< Job 4 >

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
特曼人厄里法次開始說:
2 “Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu? Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?
人若和你講話,你能忍受嗎﹖但誰又能忍住不說﹖
3 Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ, na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.
看,你曾勸戒過許多人,堅固過軟弱無能的人;
4 Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ, ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.
你的話扶起了跌倒的人,堅固了膝弱無力的人;
5 Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba; nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.
但是現今災禍一臨於你,你就萎靡不振;一接觸你,你就沮喪失意。
6 Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị, izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?
你敬畏天主之情,豈不是你的依靠﹖你完善的行為,豈不是你的希望﹖
7 “Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi? Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?
請想:那有無辜者喪亡﹖那有正直者消逝﹖
8 Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi.
照我所見:那播種邪惡的,必收邪惡;散佈毒害的,必收毒害。
9 Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta. Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.
天主一噓氣,他們即滅亡;一發怒氣,他們即消失。
10 Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ, ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.
獅吼豹嗥完全止息,幼獅的牙齒也被打碎;
11 Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara, ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.
壯獅因缺獵物而滅絕,牝獅幼子各自東西離散。
12 “E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo, ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.
我竊聽到一句話,我耳聽見細語聲。
13 Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị, mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,
當人沉睡時,夜夢多幻象;
14 oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m, meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.
我恐怖戰慄,全身骨頭發抖。
15 Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee. Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.
寒風掠過我面,使我毛髮悚然。
16 Ọ kwụsịrị; ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ. Onyinyo guzooro nʼanya m, anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:
他停立不動,但我不能辨其形狀;我面前出現形影,我聽見細微的聲音:
17 ‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?
人豈能在天主前自以為義﹖在造他者前,自以為潔﹖
18 Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,
看,他的僕役,他還不信;他的使者,他還歸罪,
19 ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.
何況那以泥屋為居所,以塵土為基礎的人! 他們為人踐踏,有如蠹蟲;
20 Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha: ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.
晨昏間即化為齏粉,永遠消亡而無人一顧。
21 Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu, mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’
幕索如已自斷,他們豈不是因缺少智慧而死亡﹖

< Job 4 >