< Job 40 >

1 Onyenwe anyị zara Job sị:
И отвеща Господь Бог ко Иову и рече:
2 “Onye ahụ na-arụso Onye pụrụ ime ihe niile ụka ọ pụrụ ịdọ ya aka na ntị? Ka onye ahụ na-ebo Chineke ebubo zaghachi ya.”
еда суд со Всесильным укланяется? Обличаяй же Бога отвещати имать Ему.
3 Mgbe ahụ, Job zaghachiri Onyenwe anyị sị:
Отвещав же Иов, рече Господеви:
4 “Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị? Eji m aka m kpuchie ọnụ m.
почто еще аз прюся, наказуемь и обличаемь от Господа, слышай таковая ничтоже сый? Аз же кий ответ дам к сим? Руку положу на устех моих:
5 Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ kwuokwa ugboro abụọ, ma agaghị m ekwukwa ọzọ.”
единою глаголах, вторицею же не приложу.
6 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
Паки же отвещав Господь, рече ко Иову из облака:
7 “Kwadoo onwe gị dịka dimkpa; enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị, achọkwara m ka i nye m ọsịsa.
ни, но препояши яко муж чресла твоя: вопрошу же тя, ты же Ми отвещай.
8 “Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m? Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara?
Не отвергай суда Моего: мниши ли Мя инако тебе сотворша, разве да явишися правдив?
9 Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke? Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya?
Еда мышца ти есть на Господа, или гласом на Него гремиши?
10 Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma, yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe.
Приими же высоту и силу, в славу же и в честь облецыся:
11 Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ, weda ha nʼala,
пусти же Ангелы гневом и всякаго укорителя смири,
12 lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere, ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo.
величава же угаси и согной нечестивыя абие:
13 Likọta ha niile nʼotu nʼaja, kpuchie ihu ha niile nʼala ili.
скрый же в землю вне вкупе и лица их безчестия исполни.
14 Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị.
Исповем, яко может десница твоя спасти.
15 “Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi.
Но убо се, зверие у тебе, траву аки волове ядят:
16 Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya.
се убо, крепость его на чреслех, сила же его на пупе чрева:
17 Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida; akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma.
постави ошиб яко кипарис, жилы же его (яко уже) сплетены суть,
18 Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị, ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe.
ребра его ребра медяна, хребет же его железо слияно.
19 Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke, ma naanị onye kere ya nwere ike iji mma agha bịa ya nso.
Сиесть начало создания Господня: сотворен поруган быти Ангелы Его:
20 Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri. Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu.
возшед же на гору стреминную, сотвори радость четвероногим в тартаре:
21 Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri, zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị.
под всяким древом спит, при рогозе и тростии и ситовии:
22 Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya, osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu.
осеняют же над ним древеса велика с леторасльми и ветви напольныя:
23 Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu; ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ.
аще будет наводнение, не ощутит: уповает, яко внидет Иордан во уста его:
24 Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya, maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?
во око свое возмет его, ожесточився продиравит ноздри.

< Job 40 >