< Job 30 >

1 “Ma ugbu a, ha na-akwa m emo bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ, bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta.
A NO hoi, ua henehene mai ia'u ka poe opiopio ia'u, Ka poe nona na makuakane a'u i hoowahawaha ai, Aole e hoonoho pu me na ilio o ka'u poe hipi.
2 Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m, ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike?
Oia hoi, o ka ikaika o ko lakou lima heaha ia ia'u, Ka mea i pau ka ikaika?
3 Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ, ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.
No ka ilihune a no ka pololi ua wiwi lakou; Holo lakou i ka waonahele, I ka po he mehameha a neoneo.
4 Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu, mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.
Uhuki lakou i ka maluha ma ka nahelehele, A me ke aa o ka laau iunipera i ai na lakou.
5 A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha, a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.
Maiwaena mai o kanaka ua hookukeia'ku lakou; Kahea nui aku mahope o lakou e like me lakou i ka aihue;
6 A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị. Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.
Maloko o na awawa weliweli e noho ai lakou, Maloko o na lua o ka honua a me na pohaku.
7 Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ, na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.
Mawaena o ka nahelehele, me he hoki la lakou i uwe ai, Malalo o ka laau kuku lakou i hoakoakoa ai.
8 Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha, e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.
He poe keiki a kanaka lapuwale, He poe keiki a kanaka inoa ole; Ua hookukeia lakou mai ka aina aku.
9 “Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo; abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị.
Ano hoi, ua lilo au i mea e mele ai lakou; A ua lilo hoi au no lakou i mea e olelo nane ai.
10 Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso; ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu.
Ua hoopailua lakou ia'u, a holo mamao lakou mai o'u aku la, Aole lakou i uumi i ke kuha mai i kuu maka.
11 Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m, o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m.
No ka mea, ua kuu aku ia i kona kaulawaha, a ua hookaumaha mai ia'u; Ua kuu aku hoi lakou i ke kaulawaha imua o'u.
12 Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha. Ha na-esiri ụkwụ m ọnya, ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.
Ma ka akau ku mai ka poe opio, a hoonee aku i kuu wawae, Hoouka ae lakou i na alanui no kuu make.
13 Ha na-etiwasị ụzọ m, ha kwadoro mmekpa ahụ m. ‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.
Ua hana ino lakou i kuu ala, Ua kokua lakou i kuu hina ana; Aohe o lakou kokua.
14 Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi; nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.
Hele mai lakou me he poha nui mai la: Ma kahi nahae, hookaa mai la lakou maluna o'u.
15 Oke egwu abịakwasịla m; ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru, nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.
Ua hiki mai na mea hooweliweli maluna o'u: Hoomaau lakou i kuu lokomaikai e like me ka makani; A me he ao la, ke hele aku nei kuu pomaikai.
16 “Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga; ụbọchị ahụhụ ejidela m.
Ano hoi ua nininiia kuu uhane iloko o'u, Ua lalau mai na la kaumaha ia'u.
17 Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m, ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.
I ka po ua oia kuu mau iwi iloko o'u; Aole i maha kuu mau eha aai.
18 Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe; ọ na-ekechi m dịka olu uwe m.
No ka ikaika loa o kuu mai, ua ano e kuu aahu; Ua puliki mai ia'u e like me ka a-i o kuu kapakomo.
19 Ọ na-atụba m nʼime apịtị, mee ka m ghọọ ntụ na aja.
Ua hoolei mai oia ia'u iloko o ka nenelu, A ua like au me ka lepo a me ka lehu.
20 “Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m; anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m.
Ua uwe aku au ia oe, aole oe i hoolohe mai ia'u; A ku au iluna, aole oe i manao mai ia'u.
21 Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere; i ji aka gị dị ike megide m.
Ua lilo oe i enemi no'u, Me ka ikaika o kou lima i hahai mai oe ia'u.
22 Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe, ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri.
Ua kaikai oe ia'u, A hooholo no oe ia'u maluna o ka makani; Ua hooheehee mai hoi ia'u a hoomakau mai.
23 Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ; ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.
No ka mea, ua ike no au e hoihoi aku oe ia'u i ka make, A i ka hale e akoakoa ai ka poe a pau e ola ana.
24 “Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala; mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.
Aka, he mea ole ka pule, ke kikoo mai ia i kona lima, Ina e uwe lakou iloko o kona luku ana.
25 Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu; ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?
Aole anei au i uwe i kona la pilikia? Aole anei i kaumaha ko'u naau no ka poe ilihune?
26 Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara; mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.
I ka wa i kakali ai au i ka maikai, alaila hiki mai ka hewa; A ukali au i ka malamalama, alaila hiki mai ka pouli.
27 Obi m anaghị ezu ike nʼime m; ụbọchị ahụhụ na-ezute m.
Ua kupikio kuu opu, aohe malie iho; Ua hiki e mai ia'u na la popilikia.
28 Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ. Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka.
Ke hele eleele nei au, aole nae i ka la: Ku no au iluna maloko o ka ahakanaka, a uwe aku au.
29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa; onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.
Ua lilo au i hoahanau no na iliohae, A i hoalauna no na iana.
30 Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere; anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ.
Ua eleele kuu ili maluna o'u, A ua hoaia kuu mau iwi i ka wela.
31 Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ; ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.
A ua lilo kuu lira no ke kanikau, A o kuu mea hookiokio no ka leo o ka poe e uwe ana.

< Job 30 >