< Job 38 >

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
And Jehovah answereth Job out of the whirlwind, and saith: —
2 “Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè?
Who [is] this — darkening counsel, By words without knowledge?
3 Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.
Gird, I pray thee, as a man, thy loins, And I ask thee, and cause thou Me to know.
4 “Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.
Where wast thou when I founded earth? Declare, if thou hast known understanding.
5 Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara, onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
Who placed its measures — if thou knowest? Or who hath stretched out upon it a line?
6 Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya, onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?
On what have its sockets been sunk? Or who hath cast its corner-stone?
7 Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ, ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?
In the singing together of stars of morning, And all sons of God shout for joy,
8 “Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,
And He shutteth up with doors the sea, In its coming forth, from the womb it goeth out.
9 mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike,
In My making a cloud its clothing, And thick darkness its swaddling band,
10 mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,
And I measure over it My statute, And place bar and doors,
11 mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?
And say, 'Hitherto come thou, and add not, And a command is placed On the pride of thy billows.'
12 “O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya,
Hast thou commanded morning since thy days? Causest thou the dawn to know its place?
13 ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu?
To take hold on the skirts of the earth, And the wicked are shaken out of it,
14 Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe.
It turneth itself as clay of a seal And they station themselves as clothed.
15 A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri.
And withheld from the wicked is their light, And the arm lifted up is broken.
16 “I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri?
Hast thou come in to springs of the sea? And in searching the deep Hast thou walked up and down?
17 O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?
Revealed to thee were the gates of death? And the gates of death-shade dost thou see?
18 Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile.
Thou hast understanding, Even unto the broad places of earth! Declare — if thou hast known it all.
19 “Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi?
Where [is] this — the way light dwelleth? And darkness, where [is] this — its place?
20 Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha?
That thou dost take it unto its boundary, And that thou dost understand The paths of its house.
21 Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ.
Thou hast known — for then thou art born And the number of thy days [are] many!
22 “Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
Hast thou come in unto the treasure of snow? Yea, the treasures of hail dost thou see?
23 nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha?
That I have kept back for a time of distress, For a day of conflict and battle.
24 Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe, ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?
Where [is] this, the way light is apportioned? It scattereth an east wind over the earth.
25 Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo, onye kwa waara amụma na egbe eluigwe ụzọ?
Who hath divided for the flood a conduit? And a way for the lightning of the voices?
26 Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị, ala ọzara ebe ọ dịghị onye nọ nʼime ya,
To cause [it] to rain on a land — no man, A wilderness — no man in it.
27 ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiri iji mee ka ahịhịa pupụta nʼime ya.
To satisfy a desolate and waste place, And to cause to shoot up The produce of the tender grass?
28 Mmiri ozuzo o nwere nna? Onye mụrụ igirigi?
Hath the rain a father? Or who hath begotten the drops of dew?
29 Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta? Onye kwa bụ nne oke oyi nke eluigwe,
From whose belly came forth the ice? And the hoar-frost of the heavens, Who hath begotten it?
30 nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume, meekwa ka ihu ogbu mmiri kpụkọta?
As a stone waters are hidden, And the face of the deep is captured.
31 “Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades? Ị pụrụ ịtọpụ ihe nkechikọta Orion?
Dost thou bind sweet influences of Kimah? Or the attractions of Kesil dost thou open?
32 Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha maọbụ dupụta anụ ndọgbu Bịa na ụmụ ya ndị ọzọ?
Dost thou bring out Mazzaroth in its season? And Aysh for her sons dost thou comfort?
33 Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe? Ị pụrụ inye ha ike ịchị ụwa?
Hast thou known the statutes of heaven? Or dost thou appoint Its dominion in the earth?
34 “Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojii si otu a mee ka idee mmiri kpuchie gị?
Dost thou lift up to the cloud thy voice, And abundance of water doth cover thee?
35 Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha? Ha na-asị gị, ‘Ebe a ka anyị nọ’?
Dost thou send out lightnings, and they go And say unto thee, 'Behold us?'
36 Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ, maọbụ na-enye oke ọkpa nghọta?
Who hath put in the inward parts wisdom? Or who hath given To the covered part understanding?
37 Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ? Onye kwa pụrụ ịhulata karama mmiri niile nke eluigwe niile,
Who doth number the clouds by wisdom? And the bottles of the heavens, Who doth cause to lie down,
38 mgbe aja dị nʼala siri ike, mgbe ọkpụrụkpụ aja dị nʼala na-akpụkọta nʼahụ ibe ha?
In the hardening of dust into hardness, And clods cleave together?
39 “Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri, mee ka afọ ju ụmụ ọdụm
Dost thou hunt for a lion prey? And the desire of young lions fulfil?
40 mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha, maọbụ mgbe ha zoro onwe ha na-eche anụ nʼọhịa?
When they bow down in dens — Abide in a thicket for a covert?
41 Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya, mgbe ụmụ ya na-etiku Chineke mkpu agụ, mgbe ha na-akpagharị na-achọ ihe oriri?
Who doth prepare for a raven his provision, When his young ones cry unto God? They wander without food.

< Job 38 >