< Job 35 >
2 “Ị na-eche na nke a ziri ezi? Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’
“Je, unadhani hili ni haki? Wewe unasema, ‘Nina haki mbele za Mungu.’
3 Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m, gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’
Bado unamuuliza, ‘Ni faida gani nimepata, na imenifaidi nini kwa kutokutenda dhambi?’
4 “Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị, zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.
“Ningependa nikujibu wewe pamoja na marafiki zako walio pamoja nawe.
5 Lelie anya na eluigwe ma hụkwa. Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.
Tazama juu mbinguni ukaone; yaangalie mawingu yaliyo juu sana juu yako.
6 Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya? Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?
Je, ukitenda dhambi, inamdhuruje Mungu? Kama dhambi zako zikiwa nyingi, hilo linamfanyia nini Mungu?
7 Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya, maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?
Kama wewe ni mwadilifu, unampa nini, au yeye anapokea nini mkononi kwako?
8 Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị, ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.
Uovu wako unamdhuru tu mtu mwingine kama wewe, nayo haki yako inawafaa wanadamu tu.
9 “Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu, ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.
“Wanadamu hulia kwa kulemewa na mateso; huomba msaada kutoka mkono wenye nguvu.
10 Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ, onye na-enye abụ nʼime abalị,
Lakini hakuna asemaye, ‘Yuko wapi Mungu Muumba wangu, yeye anifanyaye niimbe usiku,
11 onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa, onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’
yeye atufundishaye sisi zaidi kuliko wanyama wa dunia, na kutufanya wenye hekima kuliko ndege wa angani?’
12 Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa, nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.
Yeye hajibu wakati watu waliapo kwa sababu ya kiburi cha watu waovu.
13 Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.
Naam, Mungu hasikilizi maombi yao ya ubatili; Mwenyezi hayazingatii.
14 Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya, na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya na ị ga-anọkwa na-eche ya!
Si zaidi sana kwamba hatakusikiliza wewe usemapo humwoni, tena ya kwamba shauri lako liko mbele zake na wewe lazima umngojee,
15 Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ, nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.
pia zaidi, kwamba hasira yake kamwe haiadhibu wala haangalii uovu hata kidogo?
16 Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe; ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”
Hivyo Ayubu hufumbua kinywa chake kwa maneno yasiyo na maana; anaongea maneno mengi bila maarifa.”