< Job 36 >

1 Elihu gara nʼihu sị:
Elihu also continued, and said,
2 “Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.
"Bear with me a little, and I will show you; for I still have something to say on God's behalf.
3 Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume.
I will get my knowledge from afar, and will ascribe righteousness to my Maker.
4 Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.
For truly my words are not false. One who is perfect in knowledge is with you.
5 “Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.
"Look, God is mighty, and doesn't despise anyone. He is mighty in strength of understanding.
6 Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ, kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.
He doesn't preserve the life of the wicked, but gives to the afflicted their right.
7 Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ, kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze, bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
He doesn't withdraw his eyes from the righteous, but with kings on the throne, he sets them forever, and they are exalted.
8 Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe, jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,
If they are bound in fetters, and are taken in the cords of afflictions,
9 ọ na-agwa ha ihe ha mere, na ha sitere na nganga ha mehie.
then he shows them their work, and their transgressions, that they have behaved themselves proudly.
10 Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.
He also opens their ears to instruction, and commands that they return from iniquity.
11 Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi, ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba, biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.
If they listen and serve him, they shall spend their days in prosperity, and their years in pleasures.
12 Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị, ha ga-ala nʼiyi site na mma agha, ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.
But if they do not listen, they shall perish by the sword; they shall die without knowledge.
13 “Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha. Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.
"But those who are godless in heart lay up anger. They do not cry for help when he binds them.
14 Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.
They die in youth. Their life perishes among the unclean.
15 Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha; na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.
He delivers the afflicted by their affliction, and opens their ear in oppression.
16 “Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.
Yes, he would have allured you out of distress, into a broad place, where there is no restriction. That which is set on your table would be full of fatness.
17 Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị; ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.
"But you are full of the judgment of the wicked. Judgment and justice take hold of you.
18 Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị; ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.
Do not let riches entice you to wrath, neither let the great size of a bribe turn you aside.
19 Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?
Would your wealth sustain you in distress, or all the might of your strength?
20 Anọla na-echere ka abalị bịa, mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.
Do not desire the night, when people are cut off in their place.
21 Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe, bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.
Take heed, do not regard iniquity; for you have chosen this rather than affliction.
22 “E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya?
Look, God is exalted in his power. Who is a teacher like him?
23 Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso, maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?
Who has prescribed his way for him? Or who can say, 'You have committed unrighteousness?'
24 Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu, bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.
"Remember that you magnify his work, whereof men have sung.
25 Mmadụ niile ahụzuola ya; ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.
All men have looked thereon. Man sees it afar off.
26 Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị. Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.
Look, God is great, and we do not know him. The number of his years is unsearchable.
27 “Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha, nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.
For he draws up the drops of water, which distill in rain from his vapor,
28 Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.
Which the skies pour down and which drop on humankind abundantly.
29 Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii, ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?
Yes, can any understand the spreading of the clouds, and the thunderings of his pavilion?
30 Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
Look, he spreads his light around him. He covers the bottom of the sea.
31 Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ.
For by these he judges the people. He gives food in abundance.
32 O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya, ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.
He covers his hands with the lightning, and commands it to strike the mark.
33 Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri; ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.
Its noise tells about him, and the livestock also concerning the storm that comes up.

< Job 36 >