< Job 39 >

1 “Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa? O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?
Uyasazi yini isikhathi sokuzala kwamagogo edwala? Uyananzelela yini ukuhelelwa kwezimpala?
2 Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha. Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?
Ungazibala yini inyanga ezizigcwalisayo? Njalo uyasazi yini isikhathi sokuzala kwazo?
3 Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha. Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.
Zigoba, zizale abantwana bazo, zikhuphe imihelo yazo.
4 Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike. Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.
Amazinyane azo aqine akhule egangeni; asuke ahambe, angabuyi kuzo.
5 “Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya? Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?
Ngubani owakhupha ubabhemi weganga ekhululekile? Njalo ngubani othukulule izibopho zikababhemi weganga,
6 Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha, ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.
engimmisele inkangala ibe ngumuzi wakhe, lesimunyu sibe zindawo zakhe zokuhlala?
7 Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya, ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.
Uhleka umsindo womuzi, angezwa imisindo yomtshayeli.
8 Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya, ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.
Udinga izintaba ezilidlelo lakhe, edinga elandela konke okuluhlaza.
9 “Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi? Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
Inyathi iyavuma yini ukukusebenzela? Izalala yini esibayeni sakho ebusuku?
10 Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị? Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?
Ungayibophela inyathi yini ngentambo yayo emfolweni? Ingabhuqa yini izihotsha emva kwakho?
11 Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?
Ungathembela kuyo yini ngoba amandla ayo makhulu? Ungayiyekelela yini umtshikatshika wakho?
12 I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka site nʼebe ịzọcha ọka gị?
Ungayikholwa yini ukuthi izabuyisa inhlanyelo yakho, njalo iyibuthele ebaleni lokubhulela lakho?
13 “Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya, ma a pụghị iji nku ya tụnyere nku na abụba nke ụgbala.
Impiko zezintshe ziyaphaphazela ngentokozo; kodwa zizimpiko lezinsiba zengabuzane yini?
14 Ọ na-eyi akwa ya nʼala ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
Ngoba itshiya amaqanda ayo emhlabathini, iwakhudumeze othulini,
15 Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.
iyakhohlwa ukuthi unyawo lungawachoboza, lokuthi isilo seganga singawanyathela.
16 Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya, ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.
Iwaphatha kalukhuni amaphuphu ayo, kungathi kawayisiwo awayo; umtshikatshika wayo uyize, ingelakwesaba.
17 Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe maọbụ kenye ya oke na inwe uche.
Ngoba uNkulunkulu wayithathela inhlakanipho, kayabelanga ukuqedisisa.
18 Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ, ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.
Lapho sekuyisikhathi iyaziphakamisela phezulu, ihleke ibhiza lomgadi walo.
19 “Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya, ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?
Uzanika yini ibhiza amandla? Uyayigqokisa yini intamo yalo ngomhlonga oyephuzelayo?
20 Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?
Uyalenza leqe yini njengentethe? Ubukhosi bokukhala kwalo buyesabeka.
21 Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya, ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
Liyaphanda esihotsheni, lithokoze ngamandla alo, liphume ukuhlangabeza izikhali.
22 Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.
Liyakuhleka ukwesaba, kalesabi, kaliphenduki phambi kwenkemba.
23 Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
Phezu kwalo isamba semitshoko siyakhehlezela, umkhonto ophazimayo lomdikadika.
24 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala. Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.
Ngokuqhuqha lokufutheka liginye umhlaba; kalikholwa ukuthi ngumsindo wophondo.
25 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’ Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
Ekukhaleni kophondo lithi: Aha! Linuke impi ikhatshana, umdumo wezinduna, lokumemeza.
26 “Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu, gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?
Ukhozi luyaphapha yini ngokuqedisisa kwakho, luselulela impiko zalo eningizimu?
27 Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?
Ilinqe liyaqonga ngokulaya kwakho, lakhe isidleke salo engqongeni yini?
28 Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị; ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.
Lihlala lilale ebusuku edwaleni, engqongeni yedwala leyenqaba.
29 O bụ site nʼebe ahụ ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.
Lisuka lapho lidinga ukudla; amehlo alo abonela khatshana.
30 Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara, nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”
Lamaphuphu alo azitika ngegazi; lalapho okukhona ababuleweyo likhona.

< Job 39 >