< Job 33 >
1 “Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m; ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.
Now listen to me, Job. Pay attention to everything I have to say.
2 Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu; okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.
Look, I'm about to speak; my mouth is ready to talk.
3 Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m; egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.
My words come from my upright heart; my lips speak sincerely of what I know.
4 Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.
The spirit of God made me, and the breath of the Almighty gives me life.
5 Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike; jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.
Answer me, if you can. Stand in front of me and prepare to defend yourself.
6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke; mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.
Look, before God we are both the same. I was also made from a piece of clay.
7 Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ, ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.
See here, you don't need to be frightened of me. I won't be too hard on you.
8 “Ma ị kwuola ya na ntị m, anụrụ m okwu ndị ahụ niile,
You spoke in my hearing and I have listened to everything you had to say.
9 ‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere; adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.
You say, ‘I'm clean, I've done nothing wrong; I'm pure, I have not sinned.
10 Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ; ọ na-ahụta m dịka onye iro ya.
See how God finds fault with me and treats me as his enemy.
11 Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ; ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’
He puts my feet in the stocks and watches everything I do.’
12 “Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma, nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.
But look, you are wrong—let me explain. God is greater than any human being.
13 Gịnị mere i ji na-ekpesara ya na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?
Why are you fighting against him, complaining that God isn't answering your questions?
14 Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.
God speaks over and over again, but people don't notice.
15 Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị, mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra, mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.
Through dreams and visions in the night, when people fall into deep sleep, resting on their beds,
16 O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;
God speaks to them with solemn warnings
17 ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,
to turn them away from doing wrong and to stop them from becoming proud.
18 ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu, chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.
He saves them from the grave and spares them from violent death.
19 “Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina, ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.
People are also disciplined on a bed of pain with constant aching in their bones.
20 Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi, ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.
They have no desire to eat; they do not even want their favorite dishes.
21 Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi, ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.
Their flesh wastes away to nothing; all that's left is skin and bones.
22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.
They are close to death; their lives approaching the executioner.
23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,
But if an angel appears, a mediator, one of God's thousands of angels, to tell someone the right way for them,
24 ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke, ‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili; achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.
he will be gracious to them. He will say, ‘Save them from going down into the grave, for I have found a way to free them.’
25 Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị, ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’
Then their bodies will be renewed as if they were young again; they will be as strong as when they were in their prime.
26 Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya, ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ, ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.
They will pray to God, and he will accept them; they come into God's presence with joy, and he will set things right for them.
27 Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha: ‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume, ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;
They sing, and tell others, ‘I sinned, I distorted what is right, but it did not do me any good.
28 ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili, ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’
He saved me from going down into the grave and I will live in the light.’
29 “Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.
Look, God does this time and again for people;
30 Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili, ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.
he saves them from the grave so they might see the light of life.
31 “Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m; dere jii ka m kwuo okwu.
Pay attention Job, and listen to me! Be quiet—let me speak!
32 Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m; kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.
But if you have anything to say, then speak up.
33 Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị; dere jii, ka m zi gị amamihe.”
If not, listen to me. Keep quiet and I will teach you wisdom.”