< Job 4 >
1 Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
UElifazi umThemani wasephendula wathi:
2 “Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu? Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?
Uba sizama ilizwi kuwe, uzadabuka yini? Kodwa ngubani ongazibamba emazwini?
3 Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ, na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.
Khangela, uqondisile abanengi, waqinisa izandla ezibuthakathaka.
4 Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ, ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.
Amazwi akho amvusile okhubekayo, waqinisa amadolo axegayo.
5 Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba; nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.
Kodwa khathesi kufikile kuwe, uyadinwa; kuyakuthinta wena, utshaywa luvalo.
6 Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị, izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?
Ukwesaba kwakho uNkulunkulu kakusiso isibindi sakho yini, lobuqotho bendlela zakho ithemba lakho?
7 “Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi? Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?
Akukhumbule, ngubani owake wachithwa engelacala? Kumbe abalungileyo bake baqunywa ngaphi?
8 Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi.
Njengengikubonileyo, abalima ububi behlanyela udubo, bavuna khona.
9 Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta. Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.
Ngokuphephetha kukaNkulunkulu bayabhubha, langokuphefumula kwamakhala akhe bayaphela.
10 Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ, ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.
Ukubhonga kwesilwane, lelizwi lesilwane esesabekayo, lamazinyo amabhongo esilwane, kwephukile.
11 Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara, ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.
Isilwane esidala siyabhubha ngokuswela impango, lemidlwane yesilwanekazi isabalale.
12 “E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo, ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.
Ngasenginyenyezelwa ilizwi, lendlebe yami yemukela okuncinyane kwalo.
13 Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị, mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,
Phakathi kwemicabango yemibono yebusuku, lapho ubuthongo obukhulu busehlela abantu,
14 oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m, meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.
ukwesaba kwangifikela lokuthuthumela okwenza ubunengi bamathambo ami baqhaqhazela.
15 Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee. Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.
Kwasekusedlula umoya ebusweni bami, loboya benyama yami bavuka.
16 Ọ kwụsịrị; ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ. Onyinyo guzooro nʼanya m, anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:
Wema, kodwa angikuqondanga ukubonakala kwawo; isimo sasiphambi kwamehlo ami; kwathula, ngasengisizwa ilizwi lisithi:
17 ‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?
Kambe umuntu angalunga okwedlula uNkulunkulu? Umuntu angahlambuluka okwedlula uMenzi wakhe yini?
18 Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,
Khangela, kazithembi inceku zakhe, lengilosi zakhe uthi zingabaphosisi.
19 ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.
Kangakanani abahlala endlini zebumba, abasisekelo sabo sisethulini, abachotshozwa phambi kwenundu.
20 Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha: ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.
Bakhandwa kusukela ekuseni kuze kube kusihlwa, kungelakunanzwa bayabhubha kuze kube nininini.
21 Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu, mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’
Ubuhle babo kabususwa labo yini? Bayafa kodwa bengalanhlakanipho.