< Job 33 >
1 “Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m; ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.
“Lakini Ayubu, sasa, sikiliza maneno yangu; zingatia kila kitu nitakachosema.
2 Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu; okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.
Karibu nitafungua kinywa changu; maneno yangu yapo katika ncha ya ulimi wangu.
3 Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m; egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.
Maneno yangu yanatoka katika moyo mnyofu; midomo yangu hunena kwa uaminifu yale niyajuayo.
4 Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.
Roho wa Mungu ameniumba; pumzi ya Mwenyezi hunipa uhai.
5 Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike; jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.
Unijibu basi, kama unaweza; jiandae kunikabili mimi.
6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke; mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.
Mimi ni kama wewe mbele za Mungu; mimi pia nimetolewa kwenye udongo.
7 Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ, ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.
Huna sababu ya kuniogopa, wala mkono wangu haupaswi kukulemea.
8 “Ma ị kwuola ya na ntị m, anụrụ m okwu ndị ahụ niile,
“Lakini umesema nikiwa ninakusikia, nami nilisikia maneno yenyewe:
9 ‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere; adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.
‘Mimi ni safi na sina dhambi; mimi ni safi na sina hatia.
10 Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ; ọ na-ahụta m dịka onye iro ya.
Lakini bado Mungu amepata dosari kwangu, naye ananiona kama adui yake.
11 Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ; ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’
Ananifunga miguu kwa pingu, tena anaziangalia njia zangu zote kwa karibu.’
12 “Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma, nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.
“Lakini mimi ninakuambia, katika jambo hili wewe una makosa, kwa maana Mungu ni mkuu kuliko mwanadamu.
13 Gịnị mere i ji na-ekpesara ya na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?
Kwa nini unamlalamikia kwamba yeye hamjibu mwanadamu?
14 Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.
Kwa kuwa Mungu husema, wakati huu kwa njia moja, au wakati mwingine kwa njia nyingine, ingawa mwanadamu anaweza asielewe.
15 Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị, mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra, mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.
Mungu husema na mwanadamu katika ndoto, katika maono ya usiku, wakati usingizi mzito uwaangukiapo wanadamu wasinziapo vitandani mwao,
16 O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;
anaweza akasemea masikioni mwao, na kuwatia hofu kwa maonyo,
17 ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,
ili kumgeuza mtu kutoka kwenye kutenda mabaya na kumwepusha na kiburi,
18 ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu, chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.
kuiokoa nafsi yake na shimo, uhai wake usiangamizwe kwa upanga.
19 “Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina, ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.
Mtu anaweza kutiwa adabu kwa maumivu kitandani mwake, kwa dhiki za mfululizo katika mifupa yake,
20 Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi, ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.
kiasi kwamba maisha yake yenyewe yanakataa chakula nayo nafsi yake ikakichukia kabisa hata chakula kizuri.
21 Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi, ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.
Nyama ya mwili wake huisha kwa kukonda, nayo mifupa yake ambayo mwanzoni ilikuwa imefichika, sasa inatokeza nje.
22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.
Nafsi yake inakaribia kaburi, nao uhai wake karibu na wajumbe wa kifo.
23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,
“Kama bado kuna malaika upande wake kama mtetezi, mmoja miongoni mwa elfu, wa kumwambia mwanadamu lililo jema kwake,
24 ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke, ‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili; achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.
kumwonea huruma na kusema, ‘Mwokoe asije akatumbukia shimoni; nimepata ukombozi kwa ajili yake’:
25 Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị, ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’
ndipo nyama ya mwili wake hufanywa mpya kama ya mtoto; hurudishwa upya kama siku za ujana wake.
26 Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya, ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ, ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.
Humwomba Mungu, akapata kibali kwake, huuona uso wa Mungu na kushangilia kwa furaha; Mungu humrudisha katika hali yake ya uadilifu.
27 Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha: ‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume, ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;
Ndipo huja mbele za watu na kusema, ‘Nilitenda dhambi na kupotosha kilichokuwa haki, lakini sikuadhibiwa kama nilivyostahili.
28 ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili, ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’
Alinikomboa nafsi yangu nisitumbukie shimoni, nami nitaishi ili kuufurahia mwanga.’
29 “Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.
“Mungu hufanya haya yote kwa mwanadamu; mara mbili hata mara tatu,
30 Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili, ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.
ili aigeuze nafsi yake toka shimoni, ili nuru ya uzima imwangazie.
31 “Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m; dere jii ka m kwuo okwu.
“Ayubu, zingatia, nisikilize mimi; nyamaza, nami nitanena.
32 Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m; kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.
Kama unalo lolote la kusema, unijibu; sema, kwa maana ninataka uonekane huna hatia.
33 Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị; dere jii, ka m zi gị amamihe.”
Lakini kama huna la kusema, basi nisikilize mimi; nyamaza, nami nitakufundisha hekima.”