< Job 36 >
2 “Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.
“Ka ɗan ƙara haƙuri da ni kaɗan, zan kuma nuna maka cewa akwai sauran abubuwan da zan faɗa a madadin Allah.
3 Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume.
Daga nesa na sami sanina; zan nuna cewa Mahaliccina shi mai gaskiya ne.
4 Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.
Abin da zan gaya maka ba ƙarya ba ne; mai cikakken sani yana tare da kai.
5 “Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.
“Allah mai iko ne, amma ba ya rena mutane; shi mai girma ne cikin manufarsa.
6 Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ, kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.
Ba ya barin mugaye da rai sai dai yana ba waɗanda ake tsanantawa hakkinsu.
7 Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ, kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze, bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
Ba ya fasa duban masu adalci; yana sa su tare da sarakuna yana ɗaukaka su har abada.
8 Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe, jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,
Amma in mutane suna daure da sarƙoƙi, ƙunci kuma ya daure su,
9 ọ na-agwa ha ihe ha mere, na ha sitere na nganga ha mehie.
yana gaya musu abin da suka yi, cewa sun yi zunubi da girman kai.
10 Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.
Yana sa su saurari gyara yă kuma umarce su su tuba daga muguntarsu.
11 Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi, ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba, biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.
In sun yi biyayya suka bauta masa, za su yi rayuwa dukan kwanakinsu cikin wadata shekarunsu kuma cikin kwanciyar zuciya.
12 Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị, ha ga-ala nʼiyi site na mma agha, ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.
Amma in ba su saurara ba, za su hallaka da takobi kuma za su mutu ba ilimi.
13 “Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha. Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.
“Waɗanda ba su da Allah a zuciyarsu su ne suke riƙe fushi; ko sa’ad da ya ba su horo, ba su neman taimakonsa.
14 Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.
Suna mutuwa tun suna matasa, cikin ƙazamar rayuwar karuwanci.
15 Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha; na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.
Amma yana kuɓutar da masu wahala; yana magana da su cikin wahalarsu.
16 “Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.
“Yana so yă rinjaye ka daga haƙoran ƙunci, zuwa wuri mai sauƙi inda ba matsi zuwa teburinka cike da abincin da kake so.
17 Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị; ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.
Amma yanzu an cika ka da hukuncin da ya kamata a yi wa mugaye; shari’a da kuma gaskiya sun kama ka.
18 Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị; ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.
Ka yi hankali kada wani yă ruɗe ka da arziki; kada ka bar toshiya ta sa ka juya.
19 Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?
Dukiyarka ko dukan yawan ƙoƙarinka sun isa su riƙe ka su hana ka shan ƙunci?
20 Anọla na-echere ka abalị bịa, mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.
Kada ka yi marmari dare yă yi, don a fitar da mutane daga gidajensu.
21 Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe, bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.
Ka kula kada ka juya ga mugunta, abin da ka fi so fiye da wahala.
22 “E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya?
“An ɗaukaka Allah cikin ikonsa. Wane ne malami kamar sa?
23 Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso, maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?
Wane ne ya nuna masa hanyar da zai bi, ko kuma wane ne ya ce masa, ‘Ba ka yi daidai ba?’
24 Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu, bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.
Ka tuna ka ɗaukaka aikinsa, waɗanda mutane suka yaba a cikin waƙa.
25 Mmadụ niile ahụzuola ya; ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.
Dukan’yan adam sun gani; mutane sun hanga daga nesa.
26 Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị. Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.
Allah mai girma ne, ya wuce ganewarmu! Yawan shekarunsa ba su bincikuwa.
27 “Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha, nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.
“Yana sa ruwa yă zama tururi yă zubo daga sama.
28 Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.
Gizagizai suna zubo da raɓarsu kuma ruwan sama yana zubowa’yan adam a wadace.
29 Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii, ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?
Wane ne zai iya gane yadda ya shimfiɗa gizagizai yadda yake tsawa daga wurin zamansa?
30 Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
Dubi yadda ya baza walƙiyarsa kewaye da shi, tana haskaka zurfin teku.
31 Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ.
Haka yake mulkin al’ummai yana kuma tanada abinci a wadace.
32 O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya, ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.
Yana cika hannuwansa da walƙiya kuma yana ba ta umarni tă fāɗi a inda ya yi nufi.
33 Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri; ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.
Tsawarsa tana nuna cewa babbar iska da ruwa suna zuwa; ko shanu sun san da zuwansa.