< Job 34 >

1 Mgbe ahụ Elihu sịrị:
Sa’an nan Elihu ya ce,
2 “Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe; gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta.
“Ku ji maganata, ku masu hikima; ku saurare ni, ku masu ilimi.
3 Ntị na-anwale okwu dịka ire si anụ ụtọ ihe oriri.
Gama kunne yana rarrabe magana kamar yadda harshe yake ɗanɗana abinci.
4 Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma.
Bari mu zaɓi abin da yake daidai, bari mu koyi abin da yake mai kyau tare.
5 “Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi.
“Ayuba ya ce, ‘Ba ni da laifi, amma Allah ya hana mini hakkina.
6 Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’
Ko da yake ina da gaskiya, an ɗauke ni maƙaryaci; ko da yake ba ni da laifi, kibiyoyinsa sun ji mini ciwo wanda ba ya warkewa.’
7 Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?
Wane mutum ne kamar Ayuba, wanda yake shan ba’a kamar ruwa?
8 Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.
Yana abokantaka da masu aikata mugunta; yana cuɗanya da mugaye.
9 Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’
Gama ya ce, ‘Ba ribar da mutum zai samu lokacin da yake ƙoƙari yă faranta wa Allah zuciya.’
10 “Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.
“Saboda haka ku saurare ni, ku masu ganewa. Ko kaɗan Allah ba ya mugunta, Maɗaukaki ba ya kuskure.
11 Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.
Yana biyan mutum bisa ga abin da ya yi; yana kawo masa abin da ayyukansa suka jawo.
12 Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi.
Ba zai yiwu Allah yă yi ba daidai ba, Maɗaukaki ba zai yi shari’a marar gaskiya ba.
13 Onye họpụtara ya ịchị ụwa? Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile?
Wane ne ya ba shi iko yă lura da duniya? Wane ne ya ba shi iko kan dukan duniya?
14 Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,
In nufinsa ne ya kuma janye ruhunsa da numfashinsa,
15 mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi, mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja.
’yan adam duka za su hallaka tare, mutum kuma zai koma ƙasa.
16 “Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼokwu m.
“In kana da ganewa sai ka saurari wannan; ka saurari abin da zan ce.
17 Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe?
Maƙiyin gaskiya zai iya yin mulki? Za ka iya ba mai gaskiya, Maɗaukaki laifi?
18 Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’
Ba shi ne ya ce wa sarakuna, ‘Ba ku da amfani ba,’ ya ce wa manya ‘Ku mugaye ne,’
19 Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.
wanda ba ya nuna sonkai ga’ya’yan sarki kuma ba ya goyon bayan masu arziki a kan matalauta, gama dukansu shi ya yi su da hannuwansa.
20 Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.
Suna mutuwa nan take, a cikin tsakiyar dare; an girgiza mutanen amma sun wuce; an taɓa manya amma ba da hannun mutum ba.
21 “Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ; ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile.
“Idanunsa suna kan al’amuran mutane; yana ganin tafiyarsu duka.
22 Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị, ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo.
Babu wuri mai duhu, babu inuwa mai duhu, inda masu aikata mugunta za su ɓoye.
23 Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ, nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe.
Allah ba ya bukata yă ci gaba da bincike mutane, har da za su zo gabansa don yă shari’anta su.
24 Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha.
Ba tare da tambaya ba yana ragargaza masu iko, yă kuma sa waɗansu a wurinsu.
25 Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.
Gama yana sane da abubuwan da suke yi, yana hamɓarar da su da dare a kuma ragargaza su.
26 Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,
Yana ba su horo, don muguntarsu, inda kowa zai gan su,
27 nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.
domin sun juya daga binsa, kuma ba su kula da hanyoyinsa ba.
28 Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị, nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa.
Sun sa kukan matalauta ya kai wurinsa yadda ya kai ga jin kukan masu bukata.
29 Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe? Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya? Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ,
Amma in ya yi shiru, wa zai ba shi laifi? In ya ɓoye fuskarsa, wa zai gan shi? Duk da haka shi yake da iko kan mutum da al’umma duka,
30 igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo, ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ.
yana hana wanda bai san Allah ba yă yi mulki, ya hana shi sa wa mutane tarko.
31 “Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke, ‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ.
“A ce mutum ya ce wa Allah, ‘Na yi laifi, amma ba zan sāke saɓa wa wani ba.
32 Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ; ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’
Ka koya mini abin da ba zan iya gani ba; in na yi ba daidai ba, ba zan sāke yi ba.’
33 Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gị mgbe ị jụrụ ichegharị? Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ; ya mere gwa m ihe ị mara.
Ya kamata Allah yă yi maka bisa ga abin da ka ce ne, sa’ad da ka ƙi ka tuba? Dole kai ka zaɓa, ba ni ba; yanzu ka gaya mini abin da ka sani.
34 “Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si, ndị amamihe nụrụ okwu m na-asị m,
“Mutane masu ganewa za su ce, masu hikima waɗanda suka ji ni za su ce mini,
35 ‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe; okwu ya dị ka nke onye na-enweghị uche.’
‘Ayuba ya yi magana cikin rashin sani; maganganunsa na marar hikima ne.’
36 Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụ maka ọsịsa ya dịka nke ajọ mmadụ!
Kash, da za a gwada Ayuba har ƙarshe, domin yana ba da amsa kamar mugun mutum.
37 Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya; na-akụ aka nʼetiti anyị nʼụzọ ịkwa emo, ma werekwa okwu nkwulu bara ụba megide Chineke.”
Ya ƙara tawaye a kan zunubansa; ya tafa hannuwansa na reni a cikinmu ya kuma ƙara yawan maganganunsa ga Allah.”

< Job 34 >