E like me ko ka ipuhao wela, a me ka ipuhao lapalapa.
21 Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
Hoa aku kona hanu i na lanahu, A mai kona waha puka aku ka lapalapa.
22 Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
Maloko o kona a-i ke noho la ka ikaika, A lelele ka weliweli imua ona.
23 Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha.
O na wahi lewalewa o kona io ua pilipaaia, Ua paa ia ia, aole e hoonaueia.
24 Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.
O kona naau ua paa, me he pohaku la, A ua paakiki e like me ka pohaku lalo o ka wili.
25 Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.
I kona ea ana iluna, makau ka poe ikaika; No ka weliweli pihoihoi lakou.
26 O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya, o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya.
O ke kau ana o ka pahikaua ia ia aole ia e paa: O ka pahi o, o ka ihe, a me ka pololu.
27 Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa; bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.
Ua manao no ia i ka hao he like ia me ka mauu maloo, A i ke keleawe me he laau popopo la.
28 Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga, ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.
Aole e hiki i ka pua pana ke hooauhee ia ia: O na pohaku o ka maa, ua like ia me ka opala.
29 Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka, ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.
Ua manaoia ka newa e like me ka opala; Ua akaaka no ia i ka naue ana o ka ihe.
30 Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ, nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.
Malalo ona na apana ipu lepo: Hohola aku ia i ka mea oi maluna o ka lepo.
31 Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite; ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.
Hoopohapoha no ia i ka hohonu, me he ipuhao la: Hana no ia i ke kai me he ipu mea hamo la.
32 Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga; mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ.
Waiho no ia i ala malamalama mahope ona; Ua manaoia ka hohonu, he poohina.
33 O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya, o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ.
Aohe mea like maluna o ka honua, Ka mea i hanaia me ka makau ole.
34 Ọ na-eleda ndị mpako niile anya. Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”
Nana mai no ia i na mea kiekie a pau; Oia ke alii maluna o ka poe haaheo a pau.