< Job 38 >

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
Sa’an nan Ubangiji ya amsa wa Ayuba. Ya ce,
2 “Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè?
“Wane ne wannan da yake ɓata mini shawarata da surutan wofi?
3 Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.
Ka sha ɗamara kamar namiji; zan yi maka tambaya, za ka kuwa amsa mini.
4 “Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.
“Kana ina lokacin da na aza harsashen duniya? Gaya mini, in ka sani.
5 Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara, onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
Wane ne ya zāna girmanta? Ba shakka ka sani! Wane ne ya ja layin aunawa a kanta?
6 Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya, onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?
A kan me aka kafa tushenta, ko kuma wa ya sa dutsen kan kusurwarta,
7 Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ, ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?
yayinda taurarin safe suke waƙa tare dukan mala’iku kuma suka yi sowa don farin ciki.
8 “Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,
“Wane ne ya rufe teku a bayan ƙofofi, lokacin da ya burtsatso daga cikin ciki.
9 mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike,
Lokacin da na yi wa gizagizai riga na kuma naɗe su a cikin duhu sosai,
10 mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,
sa’ad da na yi masa iyaka na sa masa ƙofofi da wurin kullewa.
11 mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?
Sa’ad da na ce ga iyakar inda za ka kai, ga inda raƙuman ruwanka za su tsaya?
12 “O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya,
“Ko ka taɓa ba safiya umarni ko kuma ka sa asuba ta fito,
13 ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu?
don ta kama gefen duniya ta kakkaɓe mugaye daga cikinta?
14 Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe.
Ƙasa ta sāke siffa kamar laka da aka yi wa hatimi; ta fito a fili kamar riga.
15 A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri.
An hana mugaye haskensu, hannun da suka ɗaga an karya shi.
16 “I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri?
“Ko ka taɓa tafiya zuwa maɓulɓulan teku, ko kuma ka taɓa zuwa cikin zurfin lungun teku?
17 O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?
Ko an taɓa nuna maka ƙofar mutuwa? Ko ka taɓa ganin ƙofar inuwar duhun mutuwa?
18 Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile.
Ko ka gane fāɗin duniya? Gaya mini, in ka san wannan duka.
19 “Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi?
“Ina ne hanyar zuwa gidan haske? Kuma a ina duhu yake zama?
20 Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha?
Ko za ka iya kai su wurarensu? Ka san hanyar zuwa wurin da suke zama?
21 Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ.
Ba shakka ka sani, gama an riga an haife ka a lokacin! Ka yi shekaru da yawa kana rayuwa.
22 “Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
“Ka taɓa shiga rumbunan dusar ƙanƙara ko ka taɓa ganin rumbunan ƙanƙara
23 nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha?
waɗanda nake ajiya domin lokacin wahala, domin kwanakin yaƙi da faɗa?
24 Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe, ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?
Ina ne hanyar zuwa wurin da ake samun walƙiya, ko kuma inda daga nan ne ake watsa iskar gabas zuwa ko’ina cikin duniya?
25 Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo, onye kwa waara amụma na egbe eluigwe ụzọ?
Wane ne ya yanka hanyar wucewar ruwa, da kuma hanyar walƙiyar tsawa
26 Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị, ala ọzara ebe ọ dịghị onye nọ nʼime ya,
don ba da ruwa a ƙasar da ba kowa a wurin jeji inda ba mai zama ciki
27 ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiri iji mee ka ahịhịa pupụta nʼime ya.
don a ƙosar da wurin da ya bushe a sa ciyawa ta tsiro a can?
28 Mmiri ozuzo o nwere nna? Onye mụrụ igirigi?
Ruwan sama yana da mahaifi? Wa ya zama mahaifin raɓa?
29 Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta? Onye kwa bụ nne oke oyi nke eluigwe,
Daga cikin wane ne aka haifi ƙanƙara? Wane ne ya haifi jaura daga sammai
30 nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume, meekwa ka ihu ogbu mmiri kpụkọta?
lokacin da ruwa ya zama da ƙarfi kamar dutse, lokacin da saman ruwa ya daskare?
31 “Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades? Ị pụrụ ịtọpụ ihe nkechikọta Orion?
“Za ka iya daure kyakkyawar kaza da’ya’yanta? Ko za ka iya kunce igiyoyin mafarauci da kare da zomo?
32 Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha maọbụ dupụta anụ ndọgbu Bịa na ụmụ ya ndị ọzọ?
Za ka iya tattara taurari bisa ga lokacinsu ko kuma ka bi da beyar da’ya’yanta zuwa waje?
33 Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe? Ị pụrụ inye ha ike ịchị ụwa?
Ka san dokokin sammai? Ko za ka iya faɗar dangantakar Allah da duniya?
34 “Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojii si otu a mee ka idee mmiri kpuchie gị?
“Za ka iya tsawata wa gizagizai ka kuma rufe kanka da ambaliyar ruwa?
35 Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha? Ha na-asị gị, ‘Ebe a ka anyị nọ’?
Kai ne kake aika walƙiya da tsawa zuwa inda suke zuwa? Ko suna zuwa wurinka su ce, ‘Ga mu nan mun zo?’
36 Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ, maọbụ na-enye oke ọkpa nghọta?
Wane ne yake cika zuciya da hikima ko kuma yake ba zuciya ganewa?
37 Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ? Onye kwa pụrụ ịhulata karama mmiri niile nke eluigwe niile,
Wane ne yake da hikimar iya ƙirga gizagizai? Wane ne zai iya karkato bakunan tulunan sammai
38 mgbe aja dị nʼala siri ike, mgbe ọkpụrụkpụ aja dị nʼala na-akpụkọta nʼahụ ibe ha?
sa’ad da ƙura ta yi yawa ta daskare a wuri ɗaya?
39 “Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri, mee ka afọ ju ụmụ ọdụm
“Za ka iya farauto wa zakanya nama, ka kuma kawar wa zakoki yunwarsu.
40 mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha, maọbụ mgbe ha zoro onwe ha na-eche anụ nʼọhịa?
Lokacin da suka kwanta cikin kogunansu, ko kuma lokacin da suke a wurin ɓuyansu?
41 Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya, mgbe ụmụ ya na-etiku Chineke mkpu agụ, mgbe ha na-akpagharị na-achọ ihe oriri?
Wane ne yake ba hankaka abinci lokacin da’ya’yansa suke kuka ga Allah, kuma suna yawo don rashin abinci?

< Job 38 >