< Job 39 >

1 “Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa? O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?
“Have you known the time of The bearing of the wild goats of the rock? Do you mark the bringing forth of does?
2 Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha. Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?
Do you number the months they fulfill? And have you known the time of their bringing forth?
3 Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha. Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.
They bow down, They bring forth their young ones safely, They cast forth their pangs.
4 Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike. Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.
Their young ones are safe, They grow up in the field, they have gone out, And have not returned to them.
5 “Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya? Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?
Who has sent forth the wild donkey free? Indeed, who opened the bands of the wild donkey?
6 Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha, ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.
Whose house I have made the wilderness, And his dwellings the barren land,
7 Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya, ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.
He laughs at the multitude of a city, He does not hear the cries of an exactor.
8 Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya, ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.
The range of mountains [is] his pasture, And he seeks after every green thing.
9 “Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi? Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
Is a wild ox willing to serve you? Does he lodge by your crib?
10 Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị? Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?
Do you bind a wild ox in a furrow [with] his thick band? Does he harrow valleys after you?
11 Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?
Do you trust in him because his power [is] great? And do you leave your labor to him?
12 I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka site nʼebe ịzọcha ọka gị?
Do you trust in him That he brings back your seed, And gathers [it to] your threshing-floor?
13 “Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya, ma a pụghị iji nku ya tụnyere nku na abụba nke ụgbala.
[The] wing of the crying ostriches exults, but as a pinion and feather of a stork?
14 Ọ na-eyi akwa ya nʼala ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
For she leaves her eggs on the earth, And she warms them on the dust,
15 Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.
And she forgets that a foot may press it, And a beast of the field treads it down.
16 Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya, ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.
It has hardened her young ones without her, Her labor [is] in vain, without fear.
17 Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe maọbụ kenye ya oke na inwe uche.
For God has caused her to forget wisdom, And He has not given a portion To her in understanding;
18 Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ, ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.
At the time she lifts herself up on high, She laughs at the horse and his rider.
19 “Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya, ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?
Do you give might to the horse? Do you clothe his neck [with] a mane?
20 Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?
Do you cause him to rush as a locust? The splendor of his snorting [is] terrible.
21 Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya, ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
They dig in a valley, and he rejoices in power, He goes forth to meet the armor.
22 Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.
He laughs at fear, and is not frightened, And he does not turn back from the face of the sword.
23 Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
Quiver rattles against him, The flame of a spear, and a javelin.
24 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala. Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.
He swallows the ground with trembling and rage, And does not remain steadfast Because of the sound of a horn.
25 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’ Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
Among the horns he says, Aha, And from afar he smells battle, Roaring of princes and shouting.
26 “Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu, gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?
By your understanding does a hawk fly? Does he spread his wings to the south?
27 Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?
At your command does an eagle go up high? Or lift up his nest?
28 Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị; ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.
He inhabits a rock, Indeed, he lodges on the tooth of a rock, and fortress.
29 O bụ site nʼebe ahụ ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.
From there he has sought food, His eyes look attentively to a far-off place,
30 Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara, nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”
And his brood sucks up blood, And where the pierced [are]—there [is] he!”

< Job 39 >