< Job 34 >

1 Mgbe ahụ Elihu sịrị:
And Elihu made answer and said,
2 “Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe; gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta.
Give ear, you wise, to my words; and you who have knowledge, give attention to me;
3 Ntị na-anwale okwu dịka ire si anụ ụtọ ihe oriri.
For words are tested by the ear, as food is tasted by the mouth.
4 Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma.
Let us make the decision for ourselves as to what is right; let us have the knowledge among ourselves of what is good.
5 “Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi.
For Job has said, I am upright, and it is God who has taken away my right;
6 Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’
Though I am right, still I am in pain; my wound may not be made well, though I have done no wrong.
7 Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?
What man is like Job, a man who freely makes sport of God,
8 Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.
And goes in the company of evil-doers, walking in the way of sinners?
9 Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’
For he has said, It is no profit to a man to take delight in God.
10 “Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.
Now then, you wise, take note; you men of knowledge, give ear to me. Let it be far from God to do evil, and from the Ruler of all to do wrong.
11 Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.
For he gives to every man the reward of his work, and sees that he gets the fruit of his ways.
12 Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi.
Truly, God does not do evil, and the Ruler of all is not a false judge.
13 Onye họpụtara ya ịchị ụwa? Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile?
Who put the earth into his care, or made him responsible for the world?
14 Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,
If he made his spirit come back to him, taking his breath into himself again,
15 mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi, mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja.
All flesh would come to an end together, and man would go back to the dust.
16 “Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼokwu m.
If you are wise, take note of this; give ear to the voice of my words.
17 Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe?
How may a hater of right be a ruler? and will you say that the upright Ruler of all is evil?
18 Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’
He who says to a king, You are an evil-doer; and to rulers, You are sinners;
19 Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.
Who has no respect for rulers, and who gives no more attention to those who have wealth than to the poor, for they are all the work of his hands.
20 Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.
Suddenly they come to an end, even in the middle of the night: the blow comes on the men of wealth, and they are gone, and the strong are taken away without the hand of man.
21 “Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ; ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile.
For his eyes are on the ways of a man, and he sees all his steps.
22 Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị, ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo.
There is no dark place, and no thick cloud, in which the workers of evil may take cover.
23 Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ, nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe.
For he does not give man a fixed time to come before him to be judged.
24 Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha.
He sends the strong to destruction without searching out their cause, and puts others in their place.
25 Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.
For he has knowledge of their works, overturning them in the night, so that they are crushed.
26 Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,
The evil-doers are broken by his wrath, he puts his hand on them with force before the eyes of all onlookers.
27 nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.
Because they did not go after him, and took no note of his ways,
28 Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị, nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa.
So that the cry of the poor might come up to him, and the prayer of those in need come to his ears.
29 Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe? Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya? Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ,
30 igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo, ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ.
31 “Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke, ‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ.
32 Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ; ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’
33 Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gị mgbe ị jụrụ ichegharị? Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ; ya mere gwa m ihe ị mara.
34 “Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si, ndị amamihe nụrụ okwu m na-asị m,
Men of knowledge, and all wise men, hearing me, will say,
35 ‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe; okwu ya dị ka nke onye na-enweghị uche.’
Job's words do not come from knowledge; they are not the fruit of wisdom.
36 Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụ maka ọsịsa ya dịka nke ajọ mmadụ!
May Job be tested to the end, because his answers have been like those of evil men.
37 Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya; na-akụ aka nʼetiti anyị nʼụzọ ịkwa emo, ma werekwa okwu nkwulu bara ụba megide Chineke.”
For in addition to his sin, he is uncontrolled in heart; before our eyes he makes sport of God, increasing his words against him.

< Job 34 >