< Job 37 >

1 “Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji, na-amali elu site nʼọnọdụ ya.
因此我心战兢, 从原处移动。
2 Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya, na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.
听啊, 神轰轰的声音 是他口中所发的响声。
3 Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile, ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.
他发响声震遍天下, 发电光闪到地极。
4 Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya; ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe, mgbe olu ahụ dara dakwasị, ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.
随后人听见有雷声轰轰,大发威严, 雷电接连不断。
5 Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe; ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.
神发出奇妙的雷声; 他行大事,我们不能测透。
6 Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’ na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’
他对雪说:要降在地上; 对大雨和暴雨也是这样说。
7 Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya; ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.
他封住各人的手, 叫所造的万人都晓得他的作为。
8 Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe; ha na-anọgide nʼebe obibi ha.
百兽进入穴中, 卧在洞内。
9 Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa, oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.
暴风出于南宫; 寒冷出于北方。
10 Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri, ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.
神嘘气成冰; 宽阔之水也都凝结。
11 Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri; na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.
他使密云盛满水气, 布散电光之云;
12 Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee nʼelu ụwa niile.
这云是借他的指引游行旋转, 得以在全地面上行他一切所吩咐的,
13 Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ, na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.
或为责罚,或为润地, 或为施行慈爱。
14 “Job, gee ntị. Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.
约伯啊,你要留心听, 要站立思想 神奇妙的作为。
15 Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii na-eme ka amụma gbuo?
神如何吩咐这些, 如何使云中的电光照耀,你知道吗?
16 Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe, nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
云彩如何浮于空中, 那知识全备者奇妙的作为,你知道吗?
17 Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,
南风使地寂静, 你的衣服就如火热,你知道吗?
18 ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?
你岂能与 神同铺穹苍吗? 这穹苍坚硬,如同铸成的镜子。
19 “Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya; ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.
我们愚昧不能陈说; 请你指教我们该对他说什么话。
20 A ga-agwa ya na m nwere okwu? Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?
人岂可说:我愿与他说话? 岂有人自愿灭亡吗?
21 Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya ka ọ na-achake na mbara igwe, mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.
现在有云遮蔽,人不得见穹苍的光亮; 但风吹过,天又发晴。
22 Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta; Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.
金光出于北方, 在 神那里有可怕的威严。
23 Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu, nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.
论到全能者,我们不能测度; 他大有能力,有公平和大义, 必不苦待人。
24 Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya, ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”
所以,人敬畏他; 凡自以为心中有智慧的人,他都不顾念。

< Job 37 >